2016
Olile-anya nke Ihụnanya Ezi-na-ụlọ Ebighi-ebi
Ọgọọst 2016


Ozi nke Otu Ndị-Isi Nduzi Mbụ, Ọnwa Asatọ 2016

Olile-anya nke Ihụnanya Ezi-na-ụlọ Ebighi-ebi

Na onyinye niile nke Nna anyị nke Elu-igwe hụrụ anyị na anya nyere ụmụ Ya, nke kachasi na ime ha bụ ndụ ebighi-ebi (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 14:7). Onyinye nke ahụ bụ ịbị na ihụ nke Chineke Nna na Ọkpara Ya Ọ hụrụ na anya ebigh-ebi na ezi-na-ụlọ niile. Nani na alaeze nke Chineke nke kachasi, selestial, ka njikọta na ihụnanya nke ndụ ezi-na-ụlọ na aga n’ihụ.

Anyị niile na atụ-anya ọńụ nke ịbị ndụ ihụnanya ezi-na-ụlọ. Abia na ụfọdụ n’ime anyị, ọ bụ ahụmihe nke anyị na enwebeghi nmetụta ya—nmetụta nke anyị maara na okwere omume kama enwetebeghi ya. Anyị nwere ike anyị ahụtala ya na ndụ ndị ọzọ niile. Mana ụfọdụ n’ime anyị, ihụnanya nke ezi-na-ụlọ bụ ihe doro-anya ma dị-mkpa mgbe ọnwụ wezugara anyị site ebe nwa, nne, nna, nwanne-nwoke, nwanne-nwanyị ma ọbụ ezigbo ndị nnanna anyị hụrụ anyị na anya.

Anyị niile na atụ-anya na otu ụbọchị anyị ga enwe nmetụta nke ihụnanya dika onye otu ezi-na-ụlọ ahụ nke na amasi anyị nke ukwuu, ma chọkwa ugbu-a ibị na ya ọzọ.

Nna anyị nke Elu-igwe maara obi anyị niile. Ebum n’obi Ya bụ inye anyị ọńụ (lee 2 Nifaị 2:25). Ya mere Ọ nyere anyị onyinye nke Nwa Ya Nwoke iji mee ka ańụrị njikọrịta nke ezi-na-ụlọ na adị ebighi-ebi. Maka na Onye nzọpụta merịrị ike nke ọnwụ, anyị niile ga ebilite na ọnwụ. Maka Ọ chụrụ-aja maka mmehie anyị, anyị nwere ike, site na okwukwe na nchegharị anyị, tozuo-oke nke alaeze selestial, ebe ana ejikọ ezi-na-ụlọ na ihụnanya ebighi-ebi.

Onye nzọpụta zigara Onye-amụma Elaịja ka ọ ga wehachi ikike nke ọkwa-nchụ-aja nye Josef Smit (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 110). Site na ikike nke-a ka ike nke nrachị, nke na enye ụmụ Chineke onyinye kachasi—ndụ ebighi-ebi n’ime ezi-na-ụlọ ejikọtara ọnụ.

Ọ bụ ihe nrite nke nwa Chineke ọbụla biara na ụwa nwere ike inweta. Otu ụzọ na ụzọ-atọ ndị ụmụ ya jụrụ onyinye Ya na ala-mụọ. Site na enweghi okwukwe zuru-oke na inupụ-isi, ha họọrọ, na ha agaghi ama gbasara ańụrị dị na onyinye nke ezi-na-ụlọ ebighi-ebi nke Nna nke Elu-igwe.

Maka ndị ahụ nke meriri ihe ule nke dị-mkpa mgbe anyị nọ na ụwa mụọ, ma tozuo-oke inweta onyinye nke anụ-ahụ, oke ihe nhọrọ nke ndụ ebighi-ebi ka bụkwa nke anyị ime. Ọ bụrụ na agozie anyị nke na anyị ga achọta ozi-ọma nke-a ewehachitere, anyị nwere ike ịhọrọ ime ma rube-isi na ọgbụgba-ndụ nke anyị na Chineke nke ga eme kaanyị tozuo-oke ndụ-ebighi-ebi. Dika anyị na anagide na okwukwe nke-a, Mụọ-nsọ ahụ ga akwado olile-anya na ntụkwasi-obi anyị nke na anyị nọ n’ụzọ nke ndụ ebighi-ebi, ịbị dika ezi-na-ụlọ na ala-eze selestial.

Maka ụfọdụ, ańụrị ebighi-ebi nwere ike ịbụ ihe efu ma ọbụ ihe olile-anya na efe-efe. Ndị nne na nna, ụmụ nne ndị nwoke, na ndị nwanyị, nwere ike ha emeela nhọrọ dika ọ ga eme ka ha ghara oke ndụ-ebighi-ebi. Inwere ike chee na onwe gị ma itozuo-la oke site na Aja-mgbahara Mmehie nke Jịsọs Kraịst.

Onye amụma nke Chineke na mbụ enyeworii mụ ndụmọdụ nke nyere m udo. Enwere m nsogbu na nhọrọ ndị ọzọ, nwere ike ime ka ezi-na-ụlọ anyị hara ịbịkọta ọnụ ebighi-ebi. Ọ sị, Ị na esogbu onwe gị maka ihe na abụghị nsogbu. Nani ihe ị ga eme bụ itozu-oke maka alaeze selestial, ma ọnọdụ ezi-na-ụlọ ga abụ ihe oke ebube karia ka ichere.

Maka ndị niile ahụmihe ha ma-ọbụ alum dị na nwanyị na ụmụntakịrị—ma-ọbụ enweghi nke ọbụla—ga eme ka olile-anya daa mba, A nam agbara unu ama-m: Nna nke Elu-igwe maara ma hụkwa gị na anya dika nwa Ya. Mgbe anyị na Ya na Nwa Ya nwoke Ọ hụrụ na anya nọọrọ na ụwa mbụ, Ha tinyere na obi gị olile-anya nke ndụ ebighi-ebi. Site na ike Aja-mgbaghara mmehie nke Jịsọs Kraịst na arụ-ọrụ, na Mụọ-nsọ na edu, Ị nwere ike nweta mmetụta ugbua ma na ụwa na abia-abia, ihụnaya nke ezi-na-ụlọ nke Nna gị na Ezigbo nwa Ya Ọ hụrụ na anya chọsịrị ike ka ịnata.

A nam agba ama na dika ị na ebi ndụ itozu-oke maka alaeze selestial, nkwa ahụ amara na amụma na “ezi-na-ụlọ ga abụ ihe oke ebube karia ka ichere” ga abụ nke gị.

Nkuzi si na ozi a.

Tulee imalite site na ịkọrọ ndị ị na akuziri oge mgbe inwere afọ-ojuju maka olile-anya nke ezi-na-ụlọ ebighi-ebi. Kpọọ ha ka ha chee maka oge mgbe ha nwere afọ-ojujuj maka ezi-na-ụlọ ebighi-ebi. Jụọ ha ma ha nwere mmasi ikọsa nke-a. Mgbe ahụ inwere ike, ịkpọ ha ka ha chee ụzọ ndị enwere ike iji wulite ma bie ndụ itozu-oke maka alaeze selestial, ka nkwa ahụ amara na amụma na ”ezi-na-ụlọ ga abụ ihe oke ebube karia ka ichere” ga abụ nke ha.

Bipụta