2016
Ịzulite Ezi-na-ụlọ Otu-ebe
Ọgọọst 2016


Ozi nke Nkuzi ndị nleta ụmụnwanyị, Ọnwa Asatọ 2016

Ịzulite Ezi-na-ụlọ Otu-ebe

Mụọ akwụkwọ ọzizi-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi. Kedụ otu ịghọta “Ezi-na-ụlọ: Ọkwa-amara nye Ụwa niile” ga-esi amụba okwukwe gị n’ime Chineke ma gọzie ndị ahụ ị na-elekọta site na nkuzi nleta? Maka imata ihe ndị ọzọ, ga na reliefsociiety.lds.org.

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

Ndị “dị na nwunye nwere oke na ọrụ ihụrịta na lekọta onwe ha na ụmụ ha na anya “Ụlọ-ebe-obibi bụ ụlọ-nyocha nke ihụnanya na ije-ozi,” ka Onye isi nduzi Russell M. Nelson kwuru,Onye Isi nduzi nke Ndị Ozi Iri na abụọ.

“Nna anyị nke Elu-igwe chọrọ ka ndị di na nwunye nwe okwukwe ebe ha nọ na hụtakwa ma meso ụmụ ha dika ndị sitere na Onye-nwe anyị.”2

Na Akwụkwọ nke Mọmọn, Jecọb kwuru na ihụnanya ndị di nwere ebe ndị nwunye ha, ma ihụnanya ndị nwunye nwere ebe ndị di ha, ma ihụnanya ndị dị ha na ndị nwunye ha nwere ebe ụmụ ha bụ otuu n’ime ihe mkpatara ndị Lamanite na otuu mgbe bụụrụ ndị ezi-omume karia ndị Ndị nifaịtị (lee Jecọb 3:7).

Otu n’ime ụzọ kachasi nma iji webata ihụnanya na ịdịnotu na ebe-obibi anyị bụ site na iji obi umeala kwuoro ndị otu ezi-na-ụlọ anyị okwu Iji obi umeala kwuo okwu na eweta Mụọ-nsọ Nwanne nwanyị Linda K. Burton, onye Isi nduzi zuru-ọha nke ndị Otu Enye-m aka rịọrọ ka anyị tulee: Úgboro ole ka anyị na anọkata jiri obi-umeala kwukọrịta okwu?”3

Akwụkwọ-nsọ niile Agbakwunyere

Ndị Rom 12:10; Mosaia 4:15; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:5

Akụkọ niile mere-eme

Okenye D. Todd Christofferson nke onye otu Ndị Ozi Iri na abụọ kọrọ akụkọ maka ahụmihe onwere mgbe ọdị ntakiri jiri bụrụ ihe na echetara ya mkpa ezi-na-ụlọ hụrụ onwe ha na anya dị. Mgbe ya na nwanne ya, ka bụ ụmụ ntakiri-nwoke, nne ha nwere. ihe ọwụwa kansa mere na ụfụ ya mere ojighi aka nri ya eme ihe ọbụla. Dika ezi-na-ụlọ nwere ọtụtụ ndị nwoke, enwere ọtụtụ ide-akwa, mana dika nne ha na ede, ọ na akwusi ugboro-ugboro baa n’ime ụlọ ibe-akwa ruo mgbe ụfụ ya ga ebelata.

Mgbe nna Okenye Christofferson chọpụtara ihe na eme, oji nzuzo kwusi iri nri ehihe ọtụtụ-oge iji chekwaa ego ga ezu iji zuta igwe nke na eme ka ide-akwa dịrị mfe. Site na ihụnanya ọ nwere ebe nwunye ya nọ, ọ gosiri ihe imatụ nke izulite n’ime ezi-na-ụlọ nye ndị ụmụ ya nwoke. Site na obere ihe omume-a,Okenye Christofferson siri, “Ahụtaghim ihe niile nna m na agabi-ga na ihụnanya nke o nwere ebe nne m nọ, na oge ahụ,mana ugbua nmatara nke-a, a sim onwe m, Enwere otu nwoke.’”4

Huba-ama

  1. “Ezi-na-ụlọ ahụ: Ọkwa-amara nye ndị Ụwa niile,” Liahona, Ọnwa Iri na otu. 2010, 129.

  2. Russell M. Nelson, , “Nzọpụta na Ndụ ebighi-ebi na elu-igwe,” Liahona, Ọnwa Ise 2008, 8

  3. Linda K. Burton, “Ike, Ọńụ, na Ịhụn’anya nke idobe ọgbụgba-ndụ,” Liahona, Ọnwa iri na otu 2015, 31 .

  4. D. Todd Christofferson, “Ka Anyị bụrụ Ndị Nwoke,” Liahona, Ọnwa Iri na out. 2006, 46.

Tulee uche na Nkea

Kedu otu ihụnanya na nlekọta onwe anyị na esi eweta Mụọ n’ime ebe obibi anyị?

Bipụta