2017
Mgbe Enyi Mụ Nwụrụ
July 2017


Ntorobia

Mgbe Enyi Mụ Nwụrụ

Onye odee ya bi na Utah, USA.

Mgbe mụ na aga sekọndịrị nke nta, enyim nwere ọrịa nke ụbụrụ-isi ma nwụọ n’ụbọchị echi ya. N’agbanyeghi na abụ m onye òtù Nzukọ nke-a, ọ nyere mụ nsogbu. Ka mgbe mụ dị na nwata, a na akụzịrị mụ na mụ nwere ike i chighari n’ebe Nna Bi N’igwe na Onye Nzọpụta nọ maka ịhe ọbụla, mana ịhe dị otu-a emebeghi na ndụ mụ mbụ.

Ebere mụ akwa ọtụtụ awa, nagbalịsi-ike ị chọta ịhe—ịhe ọbụla—g’enye mụ udo. Na abalị abụọ ka ọ nwụrụ, eweere mụ akwụkwọ-abụ. Mgbe mụ na asagharị ịme ya, anya mụ adasa na “Nọnyere Mụ; Uhuruchi Eruwo” (Abụ, no. 165). Ama-okwu nke Atọ metụrụm n’obi:

Nọnyere M; Rụọ Uhuruchi

Abalị nke-a g’abụ nke nanị mụ

M’ọbụrụ na mụ na gị ekwukọrịtaghị,

M’ọbụ weta n’aka gị ìhè nkem.

Egwu n’atụ mụ n’ọchịchịrị nke ụwa nke-a,

Ga-abịakwute mụ n’ụlọ mụ.

O Onye Nzọpụta, nọnyere mụ na abalị nke-a;

Lee, uhuruchi eruwo.

Ama-okwu nke-a mere ka udo juputa m nime. A mataram mgbe ahụ n’ọ bụghị nanị na Onye Nzọpụta ga-anọnyerem na abalị ahụ, ma na Ọ makwara otu ọ dị mụ n’obi. A mara m na ịhụnanya nke mụ nwetere site na abụ ahụ nyere mụ aka ọ bụghị nanị n’abalị ahụ ma ọ nyerem aka n’ịhe mnwale ndị ọzọ nke mụ nagidere.

Bipụta