2017
Na Ha Ga Abụ Otu
July 2017


Ozi nke Nkụzi ndị Nleta Ụmụ-nwanyị Ọnwa Asaa 2017

Na Ha Ga Abụ Otu

Mụọ akwụkwọ ọziza nke-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi Kedụ otu ịghọta nzube nke Otu enyem-aka ga-esi akwado ụmụ ndi nwanyị nke Chineke maka ngọzi nke ndụ ebigh-ebi?

Foto, oyiyi
Relief Society seal

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

“Jisọs nwetere ezigbo ịdị n’otu ya na Nna ya site n’ịnyefechasị onwe Ya ka uche Nna mee ma na anụ- arụ ma na mụọ,” nke-a bụ ịhe Okenye D. Todd Christofferson onye Kworum Ndị Ozi Iri na Abụọ kuziri.

“… N’ezie anyị na Chineke na Kraịst agaghị abụ otu m’ọbụrụ na anyị emeghị ka uche Ha bụrụ ọchịchọ anyị nke kachasị. Anaghị enwete ụdị nyefechasị nke-a n’otu ụbọchị, mana site na Mụọ Nsọ, Onye Nwe ga-akụziri anyị m’ọbụrụ n’anyị ga-achọ, ruo, mgbe oge na-aga, a ga-ekwu n’olu eziokwu na Ọ nọ anyị nime otu Nna siri nọrọ Ya nime.”1

Linda K. Burton Onye isi Nduzi Zuru ọha nke Òtù Enyem-aka, kuziri otu esi arụ ọrụ ịnwete ịdị n’otu nke-a: “Ị mee ma ịdobe ọgbụgba-ndụ anyị nile bụ ịhe ngosipụta mkpebi obi anyị n’anyị chọrọ ịdịka Onye Nzọpụta. Ịhe achọrọ bụ k’anyị gba mbọ ịnweta agwa nke ahụ ekwupụtara ọfụma nime ntakịrị ahịrị okwu dị nime abụ nke-a n’amasịm: ‘A gam eje ebe chọrọ ka m jee. … A gam ekwu ịhe chọrọ ka mụ kwuo. … A gam abụ ịhe chọrọ kakam bụrụ.’”2

“Dika anyị na agba mbọ ụbọchịkwa ụbọchị na ịzu kwa ịzu na iso ụzọ nke Kraịst, mụọ anyị na ewere ọnọdụ, agha ahụ na achị n’ime anyị ga agbada, ihe ọnwunwa niile ahụ ga akwusi inye anyị nsogbu.”3

Neill F. Marriott,Onye Ndụmọdụ nke Abụọ nime òtù Ndị Isi Nduzi nke Ụmụ-agbọghọ, gbara-ama maka ngọzị nile nke n’abịa site n’ịmee ka uche anyị hazie dịka nke Chineke sịrị dị: “A gbawo mụ mbọ ị chụpụ site n’obi mụ ọchịchọ nke anụ-arụ nke n’achọ ị mee ịhe n’ụzọ mụ, emesịa mụ amata na ụzọ nkem ezughi-ezu, o rijughị afọ ma ọ bụ nke dịkasị ala ma-ejiri ya na ụzọ nke Jisọs Kraịst ma atụ. ‘Ụzọ nke [Nna anyị Bi N’igwe] bụ ụzọ nke n’eduba nime ańụrị na ndụ nke-a na ndụ ebighi-ebi n’ụwa nke n’abịa-abịa.’”4 Ọ g’adị nma m’anyị gba mbọ ịnwe obi-umeala ị mee k’anyị na Nna Bi N’igwe na Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst bụrụ otu.

Akwụkwọ nsọ niile na Ozi agbakwunyere

Jọn 17:20–21; Ephesians 4:13; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 38:27; reliefsociety.lds.org

Huba ama

  1. D. Todd Christofferson, “Na Ka Ha Dịrị Na Out na Anyị,” Liahona, Ọnwa iri na otu. 2002, 71.

  2. Linda K. Burton, “Ike, Ọńụ, na Ịhụn’anya nke idobe ọgbụgba-ndụ,” Liahona, Ọnwa iri na otu 2013, 111 .

  3. D. Todd Christofferson, “Na Ka Ha Dịrị Na Out na Anyị,” Liahona,Ọnwa iri na otu. 2002, 71.

  4. Neill F. Marriott, “Yielding Our Hearts to God,” Liahona, Nov. 2015, 32.

Bipụta