2017
Ngọzi nke Ịnwe Ezi Nnagide
July 2017


Ozi nke Otu Ndị-Ịsi Ndụzi Mbụ, onwa asaa 2017

Ngọzi nke Ịnwe Ezi Nnagide

Mgbem bụ okorobịa, ejerem ozi na Nzukọ nke-a dịka onye ndụmọdụ nye otu onye isi ngalaba distirit nwere amamịhe. Mgbe nile k’ọna agba mbọ ị kuziri mụ ịhe. Echetaram otu ndụmọdụ ọ nyerem: “Mgbe ọbụla gị na mmadụ zukọtara, kpasị ha agwa dịka ha nọ nime nnukwu nsogbu, ma ị g’ahụ na iziri-ezi ọtụtụ mgbe” Nime obi mụ mgbe ahụ, eweere mụ ya dịka ọnye n’ebu ịhe ọjọọ n’obi oge nile. Ugbua, ịhe karịrị afọ 50 gara-aga, A nam ahụ na ọ ghọtara ndụ a na ụwa nke—a ọfụma.

Anyị nile n’otu n’otu nwere ịhe mnwale chere anyị n’ihu—mgbe ụfọdụ, ndị nke siri ezigbo ike. Anyị mara na Onye Nwe na-ahapụ k’anyị nwete mnwale ndịa n’ihi ka e kwochapụ anyị ịdị-ọcha ma mee k’anyị zuo oke, k’anyị nwe ike ị nọnyere Ya ruo ebighi-ebi.

Onye Nwe kuziri Onye-amụma Josef Smit nime ụlọ-mkpọrọ Liberty, na ngọzị maka ịnagide mnwalee ya nile nke ọma g’eme ya ka ọ tozuo ịnwete ndụ ebighi-ebi:

“Nwa m udo dịrị mkpụrụ obi gị, ihe isi-ike gị na nsogbu nile gị ga-abụ maka nwa oge nta.

“Ma mgbe ahụ, ọ bụrụ na ị nagide ya nke ọma, Chineke ga-ebuli gị n’elu, i ga-emeri ndị iro gị nile” (O&O 121:7–8).

Ọtụtụ ịhe n’emegide anyị na ndụ nke-a, nke nwere ike ịmee dịka ọ na-araa anyị ahụ ịnagide ọfụma. Nke-a nwere ike ị dị otua nye ezi n’ụlọ ọbụla n’eche ka ịhe akọrọ n’ubi mịa mkpụrụ mgbe mmiri n’ezobeghi. Ha nwere ike ị n’eche, “Ruo mgbe ole k’anyị g’echegide?” Nke-a nwere ike ị dị otua nye nwa ntorobịa onye ọnwụnwa soro-oyi n’echere aka mgba. Nke-a nwere ike ị dị otua nye okorobịa na gba mbọ ịgụta akwụkwọ m’ọbụ nwete aka-ọrụ nke g’enyere ya aka iji kwado nwunye ya na ezin’ụlọ ya. Nke-a nwere ike ị dị otua nye onye n’enweghi ike ịchọta ọrụ m’ọbụ onye ọrụ ya funagharịrị ya mgbe ndị ụlọ-ọrụ kwachiri ngwo-ngwo ha. Nke-a nwere ike ị dị otua nye ndị ahụ ahụ-isi ike na ume n’apụ na ahụ, nke-a nwere ike ịbịakwute ha ọsịsọ na ndụ m’ọbụ n’afọ-nka ha , m’ọbụ bịakwute ndị ha hụrụ n’anya.

Mana Chineke Onye dị ịhunanya adobeghi mnwale ndịa n’ihu anyị n’ihi n’ọchọrọ ị hụ m’anyị ọ ga anagidewu mkpagbu, kama ọ bụ ka ọ hụ m’anyị ọ ga-anagidewu ha ọfụma ma bụrụ ndị ekwochapụrụ ịdị-ọcha.

Ndị Isi Nduzi nke Mbụ kuziri Okenye Parley P. Pratt (1807–57)mgbe akpọrọ ya ọhụụ dịka onye òtù Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ: “Ị batawo n’ọrụ ahụ nke n’achọ obi gi nile; … bụrụ ịhe ekwochapụrụ k’ọdịrị ọcha. … Ị ga-anagide ọtụtụ mgbalị, ọtụtụ ọrụ, ma ọtụtụ ahụhụ iji bụrụ ịhe ekwochapụrụ zuru-oke. … Nna gị Bi N’igwe chọrọ ya; mbara-ụwa ahụ nile bụ nke Ya; ọrụ nke-a bụ nke Ya; ma Ọ ga … enye gị ọńụ ma gba gị ume.”1

Nime akwụkwọ ndị Hiburu, Pọl kwuru maka mkpụrụ nile nke ịnagide ọfụma: “Ugbua enweghị mkpagbu ọbụla nke ugbua n’enye ọńụ, mana ha dị mnwute: n’agbanyeghị emesịa ha ga amị mkpụrụ udo nke eziomume nye ndị ahụ gbasiri-ike site na nke-a” (Ndị Hiburu 12:11)

Ọ bụrụ n’anyị chigharịa n’ebe Onye Nzọpụta nọ, a ga ekwochapụ mkpụrụ-obi anyị k’ọdị ọcha mgbe anyị na anagide. Ọ bụrụ n’anyị chigharịa n’ebe Onye Nzọpụta nọ, a ga ekwochapụ mkpụrụ-obi anyị k’ọdị ọcha mgbe anyị na anagide.

Ya mere, ịhe mbụ a g’echeta bụ ị cheta ị kpe ekpere oge nile (lee O&O 10:5; Alma 34:19–29).

Nke abụọ ịgbalịsi ike idobe iwu nile mgbe nile—n’agbanyeghi mbuso agha ọbụla, ọnwụnwa ọbụla, m’ọbụ nsogbu ọbụla gbara anyị gburu-gbburu (lee Mosiah 4:30).

Ịhe nke atọ dị oke mkpa ị mee bụ ịjere Onye -nwe ozi (lee D&C 4:2; 20:31).

Ọ bụ mgbe anyị n’ejere Nna-anyị-ukwu ozi, k’anyị g’abịa mata Ya, ma hụ Ya n’anya. Anyị ga, m’ọbụrụ n’anyị nọsike n’ekpere ma n’ịje ozi, g’abịa mata aka nke Onye Nzọpụta na mmetụta nke Mụọ Nsọ nime ndu anyị. Ọtụtụ nime anyị enwewo oge anyị jere ụdị ozi-a ma nwete mmetụta nke nnọnye nke-a. Ọ bụrụ na unu chelaa azụ no oge ahụ, unu g’echeta na enwere ọtụtụ mgbanwe nime unu. Ọnwụnwa maka ị mee ịhe ọjọọ belatara. Ọchịchọ ị mee ịhe ọma bawanyere. Enwere ike ndị ahụ mara gị ọfụma ma hụ gị n’anya kwuru: “Ị nwewo-kwa obi ebere karịa ma nwe-kwa ndidi karịa. I dizighi-kwa ka otu ị dị na mbụ.”

N’ezie ị bụghị-kwanu otu onye ahụ. Agbanworo gị site na Aja Mmehie nke Jisọs Kraịst n’ihi na ị dabere n’elu Ya n’oge mnwale gị.

A nam ekwe gị nkwa na Onye Nwe g’abịa nyere gị aka nime mnwale gị nile m’ọbụrụ n’ịchọ ya ma jere Ya ozi, ma mkpụrụ-obi gị g’enweta nkwochapụ ịdị-ọcha mgbe nke-a n’eme. A nam ama gị aka’ ka ịtụkwasị obi n’ebe Ọ nọ mgbe ị n’enwe mkpagbu gị nile.

A mara m na Chineke Nna dị ndụ, ma Ọ na anụ ma n’aza-kwa ekpere anyị nile. A maram na Ọkpara Ya Jisọs Kraịst, akwụwo ụgwọ maka njọọ anyị nile ma Ọ chọrọ k’anyị bịakwute Ya. A mara m na Nna na Ọkpara n’elekwasị anyị anya ma ha akwadoworo anyị ụzọ maka ị nagide ọfụma ma ị laghachi ụlọ ọzọ.

Lee anya

  1. Akụkọ-mmadụ-ji-aka-ya dee nke Parley P. Prat, ed. Parley P. Pratt Jr. (1979), 120.

Bipụta