Ozi nke Nkụzi ndị nleta umụnwanyị Ọnwa Itolu 2017
Nke Otu Obi
Mụọ akwụkwọ ọziza nke-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi Kedụ otu ịghọta nzube nke Otu enyem-aka ga-esi akwado ụmụ ndi nwanyị nke Chineke maka ngọzi nke ndụ ebigh-ebi?
Na Onye-nwe wee kpọọ ndị ya Zaịọn, n’ihi na ha nwere otu obị na otu uche, ma biri n’ime ezi-omume; na enweghị ogbenye n’etiti ha.” (Moses 7:18). Kedụ otu anyị ga-esi bụrụ otu?
Okenye M. Russell Ballard nke Kworum nke Ndị-ozi Iri-na-abụọ kwuru: “N’ime obi nke okwu Bekee aja-mgbaghara-mmehie bụ mkpụrụ okwu nke ịbụ otu. Ọbụrụ na ụmụ-mmadụ ghọta nkea, agaghị enwe onye ọbụla nke anyị na-aghaghị inwe mmasi n’ime ya, n’agbanyeghị afọ ole ọ gbara, abụrụ, oke ma ọ bụ nne, okpukperechi, ma ọ bụ na mmekọrịta mmadụ na-ibe ya ma ọ bụ ọnọdụ gbasara ịkpata ego. Anyị ga-agbali I soro nzọm ụkwụ Onye-nzọpụta mee ka o si eme ma n’enweghị ike ime ihe n’adịghị mma, n’adighị iche, enweghị nsọpụrụ, ma ọ bụ achọghị ịma aka ndị ọzọ.”1
Onye-isi-nduzi Henry B. Eyring, Onye ndụmọdụ Mbụ n’ime Ndị-isi-nduzi Mbụ, kuziri: “Mgbe ndị mmadụ nwere Mmụọ ahụ n’ime ha, ha nwere ike ịtụanya nnọkọrịta. … Mmụọ nke Chineke anaghị ma ọlị ebute ọgba-aghara (lee 3 Nifaị 11:29). …Ọ na-edubanye ruo udo nke onwe na mmetụta nke idi-otu anyị na ndị ọzọ.”2
N’ikwu banyere ihe aka mgba niile nke ezi-na-ụlọ, Carole M. Stephens, onye jere ozi dịka Onye ndụmọdụ Mbụ n’ime Ndị-isi-nduzi ozuru-ọha nke Otu Enyem-aka, kwuru: “Enwebeghị mgbe m biri ndụ site na igba alụkwaghịm, mgbu na enweghị nchekwa nke na-abịa site nghapụ, ma ọ bụ oke na ọrụ so ị bụ nne nanị ya na azụ ụmụ. Enwetebeghịm nhụmiihe nke ọnwụ nwa, amụlighi nwa, ma ọ bụ mmasị nke nwoke na nwoke ibe ya. Enwebeghị mgbe m nogidere na mmekpa-ahụ, oke nrịa nrịa ọjọọ, ma ọ bụ agwa ọjọọ. Ndịa abụrụbeghị oghere-ọma nke na-adọtị m.
“… Ma site na mnwale niile na ọnwụnwa niile nke onwe m …abịala m matazie Otu onye nke na aghọta. …Ma na mgbakwunye, enwetewom uche nke onwe m nke mnwale niile nke anụ ahụ nke m kwupụtaworo ugbua site na anya nke nwa nwanyị, onye nne, nne nne, nwanne nwanyị, nwanne nna nke nwanyị, na enyi.
“Oghere-ọma anyị dịka ụmụ ndị nwanyị nke Chineke n’edewe ọgbụgba-ama ha abụghị nanị imụta site na ihe ndị chere anyị aka mgba; ọ bụ inwekọrịtara otu ụdịrị mmetụta na omiko mgbe anyị na akwado ndị otu ezi-na-ụlọ nke Chineke site n’ime ndọli niile ha.”3
Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere na Ozi
Jọn 17:20-23; Ndị Efesus 4:15; Mosiah 18:21-22; 4 Nifaị 1:15
© 2017 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike Mbipụta nile ka e dokwara Ebipụtara na USA. Asụsụ Bekee akwadoro: 6/17 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/17 Ntụgharị-asụsụ nke Visiting Teaching Message, September 2017. Igbo 97929 593