2017
Ndị Amụma ga Edu Anyị
September 2017


Ozi nke ndị Isi Nduzi Mbụ, Ọnwa itolu 2017

Ndị Amụma ga Edu Anyị

Afọ ole na ole gara aga, a nọduru m ọdụ n’ime ọnụ-ụlọ nke Temple Salt Lake ebe Ndị-isi-nduzi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri-na-abụọ na-ezute otu ugboro n’ime izu-ụka ọbụla. Eleliri m anya elu na-ahụ ụlọ nke chewere ihu ebe Ndị-isi-nduzi Mbụ na anọ, ma n’ebe ahụ ahụtara m foto eserese nke Ndi-isi-nduzi nke Nzukọ-nsọ a n’otu n’otu.

Ka m lekwasiri ha anya, ndị butere m ụzọ—site na Onye-amụma Joseph Smith (1805–44) ruo Onye-isi-nduzi Gordon B. Hinckley (1910–2008)—echere m echiche, “Ụdị obi-ekele m nwere maka odudu onye ọbụla n’ime ha n’otu n’otu.”

Ndị a bụ ndị oke nwoke ndị na-adịghị efegharị, ndị na-adaghị mba, ma adaghị ada. Ndịa bụ mmadụ nke Chineke. Ka m n’eche maka ndị-amụma oge nke ugbua abịawo m mata ma nwee ịhụnaanya, a na echete ndụ ha, ejiri mara ha, na nkuzi niile ha nke na akwalite mụọ.

Onye-isi-nduzi Herber J. Grant (1856–1945) bụ Onye-isi-nduzi nke Nzukọ-nsọ a mgbe amụrụ m. Ka m na-atụgharị uche maka ndụ ya na nkuzi niile, ekwenyere m otu oburupụta ụwa Onye-isi-nduzi Grant n’egosi mgbe niile bụụrụ nnagide—nnagide n’ime ihe niile ndị ahụ nke dị mma ma maa mma.

Onye-isi-nduzi George Albert Smith (1870–1951) bụụrụ Onye-isi-nduzi Nzukọ-nsọ oge mgbe mụ rụrụ ọrụ dịka ụkọchukwu nke ngalaba-ukwu m dị n’ime Obodo Salt Lake. Ọ hụtara na enwere oke ịlụ-ọgụ na-aga n’etiti Onye-nwe-anyị na onye-iro ahụ. “Ọ bụrụ na I ga-anọrọ n’ụzọ nke Onye-nwe-anyị,” ọ kuziri, “ị ga-anọrọ n’okpuru ike n’arụ ọrụ dị n’ime ya na enweghị mmasị ọbụla ime ihe na-adịghị mma.”1

Akpọrọ m oku ije-ozi dịka onye otu nke Kworum Ndị Iri na Abụọ n’ime afọ 1963 site n’aka Onye-isi-nduzi David O. Mckay (1873–1970) Ọ kuziri iburu ndị ọzọ n’obi site n’ụzọ o si bie ndụ ya. “Ezi Kristain,” o kwuru, “bụ ịhụnanya etinyere n’ọrụ.”2

Onye-isi-nduzi Joseph Fielding Smith (1876–1972), otu n’ime ndị na-ede ọtụtụ akwụkwọ nke Nzukọ-nsọ karịa, enwere dịka ukpuru n’edu edu n’ime ndụ oke mmụta ya nke ozi-ọma. Ọ gụrụ akwụkwọ nsọ na-adaghị mba ma ọ maara nkuzi niile na ozizi niile I ga-ahụta n’ime ihu-akwụkwọ niile dịka onye ọbụla m hụtaworo.

Onye-isi-nduzi Harold B. Lee (1899–1973) rụrụ ọrụ dịka onye-isi-nduzi stake m mgbe mụ bụụrụ nwantakịrị nwoke. Otu ederede masịrị ya bụụrụ “Guzoro nu n’ime ebe niile dị nsọ, ma adapụkwala.”3 Ọ gbara ndị nsọ ume inọrọ n’otu ụda, ma na-anabata, ntaka-ụka niile nke Mụọ Nsọ.

Ekwenyerem n’otu ukpuru dị n’ime ndụ nke Onye-isi-nduzi Spencer w. Kimball (1895–1985) ga-abụ nyefecha. O nyefechara onwe ya kpam kpam n’aka Onye-nwe-anyị n’enweghị mgbagwoju anya ọbụla. O nyere ihe niile kpam kpam iji bie ndụ nke ozi-ọma.

Mgbe Onye-isi-nduzi Ezra Taft Benson (1899–1994) bụziri Onye-isi-nduzi nke nzukọ-nsọ, ọ kpọrọ m ka m ruo orụ dịka Onye ndumọdụ nke Abụọ n’ime Otu Ndị-Isi Mbụ. Ịhụnaanya bụụrụ ukpuru nke n’edu ya, nke edenyere n’ime nkwupụta masịrị ya karịa, nke Onye-nzọpụta kwupụtara: “Olee ụdị mmadụ unu kwesịrị ibụ? N’ezie asị m unu, ọbụna dịka m dị.”4

Onye-isi-nduzi Howard W. Hunter (1907–95) bụụrụ onye nke na-achọta ima-mma karịchara n’ime ndị ọzọ oge ọbụla. Oge ọbụla ka o nwere agwa ọma; oge ọbụla ka ọ dịịrị ume-ala. Ọ bụụrụ oghere ọma m ije ozi dịka Onye-ndụmọdụ ya nke Abụọ.

Onye-isi-nduzi Gordon B. Hinckley kuziri ka anyị na-eme ike anyị karịa. Ọ gbara ama dị ike nke ukwuu nke Onye-nzọpụta na mgbasa-ozi Ya. Ọ jiri ịhụnanya kwuziere anyị ihe. Ije ozi dịka Onye-ndụmọdụ Mbụ ya bụụrụ nnukwu ugwu na ngọzi nye m.

Onye-nzọpụta n’ezite ndị amụma n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya. Mgbe a ga-eme ọgbakọ ozuru-ọha n’ọnwa Iri nke a, Ndị Ji Ikikere nke Nzukọ-nsọ ga-enwete ọghere ọzọ ikesa okwu Ya. Anyị na-eji oke idi nsọ na umeala emezu oke na ọrụ nkea.

Ụdị ngọzi anyị nwetere na Nzukọ-nsọ ahụ nke Jisọs Kraịst eweghachitere nọ n’elu ụwa na kwa na Nzukọ nsọ ahụ ka achọpụtara site n’elu nkume nke mkpughe. Mkpughe na-aga n’ihụ bụ ihe ụtọ dị n’ime ozi-ọma nke Jisọs Kraịst.

Ka anyị dị na njikere inata mkpughe nke onwe nke na-abịa n’ụjụ n’oge ọgbakọ ozuru-ọha. Ka obi anyị jupụta n’oke mkpebi dịka anyị n’eweli aka anyị elu ikwado ndị amụma dị ndụ na ndị ozi. Ka anyị nwete ọgbụgba ama, mbuli-lu, nkasi-obi, na agbam-ume mgbe anyị n’ege nti n’ozi ha niile. Ma ka anyị dịrị na njikere iranyeghari onwe anyị nye Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst—ozi-ọma Ya na ọrụ Ya—na ibi ndụ mkpebi emegharịrị ọhụrụ n’ime idebe iwu-nsọ Ya niile ma na-eme uche Ya.

Bipụta