Ozi nke Nkuzi ndi nleta ndinyom, Onwa Mbụ 2018
Mara otu Nwanne-Nwanyị ahụ dị Oge ọbụla, Ebe ọbụla, Ụzọ ọbụla
Nkuzi ndị nleta ụmụnwanyị bụ maka nlekota. Jisọs n’elekọta oge ọbụla ma ebe ọbụla. Anyị nwere ike ị mee kwa otu a.
Ịhe “nlekọta” pụtara bụ ije ozi, ịhụ-n’anya, m’ọbụ ị nye aka nke n’ebutere onye ọzọ nkasị-obi na añụrị. Nkuzi ndị nleta ụmụnwanyị bụ maka ị chọpụta ụzọ nile enwere ike iji lekọta ndị ahụ anyị n’eleta. Jisọs Kraịst lekọtara mmadụ nile—oge ọbụla ma ebe ọbụla. Ọ zụrụ 5,000 ahụ, kasịe Mary na Martha obi n’oge ahụ nwanne nwoke ha nwụrụ, ma kuziere nwanyị ahu nọ n’akụkụ olulu-mmiri oziọma Ya. Ọ mere nke-a n’ihi ezigbo ịhụnanya nke Ya.
N’isoro ọmụmatụ Ya, dịka ndị nkuzi nleta ụmụnwanyị, anyị nwere ike ị bịa mata ma hụ ndị nwanne-nwanyị ọbụla anyị n’eleta n’anya, ma n’echeta kwa na ịhụnanya bụ isi-nkume ịhe nile anyị n’eme. Mgbe anyị n’ekpe ekpere ka egosi anyị otu anyị sị amata ụzọ esi ejere otu nwanne-nwanyị ozi ma nyere ya aka ị gbaa okwukwe ya ume, “enweghi ịhe ga-egbochi ndị mụọ-ozi ka ha ghara ị bụ ndị òtù [anyị].”1
Bido mgbe ahaziri òtù Enyem Aka n’afọ 1842 ruo taa, nlekọta nke ụmụnwanyị agọziwo ọtụtụ ndụ. N’ọmụmatụ, Joan Johnson, otu nwanyị isi-mkpe gbara afọ 82 na onye ya na ya n’eso eme nkuzi nleta ụmụnwanyị ha, jere kuziere onye agbata-obi ha dị afọ 89 n’arịa ọrịa nimonịa. Ha bịara chọpụta na onye agbata-obi ha nke-a, abụghị onye a ga n’eleta otu ugboro n’ọnwa, n’ihi nke-a, ha bidoro letawa ya izu-ụka nile m’ọbụ kpọwa ya n’ekwe ntị.
Maka ndị nkuzi nleta ụmụnwanyị ndị ọzọ, iziga ozi ekwenti m’ọbụ email nke g’agba ume nwere ike ị bụ ịhe kachasị nma ị ịmeere otu nwanne-nwanyị n’ọnwa ahụ. Ị mee onye anyị n’eleta k’ọbụrụ enyi anyị, ma jiri ịhụnanya geere ya ntị bụ ịhe nkuzi nleta ụmụnwanyị pụtara. Nka-n’ụzụ nke agba-ọhụrụ ugbua, ma nleta ihu n’ihu, n’enyere anyị aka ị mee nke a oge ọbụla, ebe ọbụla na n’ọtụtụ ụzọ dị iche-iche.2 Nke a bụ nlekọta dịka otu Jisọs sị mee.
© 2018 site n’aka Intellectual Reserve, Inc Ikike Mbipụta nile ka e dokwara Ebipụtara na USA. Asụsụ Bekee akwadoro: 6/17 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/17 Ntụgharị-asụsụ nke Visiting Teaching Principles, January 2018. Igbo 15045 593