Ozi nke Otu Ndi-Ịsi Nduzi Mbụ, nke Ọnwa Jenụarị 2018
Onyinye nke Amara ahụ
“Òkè n’ọrụ anyị bụ i site n’amaghị otu e si eme ịhe bilie ma marazie otu e si emee ịhe, i site na ọdịda ma ruo na mmeri,” nke-a bụ ịhe Onye Isi Thomas S. Monson kuziri. “Ọrụ dịịrị anyị bụ ị nwe agwa nke kacha-nma. Otu n’ime onyinye Chineke kacha ibe ya nke e nyere anyị bụ oñụ nke ị gba mbọ ọzọ, n’ihi enweghi ọdịda nke kwesịrị ị bụ nke ikpe-azụ.”1
Mgbe ụfọdụ anyị n’ewere mbido afọ ọhụrụ dịka mgbe a n’eme mkpebi-obi na ebum-n’uche ọhụrụ. Anyị n’ekpebi ịmezi ndụ, ị nwe mgbanwo, ị gba mbọ ọzọ. E nwere ike, ụzọ kacha mkpa anyị g’esi agba mbọ ọzọ ga-abụ ị nabata ịhe Onye Isi Monson kpọrọ “onyinye nke nchegharị.”2
N’ime ịhe ndepụta ndịa si nime nkuzi ya ka mgbe ọ bụụrụ Onye Isi Nduzi Ụlọ-ụka nke-a, Onye Isi Nduzi Monson nyere anyị ndụmọdụ k’anyị “nabata ọbara ịtu-aja nke Kraịst, nke g’eme k’anyị weta mgbaghara mmehie anyị nile, ma ka eme ka obi anyị nile dị ọcha.”3
Ọrụ-ebube nke Mgbaghara
“Anyị nile ahọrọwo ajọọ nhọrọ. Ọ bụrụ n’anyị emezibeghi nhọrọ nile dị otua, A nam agwa gi eziokwu na e nwere ụzọ esi eme nke a. A na akpọ ụzọ ahụ nchegharị. A na m arịọ unu arịrọ ka unu mezie njehie nile unu. Ọnye Nwe nwụrụ ka a rọpụtara mụ na unu onyinye ahụ dị ngọzị. N’agbanyeghi na ụzọ ahụ adịghị mfe, nkwa ya dị ire: Ọ bụrụgodị na mmehie gị na-acha uhe-uhe, ha ga-adị ụcha ka snow [Asaiaa 1:18]. ‘Ma Mụ, Onye-nwe agaghị echetakwa ha ọzọ’ [D&C 58:42]. Ejikwala ndụ ebighi ebi gị akpọ ịhe efu. Ọ bụrụ na ịmmehiewo, otu mgbe ahụ ị bidoro chọwa ụzọ nlaghachi gị, otu mgbe ahụ ka ị ga-ahụkwa udo na ọñụ nke na-atọ ụtọ, nke n’abịa site na ọrụ-ebube nke mgbaghara.”4
Laghachi azụ n’Ụzọ ahụ
“Nagbanyeghi na ọ bụ ịhe dị oke-mkpa na anyị ga ahọrọ nke ọma, ma a n’enwe mgbe anyị na ahọrọ ịhe ọjọọ. Onyinye nke nchegharị, nke Onye-nzọpụta wetara anyị, na enyere anyị aka imezi ụzọ anyị, ka anyị wee nwe ike ịlaghachi na ụzọ ahụ ga eduga anyị n’ime otịto nke selestial anyị na achọ.”5
Ụzọ Nlaghachi-azụ
“Ọ bụrụ n’enwere onye nime unu dara-ada n’ụzọ nke ya, A na m agwa gị eziokwu n’enwere ụzọ nlaghachi azụ. A na akpọ ụzọ ahụ nchegharị. N’agbanyeghi na ụzọ ahụ rara-ahụ, nzọpụta nke ebighi-ebi gị dabere n’elu ya. Kedụ ịhe ka dị mkpa karịa ịgba mbọ maka nke a? A na m arịọ gị arịrọ ka ikpebie ebe a ugbua ma n’oge nke a, na ị ga ebido gawa ụzọ ahụ dị mkpa maka nchegharị n’ịhe nile. Otu mgbe ahụ ị mere nke a, otu mgbe ahụ ka ị g’enwe ike nwete udo na ịda-jụụ na nkasị-obi nke Asaiaa kwuru okwu ya [lee Asaịa 1:18].”6
Ndị Mmadụ Nwere-ike Ịgbanwe
Anyị kwesịrị ibu- na obi na mmadu nwere-ike ịgbanwe. Ha nwere-ike hapụ agwa ọjọọ ha nile. Ha nwere ike chegharịa na njehie ha nile. Ha nwere ike tozuo-oke na ijigide ọkwa-nchụ-aja. Ha nwere ike were obiha nile jere Onye-nwe ozi.”7
Dịịrị Ụcha Ọzọ
“Ọ bụrụ n’enwere ịhe n’adịghị mma na ndụ gị, enwere ụzọ emeghere maka mpụta gị. Kwụsị ajọọ omume ọbụla. Kwusara ụkọ-chukwu gị okwu. E nwere ike imezi ịhe ọbụla bụ nsogbu gị site na ezi nchegharị. Ị nwere ike ị dị ụcha ọzọ.”8
Ọrụ dị Oke Mkpa nke Onye-Nzọpụta
“ Onye dị oke mkpa nime atụmatụ [nke nzọpụta]ahụ bụ Onye-nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst. Ewezuga nchụ-aja nzọpụta nke Ya, ịhe niile gaara-efu. O zughi ezu, otu o sila dị, nanị ịkwenye nime Ya na ozi Ya. Anyị kwesịrị ịrụ-ọrụ ma mụọ ịhe, chọọ ma kpee ekpere, chegharịa ma tolite. Anyị kwesịrị imata iwu niile Chineke ma bie ha na ndụ anyị. Anyị ịmata ịnata emume nsọ niile Ya nke na-azọpụta. Nanị site na ime nkea ka anyị ga-enwete ezigbo, ańụrị dị ebigh-ebi.”9
© 2018 site n’aka Intellectual Reserve, Inc Ikike Mbipụta nile ka e dokwara Ebipụtara na USA. Asụsụ Bekee akwadoro: 6/17 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/17 Ntụgharị-asụsụ nke First Presidency Message, January 2018. Igbo 15045 593