2018
Kpebie Ị Chegharị
January 2018


Ntorobia

Kpebie Ị Chegharị

Onye Isi Nduzi Monson kọwara na “òkè n’ọrụ anyị bụ i site n’amaghị otu e si eme ịhe bilie ma marazie otu e si emee ịhe, i site na ọdịda ma ruo na mmeri. “Ọrụ dịịrị anyị bụ ị nwe agwa nke kacha-nma. Ọtụtụ ndị mmadụ n’edobe Ọnwa Jenuarị maka ị mepụta ebum-n’uche na mkpebi nile ha nwere maka mwulite ndụ: ị nwe ihu ọchị karịa, ị ri nrị dị nma karịa, m’ọbụ ị mụta otụ aka ọrụ. Nagbanyeghi na ebum n’uche nile ndịa g’enyere gị aka ị nwe ezi mgbanwe karịa, kama ụzọ kacha nma eji agbanwe bụ site na nchegharị.

Nagbanyeghi na nchegharị n’ara ahụ, ọ bụ onyinye! Mgbe anyị dabere n’elu Jisọs Kraịst site n’ịchegharị na mmehie anyị nile, anyị g’enwe ike too-eto ma nwe ọganihu. Onye Isi Nduzi Monson Kwuru na “ Onye dị oke mkpa nime atụmatụ [nke nzọpụta]ahụ bụ Onye-nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst. Ewezuga nchụ-aja nzọpụta nke Ya, ịhe niile gaara-efu. Site na nchegharị, a g’enwe ike sachapụ mmehie gị ma ị g’enwe ike gaa n’ihu ị dị ka Ya karịa.

Chee maka ịhe ọbụla nke n’edobe gị ka ị ghara ị dị ka Onye Nzọpụta. Ọ bụ asụsụ gị? Ọ bụ otu i si akpasara ndị ezi n’ụlọ gị agwa? Mgbe ị chesịworo n’obi ịhe ndị ị nwere ike ịwulite, kpere Nna Bi N’igwe ekpere ma kwupụta ọchịchọ obi ị nwere maka mgbanwe. Chetakwa na site n’ike nke Aja Mgbaghara mmehie Ya, Jisọs Kraịst g’enwe ike nyere gị aka ị megide adịghị-ike gi. Dịka Onye Isi Nduzi Monson Kuziri, “Onyinye nke nchegharị, nke Onye-nzọpụta wetara anyị, na enyere anyị aka imezi ụzọ anyị.”