Ntorobia
Ihe atọ ị Na-echeta
Mkpụrụ okwu ahụ na-echeta pụtara ihé ọtụtụ oge n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Nifaị gbara ụmụnne ya ndị nwoke ume I na-echeta otu Chineke siri chekwaa ndị nna-nna-nna ha. Eze Benjamin gwara ndi ya I na-echeta idi ike nke Chineke. Ma Moronaị nyere ndị na-agụ ihe o dere iwu I na-echeta otu obi ebere Onye-nwe-anyị dị.
I na-echeta Onye-nzọpụta dị oke mkpa—anyị nakwa agba ọgbụgba-ndụ I na-echeta Ya oge ọbụla anyị n’eri oriri-nsọ ahụ. Onye-isi-nduzi Eyring na-akpọku anyị I na-echeta ihe atọ ndị a mgbe ana eri oriri-nsọ:
-
Na-echeta Jisọs Kraịst: Gụọ akwụkwọ-nsọ gbasara otu Onye-nzọpụta si jee ozi ma gosi ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ. Olee otu I si enwe mmetụta ịhụnanya Ya? Olee otu I si eje ozi ma gosi ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ dịka Onye-nzọpụta si mee?
-
Na-echeta ihe i kwesịrị ime nkeọma karịa: Jiri obi nchegharị tụgharịa uche n’elu izu-ụka gara aga. Họrọ otu ihe I nwere ike igbanwe, ma dedata otu I ga-esi eme mgbanwe ahụ nkeọma. Tinye ebumnobi ahụ I detara n’ebe I ga ahụta ya kwa mgbe kwa mgbe.
-
Na-echeta ọganiru I na-eme: Rịọ Chineke inyere gị aka hụta ọganiru dị mma I na-eme. Dedata otu o si emetụta gị.
Anyị ezughị-oke, mana Onye-nzọpụta maara nke ahụ. Ọ bụ ya mere Ọ si agwa anyị I na-echeta Ya. I na-echeta Ya na-enye anyị olile-anya ma na-enyere anyị aka ichọ imetazi. Ọbụna n’oge mgbe anyị na-ada I na-echeta Ya, Onye-isi-nduzi Eyring kwuru, “Ọ na-echeta unu oge niile.”