2018
Bịa mata Ya na Ezi na ụlọ Ya
February 2018


Ukpurunke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị Onwa Febụarị 2018

Bịa mata Ya na Ezi na ụlọ Ya

Nkuzi ndị nleta ụmụnwanyị bụ gbasara n’eziokwu ịbịa mata ma nwee ịhụnanya n’ebe nwanne nwanyị ọbụla nọ ka anyị wee nwee ike igba okwukwe ya ume ma jee ozi.

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

Rite Jeppeson na ndị nkuzi nleta yaa abụrụworịị ezigbo enyị ka ha na-abịa ma na ekekọrịta ukpuru niile nke oziọma. Ma nleta ha tinyekọtara igwụkọrịta egwuregwu mkpụrụ okwu ọnụ. Ọ bụ ihe kacha masị Rita gbasara ndi nkuzi nleta ya n’ihi ọ maara na ha bụ enyị ma na nleta ahụ abụghị nanị iji “Kanye” na abịawo. Enwere ọtụtụ ihe ndị ụmụnne nwanyị nwere ike ime n’oge nleta ahụ, dịka isoro gakọrịta ije ma ọbụ folie nwa obere ahịhịa n’ime ogige ka ụmụaka n’egwu egwuregwu.

Okenye Jeffrey R. Holland nke Kworum Ndi-Ozi Iri-na-abụọ kwuru, “Hụta onwe unu dịka ndi n’eje ozi pụrụ iche nke Onye-nwe n’ebe ụmụ Ya nọ. … Anyị ga-enwe olile anya … na unu ga-ewepụta oge nke dị eziokwu, nchekasi gbakwasara na oziọma maka ndi otu, n’elegide anya ma na-elepụrụ onye ọbụla anya, na-ahazi mkpa niile nke ime mmụọ na nke ụwa nke a n’ụzọ nke ga-enye aka.”1

Onye-nwe sitere na Moses nye ụmụ Isirel iwu na “onye ọbịa nke biri n’ebe obibi gị ga-abụ nye gị dịka otu onye amụrụ n’etiti unu, ma na I ga-ahụ [ya] n’anya dịka gị onwe gị” (Leviticus 19:34). Ụmụnne nwanyị ndị anyị n’aga nkuzi nleta ụmụnwanyị nwere ike bụrụ ndị ọbịa ka anyị n’ebido ije ozi anyị, mana dịka anyị na-abịa mata ya na ezi na ụlọ ya, ọchịchọ anyị ga-abawanye I “bụkọrịta ịbụ-arọ onye ọzọ, ka ha wee dị mfe” ma mee “obi anyị bịakọta n’ịdị n’otu na n’ime ịhụnanya otu onye na-ibe ya” (Mosaịa 18:8, 21).

Reyna I. Aburto, Onye-ndụmọdụ nke Abụọ n’ime Otu Ndị-isi-nduzi Zuru-ọha Otu Enyem-aka, na-echeta mgbe ọ bụụrụ onye otu ọhụrụ nke nzukọ-nsọ gbara alụkwaghịm. “Ndị nkuzi ndi nleta m bịara n’ebe obibi m,” ka o kwuru, “ma ha wetere m mmetụta dị jụụ nke isonye na ịhụnanya nye mkpụrụ obi m.”2

Tulee Nkea

N’etiti ezi na ụlọ nke ụmụnne nwanyị ị na agara nkuzi ndi nleta, kedụ emume dị n’ihu I kwesịrị ịma ama ma na-echeta?

Huba ama

  1. Jeffrey R. Holland, “Ndi n’eje ozi pụrụ iche nye Nzukọ-nsọ,” Liahona, Nov. 2016, 62.

  2. Reyna I. Aburto, “Kedụ Ihe Otu Enyem-aka Bụworo maka Mụ?” Ọgbakọ Ụmụnwanyị Mahadum Brigham Young, Ọnwa Mee 5, 2017, LDS.org.