2018
Na-echeta Ya Oge Niile
February 2018


Ọzi nke Otu Ndi-isi Ndụzi Mbu Ọnwa Febụarị 2018

Na-echeta Ya Oge Niile

I nwere ike isoro m jiri anya nke uche hụta onye-amụma Moronaị ka ọ na-edebanye okwu njedebe niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn n’elu epekele ọlaedo? Ọ nọọrọ nani Ya. Ọ hụtaworii obodo ya, ndị ya, na ezi-na-ụlọ ya ka ha dara. Ala ahụ bụụrụ “otu gburu gburu esepụghị aka” nke agha (Mọmọn 8:8). Ma o nwere olile-anya, n’ihi na ọ hụtawo ụbọchi anyị! Ma n’ime ihe niile nke o nwere ike ide, ọ kpọkuru anyị I na-echeta (lee Moronaị 10:3).

Onye-isi-nduzi Spencer W. Kimball (1895-1985) na-enwe ụtọ n’ikuzi na mkpụrụ okwu kacha dị mkpa n’ime ọkọwa okwu nwere ike ibụ na-echeta. N’ihi anyị agbawo ọgbụgba-ndụ anyị na Chineke, o kwuru, mkpa anyị kacha dị elu bụ I na-echeta” ha.1

I ga-achọta mkpụrụ okwu na-echeta n’ime akwụkwọ-nsọ niile. Mgbe Nịfai dọrọ ụmụnne ya nwoke aka na ntị, ugboro ugboro ọ na akpọku ha I na-echeta okwu niile nke Onye-nwe-anyị na I na-echeta otu Chineke siri chekwaa ndi nna nna ha (lee 1 Nịfai 15:11, 25; 17:40).

N’ime oké okwu ikpeazụ ya, Eze Benjamin tinyere mkpụrụ okwu ahụ na-echeta n’ime okwu ya ugboro asaa. O nwere olile-anya na ndi ya ga na-echeta “idi ukwuu nke Chineke … na ima mma na ogologo ntachi obi ya” ruo n’ebe ha nọ (Mosaịa 4:11; lee kwa 2:41; 4:28, 30; 5:11–12).

Mgbe Onye-nzọpụta mejupụtara oriri-nsọ ahụ, Ọ kpọkuru ndi na-eso ụzọ Ya inara-rie nke anụ-arụ “na ncheta” nke aja Ya (Luke 22:19). N’ime ekpere niile nke oriri-nsọ mụ na gị na anụta, mkpụrụ okwu ahụ oge niile na anodu n’ihu mkpụrụ okwu ahụ na-echeta (lee O&O 20:77, 79).

Ozi m bụ oku, ọbụladị arịrịọ, I na-echeta. Ndi a bụ alo atọ gbasara ihe ndị I nwere ike I na-echeta kwa izu-ụka mgbe I na-eri nke anụ-arụ dị nsọ nke oriri-nsọ. E nwere m olile-anya na ha ga abara gị uru, dịka ha siri baara m uru.

Na-echeta Jisọs Kraịst

Na mbụ, na-echeta Onye-nzọpụta. Na-echeta onye Ọ bụ mgbe Ọ nọ n’elu ụwa, otu O siri kwusiri ndi ọzọ okwu, na otu O siri gosipụta obi ebere n’ime agwa Ya niile. Na-echeta onye Ọ nọnyere n’oge Ya na ihe Ọ kuziri. Onye-nzọpụta “gara n’ihu n’eme ihe dị mma” (Ọlụ ndị ozi 10:38). Ọ gwọrọ ndị ọrịa. O kpebiri na-eme uche nke Nna Ya.

Kacha ihe niile, anyị nwere ike na-echeta oké ụgwọ nke Ọ kwụrụ, sitere na ịhụnanya Ya n’ebe anyị nọ, iji wezuga unyi nke mmehie anyị. Ka anyị na-echeta Ya, ọchịchọ anyị isoro ya ga-etolite. Anyị ga-achọ inwetụ obi-ebere karịa, nwee mgbaghara karịa, ma dịrị na njikere karịa ichọgharị uche nke Chineke ma mee ya.

Na-echeta Ihe I Kwesịrị Ime Nke-ọma

Ọ bụ ihe siri ike iche maka Onye-nzọpụta—enweghị ntupo na ozuzu-oke Ya—na-echeghị kwa otu anyị siri daa mba na ezughị-oke anyị na ntụnyere. Anyị emewo ọgbụgba-ndụ n’irube-isi na iwu-nsọ Ya, ma emesịa anyị na-adakarị mba site na ọnọdụ a dị oke elụ. Mana Onye-nzọpụta ahụ maara na nke a ga-eme, nke mere O jiri nye anyị emume-nsọ nke oriri-nsọ.

Oriri-nsọ nwere mgbọrọgwụ ya n’ime omume nke ichụ-aja Testament Ochie, nke tinyekọtara ikwupụta njọ (lee Leviticus 5:5). Anyị anaghị achụ-aja anụmanụ ọzọ, mana anyị ka nwere ike iwepụ aka na njọ anyị. Akwụkwọ-nsọ na-akpọ aja nke a “obi tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị” (3 Nifaị 9:20). Jiri obi nchegharị bịa n’ebe oriri-nsọ (lee O&O 59:12; Moronaị 6:2). Ka I na-eme otu, I ga-enwete mgbaghara nke njọ niile ma I gaghị adapụ site na ụzọ nke na-edughachi azu n’ebe Chineke nọ.

Na-echeta Ọganiru ahụ I Na-eme

Dịka I na-atụle ndụ gị n’oge emume-nsọ nke oriri-nsọ, e nwere m olile-anya na-echiche gị dabere ọbụna nanị n’elu ihe ndị I mehiere emehie kama nakwa n’elu ihe ndị I meziri emezi—oge mgbe ndị I nwetere mmetụta na Nna nke Eluigwe na Onye-nzọpụta ahụ nwere obi ụtọ n’ebe I nọ. I nwekwara ike iwere nwa obere oge n’oge oriri-nsọ ịrịọ Chineke ka O nyere gị aka ịhụta ihe ndị a. Ọ bụrụ ma I mee ya, a na m ekwe gị nkwa na I ga-enwete mmetụta. I ga-enwete mmetụta olile-anya.

Mgbe m meworo nke a, Mụọ ahụ ekwegharịworo m nkwa na ka m nọ ebe dị anya na ntozu-oke, a dịtụ m mma taa karịa otu m dị echi gara aga. Ma nkea na-enye m obisike na, n’ihi Onye-nzọpụta ahụ, e nwekwara m ike ịdịmma echi karịa otu m dị.

Oge niile bụ oge dị anya, ma ọ pụtara itụnye ọtụtụ mgbali lekwasịrị anya. I maara site na uche I nwetere n’onwe otu o si sie ike ichegide n’otu ihe oge niile ahụ. Mana na-agbanyeghị otu I sịrị debesie nke ọma nkwa I kwere I na-echeta Ya oge niile, Ọ na-echeta gị oge niile.

Onye-nzọpụta maara ihe aka mgba gị niile. Ọ maara ihe ọ dịka I nwe mkpa niile nke ndụ na-abịakwasi gị n’elu. Ọ maara otu I siri nwee mkpa ngwa ngwa nke ngọzi na-abịa site na-icheta Ya oge niile na irubere Ya isi—“ka [gị] wee na-enwe Mụọ ya oge niile ịnọnyere [gị]” (O&O 20:77; nkọwasiike agbakwunyere).

Ya mere, Ọ na-anabata gị ọzọ n’ebe tebuulu oriri-nsọ izu-ụka ọbụla, ọzọ kwa na-enye gị oghere ịgba-aka ebe n’ihu Ya na gị ga na-echeta Ya oge niile.

Huba ama

  1. Spencer W. Kimball, “Gburu gburu niile nke Mbuli-elu” (okwu nye ndi mụta nke okpukperechi Usoro Mmụta Nzukọ-nsọ, Ọnwa Jun 28, 1968), 5.