2021
Too n’ime Ụkpụrụ nke Mkpughe
Jenụwarị 2021


“Too n’ime Ụkpụrụ nke Mkpughe,” Liahona,Jenụwarị 2021

Ozi LiahonaKwa ọnwa, Jenụwarị 2021

Toon’ime Ụkpụrụ nke Mkpughe

A na m agba unu ume isoro nzọm ụkwụ ndị dị mkpa ịnụrụ Onyenwe anyị karịa na mgbe ụfọdụ karịa ka gị wee nwee ike nata ezi nghọta Ọ chọrọ inye gị.

Foto, oyiyi
osisi

Foto sitere na Getty Images

Na Septemba 30,2017, n’isote nzukọ ehihe nke ọgbakọ zuru ọha, akwụsịrị n’ụlọ ọgwụ ileta onye otu kworum m hụrụ n’anya Okenye Robert D. Hales. Ọ nọwo n’ụlọ ọgwụ kemgbe ọrịa mgbawa obi ụbọchị ole ma ole tupu.

Anyị nwetere nleta mara ọma, ma ọ dịịrị ka ọ n’eme nke ọma. Ọ nọọrọ nnọọ n’eku ume nonwe ya, nke bụụrụ akara dị mma.

Na mgbede ahụ, kosiladị, Mmụọ ahụ gwara m na mkpụrụ obi na uche m na m ga-alaghachị n’ụlọ ọgwụ na Sọnde. N’oge nzukọ nke ụtụtụ Sọnde nke ọgbakọ zuru ọha, mmetụta ahụ siri ike laghachịrị. Ọ metụrụ n’obi ịhapụ nri ehihe ma gbaga ọsọ ọsọ n’akụkụ akwa Okenye Hales ngwa ngwa nzukọ nke ụtụtụ gasịrị, nke m mere.

Mgbe m garụrụ, a hụtara m na Okenye Hales agbanwewo nke ọjọọ. Na mnwute, ka nkeji 10 gasịrị mgbe m batara ọ nwụrụ, mana obi juru m n’ekele na m nọ n’akụkụ ya mụ na ezigbo nwunye ya, Mary, na ụmụ ha ndị nwoke abụọ mgbe ọ hapụrụ ụwa a.

Ụdị obi ekele jupụtara m na mmetụta nke Mmụọ Nsọ ahụ kpalitere m ime ihe m n’enweghị ike ime na nkịtị. Na ụdị obi ekele jupụtara m maka eziokwu nke mkpughe ma na eluigwe ghe oghe ọzọ kwa.

N’afọ a ebe nlekwasị anya anyị maka ọmụmụ ihe nke onwe na nime klas ga-abụ Ozizi na Ọgbụgba niile. “Mkpughe ndịa dị nsọ na nkwupụta mmụọ kpalitere” nwere ike gọzie ndị niile ndị na-amụta site na ha ma mee ihe na ntụzi aka ha dị nsọ. Ha na-akpọku “mmadụ niile ebe niile ị nụrụ olu nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,”1n’ezia n’ezia “olu nke Onyenwe anyị nọ nye mmadụ niile” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 1:2

Ihe egwu, Ọchịchịrị, Nghọgbu

Oké ifufe nke anụ ahụ na nke ime mmụọ bụ akụkụ nke ndụ n’elu ụwa, dịka ọrịa zụrụ ụwa COVID-19 chetewooro anyị. N’oge tupu Ọbịbịa Nke Abụọ Ya, Onye Nzọpụta buru amụma ụbọchị oké mkpagbu. O kwuru, “A ga-enwe ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, na ala ọmajijiji, n’ebe niile dị iche iche” (Joseph Smith—Matiu 1:29

Ịchịkọta ụdị mkpagbu a bụ ọchịchịrị ahụ n’amụba na nghọgbu nke gbara anyị gburu gburu. Dịka Jizọs gwara ndị n’eso ụzọ Ya, “Ihe ọjọọ ga-abawanye” tupu nlaghachị Ya (Joseph Smith—Matiu 1:30

Setan akpọpụtawo ndị agha ya ma na-alụ agha megide ọrụ nke Onyenwe anyị na anyị ndị nọ n’ọrụ a. N’ihi ihe egwu na-amụba ndị anyị n’ezute, mkpa anyị maka odudu dị nsọ enwebeghị mgbe ọ karịrị akarị, ma mbọ anyị ị nụrụ olu nke Jizọs Kraịst—Onye Nkwuchite, Onye Nzọpụta, na Onye Mgbapụta anyị—adịbeghị ma ọlị mgbe ọ dị ọsọ ọsọ.

Dịka m kwuru mgbe n’adịchaghị anya akpọrọ m dịka Onyeisi nke Nzukọ nsọ, Onyenwe anyị dị njikere ikpughere anyị uche Ya. Nke ahụ bụ otu n’ime ngọzi Ya kachasị ukwuu nye anyị.2

N’ụbọchị anyị, O kwewo nkwa, “Ọ bụrụ na ị ga-arịọ, ị ga-anata mkpughe n’elu mkpughe, amamiihe n’elu amamiihe” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 42:61

A mam na Ọ ga-enye aziza na arịrịọ anyị dum.

Otu Anyị Si Anụrụ Ya

Ịmata otu Mmụọ ahụ sị ekwu okwu dị mkpa taa. Ịnata mkpughe nke onwe, ịchọta aziza, na ịnata nchekwa na odudu, anyị n’echete usoro nke Onye Amụma Joseph Smith haziiri anyị.

Na mbụ, anyị n’erukpu onwe anyị nime akwụkwọ nsọ. Ime otua n’emepe uche na obi anyị nye nkuzi na eziokwu niile nke Onye Nzọpụta. Okwu nke Kraịst “n’agwa [anyị] ihe niile nke [anyị] kwesịrị ime” (2 Nifaị 32:3kacha nke n’ụbọchị ndịa nke ejighị n’aka na ọgba aghara.

Ọzọ anyị ekpee ekpere. Ekpere n’achọ ebumnuche, ya mere anyị ejiri umeala bịakwuru Chineke, chọta ebe dara jụụ ebe anyị nwere ike gaa ugboro ugboro, ma kwupụta obi anyị nye Ya.

Onyenwe anyị n’ekwu sị, “Bịaruo nụ m nso ma a ga M abịaru unu nso; jiri ịrụsị ọrụ ike chọọ m ma unu ga-achọta m; rịọ, ma unu ga-anata; kụọ aka, ma a ga-emeghere unu” (Ozizi na ọgbụgba-ndụ niile 88:63

Ịbịaru Onyenwe anyị nso n’ewete nkasị obi na mgbam ume, olile anya na ọgwụgwọ. Ya mere, anyị n’ekpe ekpere n’aha Ya banyere nchegbu anyị na adịghị ike anyị niile, ọchịchọ anyị niile na ndị anyị hụrụ n’anya, ọkpụkpọ oku anyị na ajụjụ anyị niile.

Emesịa anyị egee ntị.

Ọ bụrụ n’anya ga anọ n’ikpere anyị na nwa oge ka anyị kpesịrị ekpere, echiche, mmetụta, na ntuzi aka ga-abịa n’ime obi anyị. Idetu nkpali mmụọ ndịa ga-enyere anyị aka cheta omume ndị Onyenwe anyị ga-achị ka anyị mee.

Foto, oyiyi
nwanyị na-amụ ihe

Dịka anyị n’emegharị usoro a, anyị ga, n’okwu nke Onye Amụma Joseph Smith, “too n’ime ụkpụrụ nke mkpughe.”3

Tozuo oke Ịnata Mkpughe

Imezi nke ọma ike anyị maka ịmata ntaka nke Mmụọ Nsọ na imelite ike anyị ịnata mkpughe na-achọ ntozu oke. Ntozu oke anaghị achọ ozuzu oke, kama ọ na-achọ ka anyị gbalịa maka mụbaa ịdị ọcha.

Onyenwe anyị na-achọ mbo kwa ụbọchị, ọganiihu kwa ụbọchị, nchegharị kwa ụbọchị. Ntozu oke n’ewete ịdị ọcha, ma ịdị ọcha n’eme anyị etozuo maka Mmụọ Nsọ. Dịka anyị n’ewere “Mmụọ Nsọ ahụ maka odudu [anyị]” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 45:57anyị n’etozu maka mkpughe nke onwe.

Ọ bụrụ na enwere ihe n’akwụsị anyị site n’imepe ọnụ ụzọ ntuzi aka nke eluigwe, ọ dị mkpa na anyị chegharịrị. Nchegharị n’ekwe anyị imepe ọnụ ụzọ ahụ ka anyị wee nwee ike nụrụ olu nke Onyenwe anyị ugboro ugboro na n’ụzọ doro anya.

“Ọmụmaatụ ahụ doro anya,” ka Okenye David A. Bednar nke Kworum Ndị ozi Iri na abụọ kuziri. Ọ bụrụ ihe anyị n’eche, n’ahụ, n’anụ, ma ọbụ n’eme nakpọpụ anyị pụọ site na Mmụọ Nsọ, mgbe ahụ anyị ga-akwụsị iche echiche, ịhụta, ịnụrụ, ma ọbụ ime ihe ahụ. Ọ bụrụ na ihe ahụ echere g’eme obi ụtọ, n’ịmaatụ, na-achụpụ anyị site na Mmụọ Nsọ, mgbe ahụ n’ezia n’ezia ụdị ihe ime obi ọma ahụ abụghị maka anyị. N’ihi Mmụọ ahụ enweghị ike ịnọgide ihe ahụ nke rụrụ arụ, nke ọjọọ, na nke na-enweghị isi, mgbe ahụ n’ezia n’ezia ụdị ihe ndị ahụ abụghị maka anyị.”4

Mgbe anyị n’achịkọta ịdị ọcha mụbara amụba na nrube isi ya na ibu ọnụ, ịchọsike, ọmụmụ nke akwụkwọ nsọ niile na okwu ndị nke ndị amụma dị ndụ, na ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ, eluigwe ga-emepe. Onyenwe anyị, n’aka nke ya, ga-emejupụta nkwa Ya: “A ga m enyekwasị unu Mmụọ m, nke ga-eme uche unu amara ihe” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:13).

Ọ ga-adị mkpa na-anyị ga-enwe ndidi, mana Chineke ga-agwa anyị okwu n’ụzọ nke Ya na n’oge nke Ya.

Mmụọ nke Nghọta

Job kwupụtara, “E nwere mmụọ dị n’ime mmadụ: ma nkwalite mmụọ nke Onye Kachasị Elu n’enye ha nghọta” (Job 32:8 Nafọ ọhụrụ nkea, A na m agba unu ume isoro nzọm ụkwụ ndị dị mkpa ịnụrụ Onyenwe anyị karịa na mgbe ụfọdụ karịa ka gị wee nwee ike nata ezi nghọta Ọ chọrọ inye gị.

Tupu ọnwụ nke Okenye Hales n’ụbọchị Ọktoba ahụ n’afọ 2017, ọ kwadoro okwu dị nkenke maka ọgbakọ zuru ọha nke ọ n’enweghị ike inye. N’okwu ahụ, o dere, “Okwukwe anyị na-akwado anyị ịnọrọ n’ihu nke Onyenwe anyị.”5

Mgbe anyị na-anata mkpughe, anyị na-anọ n’ihu Chineke dịka Ọ n’ekpughe obi, uche, na olu Ya nye anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 68:4 Ka anyị tinye okwukwe anyị n’ọrụ, n’akpọku Ya, n’ebi ndụ ntozu oke nke nkwa nkpalite mmụọ Ya, na na-ime ihe n’odudu anyị natara.

Hụba-ama

  1. Nkọwa nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile.

  2. Lee Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona,Mee 2018, 94.

  3. Teachings of Presidents of the Church: Joseph Smith2007), 454.

  4. David A. Bednar, “Ka Anyị Wee Nwee Mgbe Niile Mmụọ Ya Ịnọnyere Anyị,” Liahona,Me 2006, 30.

  5. N’ime Neil L. Andersen, “Olu nke Onyenwe anyị,” Liahona,Nov. 2017, 125.

Bipụta