“Joseph Smith na Epekele Ọla edo,” Friend,Janụwarị 2021, 42–44
Akụkọ Akwụkwọ nsọ niile
Joseph Smith na Epekele Ọla edo
Joseph Smith bụụrụ onye amụma. O nyeere Jizọs aka weghachite Nzukọ nsọ Ya n’ụwa.
Joseph kpere ekpere ịmata nzukọ nsọ nke o kwesịrị ịga. Jizọs kwuru ka ọ ghara ịga nzukọ nsọ nke ọbụla. Enweghị nke ọbụla n’ime ha bụ Nzukọ nsọ Ya.
Onye mmụọ ozi Moronaị bịara leta Joseph. Moronaị gwara ya banyere akwụkwọ pụrụiche edere n’elu epekele ọla edo. Eliri ya n’elu ugwu nọ nso.
Jiri enyem aka nke Nna nke Eluigwe, Joseph tụgharịrị asụsụ edere n’elu epekele ndị ahụ. Ihe ndịa edere ede abụrụzie Akwụkwọ nke Mọmọn
Ugbua anyị nwere ike ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn. Ma anyị nwere ike gaa Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst!