“Nleta nke Jọn Omee Baptizim,” Friend, Febụwarị 2021
Ozi nke Friend Kwa ọnwa, Febụwarị 2021
Nleta nke Jọn Omee Baptizim
Otu ụbọchị Joseph Smith na Oliver Cowdery nwere ajụjụ. Kedụ ụzọ ziri ezi iji mee baptizim? Ha kpere ekpere ịmara aziza ya.
Otu mụọ-ozi bịara. Ọ bụrịị Jọn Omee Baptizim. O mewo Jizọs baptizim. Ọ gwara ha na ha kwesịrị inwe ọkwa nchụaja iji mee ndị mmadụ baptizim.
Jọn gọziri Joseph na Oliver. O nyere ha ọkwa nchụaja. Ugbua ha nwere ike mee ndị mmadụ baptizim n’ụzọ esi mee Jizọs.
Joseph mere Oliver baptizim n’ime osimiri. Mgbe ahụ Oliver emee Joseph baptizim. Emesịa, ọtụtụ ndị ọzọ mekwara baptizim.
N’ihi na Nna nke Eluigwe zara ekpere Joseph Smith, ọkwa nchụaja ahụ alọghachịwo n’ụwa! Enwere m ike ime baptizim dịka emere Jizọs.
© 2021 site na Intellectual Reserve, Inc. All rights reserved. Ebiri ya USA. Akwadoro n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi nke ndị Nkuzi Nleta, Ọnwa mbụ 2016. Igbo17464 593