2021
Chineke Gwara Anyị ka anyị Mee Baptizim
Febụwarị 2021


“Chineke Gwara Anyị ka anyị Mee Baptizim,”Liahona, Febụwarị 2021

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Febụwarị 2021

Chineke Gwara Anyị ka anyị Mee Baptizim

Jizọs Kraịst gosiri ọmụmatụ nke ime baptizim site n’aka onye ji ikike nke Chineke.

N’ebe anyị amachaghị ọtụtụ ihe kọwara banyere ndụ nke Jizọs Kraịst n’onwe ya, anyị maara na O mere baptizim mgbe ọ gbara ihe dịka afọ 30 (lee Luk 3:23). Ndịa bụ ụfọdụ ihe ndị anyị mụtara banyere baptizim site na ọmụmaatụ Ya.

Nye Mmadụ Niile

Ọbụrụ na anyị etoruo ma tozuo oke imata ọdịiche dị n’etiti iheziri ezi na nke n’ezighị ezi, Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị mee baptizim (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:42). Jizọs zururịị oke, mana Ọ ka họọrọ ime baptizim iji soro iwu nsọ nke Chineke (lee Matiu 3:13-17; 2 Nifaị 31:7). Ọbụna ndị ahụ nwụworo anwụ nwere ike nabata baptizim. Anyị n’enye ha ya site na-ime baptizim maka ha n’ime tempụl. (Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 128:15-18).

Foto, oyiyi
baptizim

Eji Ikike Mee

Jizọs emeghị baptizim site n’aka onye ọbụla nnọọ. Ọ gakwuuru nwa nwanne nne Ya Jọn kpọmkwem, onye nwere ikike ọkwa nchụaja sitere n’aka Chineke. Mgbe ọnwụ Jizọs gafechara ma egbuchaa ndị ozi Ya, ikike ọkwa nchụaja ahụ furu efu site n’ụwa. Emesịa, n’afọ 1829, Jọn Omee Baptizim pụtakwutere Joseph Smith ma nye ya ikike ime baptizim n’aha nke Chineke. N’ihi mweghachite ahụ, e nwere ike jiri otu ụdịrị ikike ahụ mee anyị baptizim taa.

Foto, oyiyi
mweghachite nke Ọkwa-nchụ-aja nke Erọn

Nkwa Ụzọ-Abụọ

Baptizim gunyere nkwa ụzọ-abụọ, ma ọbụ ọgbụgba ndụ, dị n’etiti anyị na Chineke. Anyị n’ekwe nkwa:

  1. Iwekwasị onwe anyị aha nke Kraịst.

  2. I cheta Ya mgbe niile.

  3. I dobe iwu nsọ Ya niile.

Na nkwụghachị, Chineke n’ekwe nkwa na Mmụọ Ya ga anọnyere anyị mgbe niile. Okwu nke ekpere oriri nsọ n’echetere anyị maka ọgbụgba ndụ nkea kwa izu ụka. (Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 20:77, 79).

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ nọ na nzukọ oriri nsọ

Ịnata Mmụọ Nsọ Bụ otu Akụkụ Dị Mkpa nke Baptizim

Mgbe emesịrị Jizọs baptizim, Mmụọ Nsọ pụtara n’ụdịdi nduru (lee 2 Nifaị 31:8). Taa, mgbe emesịrị ndị mmadụ baptizim, e mee ha ndi otu. Nkea pụtara na ha ga-anata ngọzi pụrụ iche nke bụ na akpọkuru ha ịnata onyinye nsacha nke ime mmụọ nke Mmụọ Nsọ (lee 2 Nifaị 31:17). Mmụọ Nsọ nwere ike ịdọ anyị aka na ntị maka ihe egwu, kasie anyị obi, duo anyị ime ezi mkpebi, ma nyere anyị aka nwee mmetụta ịhụnanya nke Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 39:6).

Foto, oyiyi
onye inyom a na-eme onye otu

Anyị Nwere ike Ichegharị Mgbe niile

Chineke maara na anyị ga-emehie ihe. N’agbanyeghị mgbalị anyị kachasị mma, anyị ga-eme njọ ma daa mba imezu nkwa baptizim anyị. Ya mere Ọ na-enye onye ọbụla n’ime anyị ohere ichegharị. (Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 18:13). Ụbọchị niile anyị nwere ike gbalịsịe ike ịrịọ mgbaghara ma metazie njehie ọbụla niile. Anyị nwere ike kpee ekpere ma rịọ maka mgbaghara nke Chineke. Emesịa, mgbe anyị jiri obi umeala nara oriri nsọ, anyị nwere ike nwee Mmụọ Nsọ ịnọnyere anyị (lee 3 Nifaị 18:11).

Foto, oyiyi
onye inyom n’ekpe ekpere n’akụkụ akwa

Gịnị Ka Akwụkwọ nsọ N’ekwu banyere Baptizim?

Ndị nne na nna kwesịrị inyere ụmụ ha aka kwadoo maka baptizim (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25).

Ndị ahụ na-agbarubeghị afọ asatọ enweghị mkpa ime baptizim (lee Moronaị 8).

Mgbe emere anyị baptizim, anyị n’ekwe nkwa “isoro ndị n’eru uju ruo uju; … kasịeobi ndị ahụ nọ na mkpa nkasị obi, na iguzoro dịka ndị aka ebe nke Chineke n’oge niile na n’ihe niile, na n’ebe niile” (Mosaịa 18:9).

Bipụta