2021
Mkpughe Na-aga n’ihụ
Maachị 2021


“Mkpughe Na-aga n’ihu,“ Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Mar. 2021, 16.

Ozi Kwa Ọnwa, Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Maachị 2021

Mkpughe Na-aga n’ihụ

Sitere na ozi ọgbakọ zuru ọha Eprel 2020.

Foto, oyiyi
Ọhụ Nke Mbụ

Ngosipụta si n’aka Ben Simonsen

Onye-amụma Joseph Smith natara mkpughe na-elu mkpughe. Ọtụtụ mkpughe nke Onye-amụma Josef natara ka echekwaworo maka anyị n’ime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile.

Na mgbakwunye, a gọziri anyị site na mkpughe na-aga n’ihu nye ndị amụma dị ndụ bụ ndị oje ozi“enyere ọrụ nke Onyenwe anyị, nyere ikike ikwuchitere ya.“1

Mkpughe nke onwe dịkwa maka ndị niile ji obi umeala na-achọ nduzi site n’aka Onyenwe anyị. Ọ dị mkpa dị ka mkpughe si n’aka onye amụma.

Mkpughe nke onwe dabeere n’eziokwu niile nke anatara n’aka Mmụọ Nsọ. Mmụọ Nsọ bụ onye ekpughe na onye ọgba ama nke n’ezi-okwu niile, karịsịa nke Onye-nzọpụta. E wezụga Mmụọ Nsọ, anyị enweghị ike ịmata n’ezie na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Ọrụ ya dị oké mkpa bụ ịgba akaebe banyere nke Nna na Ọkpara na aha Ha na ebube Ha.

A na m ekwe unu nkwa na onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịnata nduzi mkpughe dịka anyị ji obi umeala na-arụ ọrụ n’ime ubi vine nke Onyenwe anyị.

Arịrịọ m dị nwayọ bụ na onye ọbụla n’ime anyị ga-achọ mkpughe na-aga n’ihu iduzi ndụ anyị ma soro Mmụọ ka anyị na-efe Chineke Nna na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.

Lee anya

  1. Hugh B. Brown, “Joseph Smith n’etiti ndị Amụma“ (Okwuchukwu Ncheta Joseph Smith Kwa afọ nke Iri na isii, Logan Institute of Religion, Dec. 7, 1958), 7.

Bipụta