2021
Jizọs Kraịst Gwara Anyị ka Anyị were Oriri-nsọ ahụ
Maachị 2021


“Jizọs Kraịst Gwara Anyị ka Anyị Were Oriri-nsọ ahụ,“ Liahona, Maachị 2021

Ozi LiahonaKwa ọnwa, Maachị 2021

Jizọs Kraịst Gwara Anyị ka Anyị Were Oriri-nsọ ahụ

A sachapụrụ anyị ma gwọọ anyị dịka anyị n’echeta Onye Nzọpụta anyị kwa izu.

Foto, oyiyi
Nri Anyasị Ikpeazụ

Nri Anyasị Ikpeazụ, site n’aka Carl Heinrich Bloch

Tupu Ọ nwụọ, Jizọs Kraịst riri otu nri ikpeazụ nke a kpọrọ Nri Anyasị Ikpeazụ. Mgbe ha richara nri a, O mere ka ndị na-eso ụzọ Ya mata oriri-nsọ. Ọ yawara achicha ma gọzie ya. O kwuru sị, “Mee nke a na-echeta m.“ (Luk 22:19). O wee gọzie ma kesaa otu iko mmanya.

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ na-anata oriri-nsọ

Akụkụ nke Ofufe Kwa Izu

Mgbe eweghachitere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst n’elu uwa, oriri-nsọ bụrụziri akụkụ nke ofufe kwa izu. N’oge nzukọ nsọ, a na-agọzi oriri-nsọ site n’aka ndị ji ọkwanchụ aja. Ha na eji okwu sitere n’akwụkwọ nsọ ekpe ekpere (lee Moronai 4; 5). Mgbe ahụ onye ọbụla nọ n’ọgbakọ ahụ na-ata achịcha ma na-a nụ mmiri iji cheta Jizọs Kraịst na aja Ya maka anyị, otu Ọ gwara anyị.

Foto, oyiyi
Onye inyom nta na-ekpe ekpere

Foto si n’aka Angela Suitter

Na-akwadebe Iri

Iji kwado maka oriri-nsọ, anyị kwesịrị iji ezi obi chee echiche gbasara ndụ anyị na nhọrọ anyị. Anyị kwesịrị ichegharị na njehie na mmehie nke izu gara aga, gụnyere ịrịọ Chineke maka mgbaghara. Anyị ekwesighị izu oke iji rie oriri-nsọ, mana obi anyị kwesịrị ịdị umeala.

Foto, oyiyi
Ekpere na Gethsemane

Ekpere na Gethsemane, site n’aka Del Parson

Karịa Achịcha na Mmiri

Iri oriri-nsọ bu oge dị nsọ, ezigbo nsọ. Ekpere nke oriri-nsọ na-echetara anyị na dịka anyị n’ewere achịcha ahụ na mmiri, na anyị na-echeta ahụ na ọbara Jizọs Kraịst nyere anyị. Anyi na ekwe nkwa i soro Ya ma bie ndu onyeụka Kraịst. Anyi n’ekwe nkwa igbali idebe iwu Chineke. Na nzaghachi, Mmụọ Nsọ ga-akasi anyị obi, duzie anyị ma gwọọ anyị.

Foto, oyiyi
baptizm

Imeghari Ọgbụgba-ndụ ọhụrụ

Mgbe ndi nime anyi ndi meworo baptizim jiri obi dị ocha rie oriri-nsọ, anyi na emeghari ọgbụgba-ndụ anyi mere n’oge baptizim. Nke a gụnyere ịnata Mmụọ Nsọ na ịsachapụ mmehie dị ka e mere anyị baptizim ọzọ. Nke a bụ olileanya na ebere Jizọs na-enye onye ọ bụla n’ime anyị. O nweghị mgbe ọ gaala oke ngafe ichegharị ma ka a gbaghara gị.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst na-ewebata oriri-nsọ nye ndị Nifaị

Na Unu Na-echeta M Mgbe Niile, nke Gary L. Kapp dere, agaghị a nomiri ya

Gịnị Ka Akwụkwọ nsọ N’ekwu banyere Oriri-nsọ?

Anyị kwesịrị inyocha onwe anyị nke ime mmụọ, jiri ezi obi na-ele anya n’ime, tupu iwere oriri-nsọ (lee 1 Ndị Kọrịnt 11:28).

Mgbe emere ka O si n’ọnwụ Bilie, Jizọs gosiri ndị ya nọ na mba Amerika otu ha ga-ewere oriri-nsọ (lee 3 Nifaị 18).

Ndị amụma nke oge a gwara anyị ka anyị jiri achịcha na mmiri maka oriri nsọ, mana ihe anyị na-eri ma ọ bụ na-a nụ adịghị mkpa n’ezie (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:2). Mgbe ụfọdụ, ndị nwere ọrịa nrịanrịa kwesịrị iji ihe ọzọ yiri achịcha.

Nri Anyasị Ikpeazụ, nke Carl Heinrich Bloch dere; foto nwata nwanyị na-ekpe ekpere site n’aka Angela Suitter; Ekpere na Gethsemane, nke Del Parson dere; Na Unu Na-echeta M Mgbe Niile, nke Gary L. Kapp, agaghị a nomiri ya

Bipụta