2021
Jizọs Kraịst Zọpụtara Anyị site n’Ọnwụ na Mmehie
Eprel 2021


Jizọs Kraist Zọpụtara Anyị site n’Ọnwụ na Mmehie,” Liahona, Eprel 2021

Ozi LiahonaKwa ọnwa, Eprel 2021

Jizọs Kraịst Zọpụtara Anyị site n’Ọnwụ na Mmehie

Niihi Aja Ya, anyị niile nwere ohere ịchọta udo na ọńụ dị ebighị ebi.

Foto, oyiyi
Nri Anyasị Ikpeazụ

Kraịst Na-eke Ụwa, nke si n’aka Robert T. Barrett

Anyị na-arụtụ Jizọs kraịst aka dịka Onye Nzọpụta anyị. Nke ahụ bụ niihi na Ọ kwụrụ ụgwọ maka mmehie anyị ma merie ike nke ọnwụ. Ọ zọpụtara anyị! Aja Ọ chụrụ maka anyị, a kpọrọ Aja mgbaghara mmehie, bụ ihe e mere kachasị mkpa e metụgoro. Niihi Ya, ọnwụ abụghị nsọtụ. Nihi Ya, e nwere ike gbaghara anyị mmehie anyị, anyị adị ọcha ọzọ, ma gaaniihu ịdịmma karịa kwa ụbọchị.

Jizọs Kraist Bụrịị Onye Mbụ A Mụrụ

Tupu abịa n’ụwa, anyị na nne na nna nke eluigwe bibụrịị. Dịka Onye Mbụ A Mụrụ, Jizọs Kraịst nyere aka kee ọmarịcha ụwa nke a. A họọrọ Ya ịbụ Onye Nzọpụta anyị ma kweta ka a mụọ Ya n’ụwa ka O wee nwee ike hiwe ọmụmaatụ zuruoké, kuzie oziọma Ya, ma mezuo Aja mgbaghara mmehie maka anyị.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst na-ekpe ekpere na Getsemene

O Nna M,site n’aka Simon Dewey

Jizọs Kraịst Kwụrụ Ụgwọ maka Mmehie Anyị

Mgbe Jizọs maara na Ya ga-anwụ mgbe na-adịghị anya, Ọ gara n’ubi nke Getsemane ikpe ekpere. N’oge ekpere ahụ, Ọ malitere ịkwụ ụgwọ maka mmehie anyị. O wepụtara onwe ya taa ahụhụ ka ọ ga-abụ na anyị agaghị—ma ọbụrụ na anyị echegharịa. Ọbụrụ na anyị atụgharịa site na mmehie anyị ma kama soro Onye Nzọpụta, anyị nwere ike chọta mgbaghara na ọgwụgwọ. Niihi nhụmiihe O nwetara na Getsemane, Jizọs ghọtara kpọmkwem ihe otu oji dịrị onye ọbụla niime anyị. Nsogbu anyị, ọrịa anyị, na ihe mgbu anyị metụtara Ya. Nke a bụ mpaghara nke mbụ nke Aja mgbaghara mmehie.

Foto, oyiyi
olili nke Kraịst

Olili nke kraịst, site n’aka Carl Heinrich Bloch

Jizọs Kraịst Meriri Ọnwụ

Mgbe O kpechara ekpere na Getsemane, a raara Jizọs nye, nwụchie ya, ma maa ya ikpe ọnwụ site na mkpọgbu. Ọbụlaghị na O nwere ike ime ihe niile, Jizọs hapụrụ Onwe Ya maka ịnwụ ọnwụ neelu obe. Ndị na-eso Ya jiri ịhụnaanya tinye ahụ Ya niili. Ha amataghị na na-agbanyeghị na ahụ Ya nwụrụ, mmụọ Ya dịrịị ndụ na-ala mmụọ. Ka mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị, Jizọs dịịrị ndụ ọzọ ma gaa leta ha, igosị na Ya pụrụ imeri ọnwụ. Nke a mezuru Aja mgbaghara mmehie ahụ. Niihi na Jizọs bilitere n’ọnwụ, onye ọbụla niime anyị ga-adị ndụ ọzọ mgbe anyị nwụchara.

Foto, oyiyi
Kraịst na Meri ebe ili

Ọ Dị Ndụ, nke si n’aka Simon Dewey

Ihe Ekeresimesi na Ista Pụtara

Ọtụtụ ndị bi n’ụwa na-eme mmemme ụbọchị ezumiike ọrụ abụọ nke na-enyere anyị aka icheta Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist. N’oge ekeresimesi, anyị na-echeta n’obi ekele na Jizọs dị na njikere ịnabata ozi nke ịbịa n’ụwa, ọbụlaghị na nke ahụ gụnyere ịta ahụhụ na ịnwụ ọnwụ maka anyị. Ista na-eme mmemme mmeri nke Onye Nzọpụta meriri mmehie na ọnwụ, nke na-enye anyị olileanya maka ọńụ nke ebighị ebi dị niihu.

Foto, oyiyi
Kraịst na-akpọku Pita na Andrụ

Kraịst Na-akpọku Pita na Andrụ, nke si n’aka Jems Taylor Harwood

Gịnị Ka Akwụkwọ nsọ N’ekwu banyere Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta?

Niihi na Jizọs maara anyị nke ọma, O nwere ike “lekọta,” ma ọbụ nyere anyị, aka (lee Alma 7:11–12).

Onye Nzọpụta ghọtara iru uju na ọrịa anyị (lee Aịzaya 53:2–5).

Chineke zitere Jizọs ịzọpụta anyị niihi na Chineke hụrụ onye ọbụla niime anyị naanya (lee Jọn 3:16–17).

Jizọs kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ Ya, tinyere anyị, inwe nchekwa site niihe ọjọọ na ịbụ otu ihe anyị na Ya na Nna nke Eluigwe (lee Jọn 17).

Onye Nzọpụta anyị na-akpọku anyị ịbịa soro Ya ma lọghachite niihu Ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 19:16–19, 23–24; 132:23).

Bipụta