2021
Ọkwa nchụaja nke Chineke
Ọgọst 2021


“Ọkwa nchụaja nke Chineke,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Aug. 2021, 20-21.

Ozi Kwa Ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Ọgọst 2021

Ọkwa nchụaja nke Chineke

Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 84

Ihe ntoroọbịa niile kwesịrị ịmara banyere ọkwa nchụaja na ihe jikọrọ ha na ya.

Foto, oyiyi
ntoroọbia

Ị chọpụtawo otu na-agbagwoju anya o nwere ike ịdị mgbe etinyere otu mkpụrụ okwu n’ụzọ abụọ? N’ịmaatụ, n’okwu Bekee mkpụrụ okwu ahụ ụwa na-arụtụ aka ma elu ụwa anyị bi n’ime ya ma unyi dị n’okpuru ụkwu anyị. Ha abụọ ziri ezi, kama ihe i chere mgbe i na-ekwu dabeere nihe i na-ekwu banyere ya n’oge ahụ. Ime ka ọ gbagwojuo anya karịa, mgbe ụwa pụtara elu ụwa anyị, ọ gụnyekwara echiche nke unyi, nihi unyi dị n’elu ụwa.

Ịkọwa Okwu ahụ Ọkwa nchụaja

Otu okwu anyị na-eji n’ụzọ abụọ n’ime Nzukọ nsọ bụ ọkwa nchụaja. Okwu ahụ na-arụtụ aka na ngụkọta ike na ikike dum nke Chineke. Kosiladị, anyị nakwa eji ọkwa nchụaja n’ụzọ pere mpe karịa—ịrụtụ aka na “ike na ikike nke Chineke na-enye ndị echiri echichi ji ọkwa nchụaja iji rụọ ọrụ n’ihe niile dị mkpa maka nzọpụta nke ụmụ nke Chineke.”1

Ọkwa nchụaja echiri mmadụ abụghị ike niile nke Chineke nwere. Chaati nke-a sotere na-egosi nchepụta nke a.

N’ime chaatị nke a ị ga-ahụ ụfọdụ ọmụmaatụ niile nke ike Chineke, nke n’enweghị ngwụcha ma enweghị oke. N’ime nke ahụ, ị na-ahụkwa ọmụmaatụ niile nke ike na ikike nke ọkwa nchụaja nke Chineke nke Ọ na-echi, ma ọbụ nyekwasị, ndịikom tozuru oke iji duzie n’ime Nzukọ nsọ nke Kraịst.

Ọmụmaatụ ndị nke Ikike Ọkwa nchụaja n’ime Ndụ Gị

Ngọzi niile nke ọkwa nchụaja dịịrị ụmụada na ụmụọkpara niile nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Ndepụta nke abụọ gosipụtara n’ụzọ dị mfe ngọzi ndị ahụ na-abịara gị site n’onye ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja ma ọbụ enyekwasịwo ya rịị ikike ọkwa nchụaja.

Nke a bụ usoro Chineke mepụtaworo maka nhazi na nchịkwa nke Nzukọ nsọ Ya n’elu ụwa. Ọmụmaatụ ndị ọzọ nke ikike ọkwa nchụaja nke Chineke gụnyere otu onyeisi kworum ndị dikọn ma ọbụ ndị nkuzi onye nwere ọtụghe niile iji duzie ọrụ nke kworum ya, ngọzi niile nke onye nna enyere n’ime ebe obibi, na emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl.

NdịIkom, NdịInyom, na Ọkwa nchụaja ahụ

N’agbanyeghị na echichi ọrụ ọkwa nchụaja ka a na-enye naanị ndịikom, Onyeisi Dallin H. Oaks, Onye Ndụmọdụ nke Mbụ n’ime Otu Ndịisi Mbụ, a kọwawo otu ụkpụrụ dị mkpa: “Ọkwa nchụaja ahụ bụ ike na ikike sinachi ejidere na ntụkwasị obi a ga-eji maka ọrụ nke Chineke maka uru nke ụmụ Ya dum. Ọkwa nchụaja abụghị ndị ahụ echiworo n’ọrụ ọkwa nchụaja ma ọbụ ndị na-eji ikike ya arụ ọrụ. Ndịikom ji ọkwa nchụaja abụghị ọkwa nchụaja ahụ. … Anyị ekwesịghị ịkpọ ndịikom echiri echichi dịka ọkwa nchụaja ahụ.2

N’agbanyeghị a naghị echi ndịinyom echichi ọkwa nchụaja, Onyeisi Russell M. Nelson kọwara, “mgbe enyere gị ikike ije ozi n’ọkpụkpọ oku n’okpuru nduzi nke otu onye ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja … enyewo gị ikike ọkwa nchụaja iji rụọ ọrụ n’ọkpụkpọ oku ahụ.”3 Ụfọdụ ọmụmaatụ ndị nke a gụnyere otu ndịisi klas NdịInyom Nta, ụmụnne nwanyị mgbasa oziọma na-ekwusa oziọma, ndị ndu n’ime ngalaba ukwu na stek niile ndị enyeworo ikike ikuzi ma duo, na ndị ọrụ emume nsọ n’ime tempụl.

Ike Ọkwa nchụaja Na-agọzi Onye Niile

Ngọzi niile unu ndịikom nta na ndịinyom nta na-anata bụ nke onwe unu site na ọgbụgba ndụ ndị unu na-eme na baptizim na ọgbụgba ndụ ndị unu ga-eme n’ime tempụl. Ọbụna ma i enweghị onye ji ọkwa nchụaja n’ime ezi na ụlọ gị, i nwekwara ike nwete ngọzi ike ọkwa nchụaja n’ime ndụ gị dịka ị na-edebe ọgbụgba ndụ ndị gị na Ya meworo (lee 1 Nefaị 14:14).

Dị ka anyị n’ebi n’usoro ọgbụgba ndụ anyị, anyị na-anata ngọzi ndị na-agba anyị ume ma gọzie anyị. Anyị na-akpọku unu ịtụgharị uche ngọzi niile nke ọkwa nchụaja n’ime ndụ unu—ngọzi ndị na-abịa n’ihi ike ọkwa nchụaja nke Chineke n’enweghị ọgwụgwụ na ndị ahụ na-abịa kpọmkwem site na ikike ọkwa nchụaja nke enyere ma họpụta n’ime Nzukọ nsọ nke Chineke.

Nhụba-ama

  1. Dale G. Renlund na Ruth Lybbert Renlund, Ọkwa Nchụaja Melkizedek Ahụ: Ịhọta Ozizi ahụ, Ibi ndụ Ụkpụrụ ahụ (2018), 11.

  2. Dallin H. Oaks, “Ọkwa Nchụaja Melkizedek Ahụ na Ọtụghe ahụ niile,” Apr. 2020 ọgbakọ zuru ọha (Ensign ma ọbụ Liahona, Mee 2020, 69).

  3. Onyeisi Russell M. Nelson, “Akụ niile nke Ime mmụọ,” Oct. 2019 ọgbakọ zuru ọha (Ensign ma ọbụ Liahona, Nov. 2019, 78).

Bipụta