2021
Ọkwa nchụaja Bụ Ike nke Chineke
Ọgọst 2021


“Ọkwa nchụaja Bụ Ike nke Chineke,” Liahona, Ọgọst 2021

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Ọgọst 2021

Ọkwa nchụaja Bụ Ike nke Chineke

Chineke na-agọzi anyị site n’ike nke ọkwa nchụaja. Ngọzi niile nke ọkwa nchụaja dịịrị onye niile.

Ọkwa nchụaja bụ ike nke Chineke. Ọ na-eji ike a agọzi ụmụ Ya dum na iji nyere ha aka laghachi ibinyere Ya. Chineke enyewo ụmụ Ya ike ọkwa nchụaja n’elu ụwa. Site n’ike nke a, ndị ndu ọkwa nchụaja nwere ike duo Nzukọ nsọ a, ma ndị ji ọkwa nchụaja nwere ike mee emume nsọ niile dị nsọ, dịka baptizim, nke na-enyere anyị aka bịaruo Chineke nso. Onye ikom na onye inyom niile ndị na-anata emume nsọ ọkwa nchụaja niile na ntozu oke ma debe ọgbụgba ndụ niile (nkwa dị nsọ) nwere ohere n’ike nke Chineke.

Foto, oyiyi
oriri-nsọ

Enyere Josef Smith Ike Ọkwa nchụaja

Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’elu ụwa, O ji ike ọkwa nchụaja duo Nzukọ nsọ Ya. O nyekwara Ndị Ozi Ya ike nke a. Na senchuri niile mgbe ha nwụsịrị, ọtụtụ ndị otu dapụrụ site na Nzukọ nsọ. Ha gbanwere oziọma ahụ na otu Nzukọ nsọ si arụ ọrụ n’ụzọ n’ezighị ezi. Ọkwa nchụaja nke Chineke anọghịzikwa n’elu ụwa. N’ime 1829, Jizọs zigara Jọn O Mee Baptizim na Ndị ozi Pita, Jemis, na Jọn inye Josef Smith ọkwa nchụaja ahụ. Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a bụ otu nanị ya nọ n’elu ụwa ji ikike nke a si n’aka Chineke.

Foto, oyiyi
mweghachite nke Ọkwa nchụaja nke Melkizedek

Olu nke Pita, Jemis, na Jọn, site n’aka Linda Curley Christensen na Michael T. Malm

Ọtụghe niile nke Ọkwa nchụaja

Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja bụ ikike nke iji duzie otu esi etinye ọkwa nchụaja n’ọrụ, dị ka inye ikike ime emume nsọ. Jizọs Kraịst ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja. Onyeisi nke Nzukọ nsọ bụ naanị mmadụ dị n’elu ụwa onye nwere ike iji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja eduzi Nzukọ nsọ dum. N’okpuru nduzi ya, ndị ọzọ nwere ike jiri ụfọdụ ọtụghe iji rụọ ọrụ nke Chineke. Ndị ndu dịka ndị bishọp na ndịisi stek n’eji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja iji duo na ngalaba ukwu na stek ha. N’ihi ọkpụkpọ oku ije ozi na-abịa site n’aka ndị ndu ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, ndịikom na ndịinyom n’eje ozi ọkpụkpọ oku n’etinye n’ọrụ ikike nke ọkwa nchụaja dịka ha na-eme ọrụ ha.

Ọkwa nchụaja Melkizedek na Ọkwa nchụaja nke Erọn

Ọkwa nchụaja nwere akụkụ abụọ: Ọkwa nchụaja Melkizedek na Ọkwa nchụaja nke Erọn. Site na Ọkwa nchụaja Melkizedek, ndị ndu Nzukọ nsọ n’eduzi ọrụ ime mmụọ niile nke Nzukọ nsọ, ụdị dịka mgbasa oziọma na ọrụ tempụl. Ọkwa nchụaja nke Erọn na-arụ ọrụ n’okpuru ikike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek. A na-eji ya eme emume nsọ ụdị dịka baptizim na oriri nsọ.

Foto, oyiyi
baptizim

Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja

Site na ọgbụgba ndụ na emume nsọ niile, Chineke na-eme ngọzi ọkwa nchụaja adịịrị ụmụ Ya niile. Ngọzi ndị a gụnyere baptizim, onyinye nke Mmụọ Nsọ, oriri nsọ, na emume nsọ niile nke tempụl. Ndịikom na ndịinyom ndị nweteworo onyinye dị nsọ n’ime tempụl na-anata onyinye ike ọkwa nchụaja nke Chineke site na ọgbụgba ndụ ha niile. Anyị nwekwara ike nata ngọzi ọkwa nchụaja nke ọgwụgwọ, nkasị obi, na odudu.

Foto, oyiyi
ndị lụrụ ọhụrụ na tempụl

Gịnị Ka Akwụkwọ nsọ N’ekwu banyere Ọkwa nchụaja?

Ọkwa nchụaja nke nọrọ n’oge gboo bụkwa ụdị nke nọ ugbua (lee Moses 6:7).

Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na-enye aka ime ka anyị metazuo ọrụ nke Onyenwe anyị n’ụzọ ahaziri ahazi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:11).

Ndịikom ji ọkwa nchụaja nwere ike iji ya rụọ ọrụ “naanị n’elu ụkpụrụ niile nke ezi omumue” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:36).

Ụfọdụ ọrụ nke ndị ahụ ji ọkwa nchụaja ka a kọwara n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:38-67.

Bipụta