2021
Na-ewuli nke Kachasị mma na Gị
Septemba 2021


“Na-ewuli nke Kachasị mma na Gị” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Sept. 2021, 6-7.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Septemba 2021

Na-ewuli nkeKachasị mma na Gị

Uzọ ise iji wulite ndụ obi ụtọ na ọńụ.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 95:13-14

Foto, oyiyi
onyeinyom nta X-Ray, bluprint tempụl

Ngosiputa site n’aka Juliet Percival

Mgbe Onyenwe anyi nyere Joseph Smith iwu ka ọ wuo Tempụl Kirtland, Ọ hapụghị ya ka ọ chepụta otu ọ ga-esi eme ya naanị n’onwe ya. O kpughere atụmatụ nke ga-edu ya nke ọma.

“Ka e wuo ụlọ ahụ, n’abụghị otu ụwa si eme,” ka Onyenwe anyi kwupụtara. “Ka e wuo ya dịka otu M ga-egosi” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 95:13–14). Mgbe ahụ Onyenwe anyi nyere ntụziaka gbasara otu esi arụ tempụl ahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 95:15–17).

N’obi ekele, Onyenwe anyị egosiwo anyị karịa naanị otu anyị ga-esi wuo tempụl. O nyekwara anyị ntuziaka iji nyere anyị aka ịbụ ezigbo mmadụ anyị nwere ike ịbụ. Ka anyị na-eso ha, anyị ga-ewu ndụ anyị “n’abụghị otu ụwa si eme” kama site n’ụzọ Onyenwe anyị siri mepụta.

N’ebe a bụ ụzọ ise iji wulite ndụ obi ụtọ na ọńụ hiwere isi na Jizọs Kraịst.

Wuo Ntọala Siri ike

Onye ọ bụla na-ese ụkpụrụ ụlọ ma ọ bụ onye na-ewu ụlọ ga-agwa gị na ntọala siri ike dị mkpa maka ụlọ ọbụla. Helaman kuziri na ntọala kacha mma maka ndụ anyị bụ “oké nkume nke Onye Mgbapụta anyị, onye bụ Kraịst, Ọkpara Chineke” (Helaman 5:12). Anyị nwere ike mee Kraịst ntọala anyị site n’ịbịakwute Ya na ịsoro nkuzi Ya. Kedu ka ị chere na ị na-eme ime Kraịst ntọala nke ndụ gị?

Jeere Ndị ọzọ ozi

Foto, oyiyi
ụkwụ

Ụzọ ọzọ dị oke mma iji wulite ndụ anyị, dị ka Onyeisi Dieter F. Uchtdorf kwuru, mgbe ahụ Onye Ndụmọdụ nke Abụọ n’ime Otu Ndịisi Mbụ, na-abịa mgbe “anyị nọ n’ụkwụ anyị na-ejere Onyenwe anyị ozi ma na-ejere ndị gbara anyị gburugburu ozi.”1 Mgbe ị na-ejere ndị ọzọ ozi, ị na-eme ihe Jizọs mere ma na-amụta ịdịrịzi karịa dịka Ya. Ị gaghị agọzi naanị ndụ ndị mmadụ ị na-ejere ozi, kama a ga-agọzikwa gị.

Mepụta Usoro Ekpere na Omụmụ Akwụkwọ Mgbe niile

Foto, oyiyi
aka na-ekpe ekpere

Ụzọ ọzọ isi wulite ndụ obi ụtọ bụ iwulite mmekọrịta gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Ụzọ dị mma isi mee nke ahụ bụ site n’ekpere na ọmụmụ akwụkwọ nsọ.

Onyeisi Uchtdorf kwuru: “Iji mee ka mmekọrịta anyị na Chineke sikwuo ike, ọ dị anyị mkpa inwe oge bara uru naanị anyị na Ya. Ijiri nwayọ na-elekwasị anya n’ekpere nke onwe onye kwa ụbọchị na ọmụmụ akwụkwọ nsọ… ga-abụ ụfọdụ ntinye amamihe nke oge anyị na mbọ anyị ịbịaru Nna anyị nke Eluigwe nso.”2

Ekpere bụ ohere iji soro Nna anyị nke Eluigwe kwurịta okwu. Ọ maara anyị, hụ anyị n’anya, ma chọọ ịnụ n’ọnụ anyị! Mgbe anyị kpere ekpere n’eziokwu, nye ekele anyị, ma rịọ maka ihe ndị anyị chọrọ, Ọ na-ege ntị ma na-aza mgbe niile n’ụzọ na oge nke Ya.

Mgbe a bịara n’ịmụ akwụkwọ nsọ, e nweghị otu ụzọ kacha mma isi mee ya. Ihe dị mkpa bụ na ị na-eme ya! Onyeisi Russell M. Nelson akụziwo, “Imikpu n’ime okwu Chineke kwa ụbọchị dị mkpa maka nlanarị nke ime mmụọ.”3 Itinye oge kwa ụbọchị n’ime akwụkwọ nsọ ga, n’enweghị obi abụọ, nyere gị aka wulite ndụ nke okwukwe na ume.

Jiri Ndị Na-agba Gị Ume Ime Ihe Ọma Gbaa Onwe gị Gburugburu

Foto, oyiyi
nwata nwoke gbatịrị ogweaka

Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị jikọọ ma wulite mmekọrịta anyị na ndị ọzọ—kachasị ezi na ụlọ na ndị enyi. Ọ bụ ndị anyị na-ewepụta oge na-emetụtakarị anyị. Ma ha bụ ndị otu Nzukọ nsọ ma ọ bụ na ha abụghị, ị kwesịrị ịgba onwe gị gburugburu jiri ndị na-enyere gị aka ibi ndụ ozi ọma, debe ụkpụrụ nke Onyenwe anyi, ma bụrụzie ezigbo mmadụ karịa. I nwekwara ike nyere ndị nọ gị nso aka ime otu ihe ahụ. Kedu n’ime ndị enyi gị na-enyere gị aka iwulite ntọala gị n’eziomume?

Chọta Ọńụ N’iwu Ntọala Gị

E nwere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi wulite ndụ gị ka ọ dị ike n’ụzọ ime mmụọ ma nwee ọńụ, gụnyere ịga nzukọ nsọ ma rie oriri-nsọ, ime na idebe ọgbụgba ndụ, na ịsoro ndụmọdụ nke ndị amụma dị ndụ.

Ọ dị mkpa icheta na ihe ndị a niile chọrọ ọrụ na oge. E nwere mgbe niile mwulite na ọmụmụ a ga-eme, kama ị kwesighi ime ya naanị gị. Onyenwe anyi ga-enyere gị aka kwa ụbọchị ka ị na-agbalị ike gị niile iji wuo ndụ nke gị na Ya nwere ike ịnya isi na nke ga-ewetara gị ọńụ.

Hụba ama

  1. Dieter F. Uchtdorf, “Na-eche na Ụzọ gara Damaskọs,” Apr. 2011 ọgbakọ ozuru ọha (Ensign ma ọ bụ Liahona, Me 2011, 76).

  2. Dieter. F. Uchtdorf, “Maka Ihe ndị Kachasị Mkpa,” Oct. 2010 ọgbakọ ozuru ọha (Ensign ma ọ bụ Liahona, Nov. 2010, 21).

  3. Russell M. Nelson, “Nụrụ Ya,” Apr. 2020 ọgbakọ zuru ọha (Ensign ma ọ bụ Liahona, Me 2020, 89).

Bipụta