2021
Ọgbakọ Zuruọha: Nzukọ nke Nzukọ nsọ Zuru ụwa ọnụ
Septemba 2021


“Ọgbakọ Zuruọha: Nzukọ nke Nzukọ nsọ Zuru ụwa ọnụ,” Liahona, Septemba 2021

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Septemba 2021

Ọgbakọ Zuruọha: Nzukọ nke Nzukọ nsọ Zuru ụwa ọnụ

Anyị na-ege ndị amụma na ndị ndu ndị ọzọ nke Nzukọ nsọ ntị n’oge ọgbakọ zuruọha. Ha na-akụziri anyị ihe Chineke chọrọ ka anyị nụ.

Foto, oyiyi
Ebe mputa Ogige Ọgbakọ

Eprel na Ọktoba ọbụla, Nzukọ nsọ na-eme usoro nzukọ ndị a na-akpọ ọgbakọ zuruọha. Ndị ndu na-akụzi ma na-agba ama banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya. A na-eme ọgbakọ zuruoha na Salt Lake City, Utah, USA, ma a na-agbasa ya n’ikuku ihe karịrị asụsụ 80 gburugburu ụwa. A na-akpọku ndị otu niile na ndị ọzọ nwere mmasị ka ha gee ntị n’okwu ndị ahụ.

Foto, oyiyi
Na-ime ụlọ Ogige Ọgbakọ

Ọgbakọ ndị nke Mbụ nke Nzukọ nsọ

A haziri Nzukọ nsọ nke ọma n’oge nzukọ na Eprel 6, 1830 (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 20). Ọgbakọ zuruọha nke mbụ ka emere na Jun 9, 1830. Kemgbe ahụ, ọgbakọ zuruọha ka a na-eme n’okpuru ntụziaka nke Onyeisi nke Nzukọ nsọ ebe ọbụla ndị otu nwere ike ịgbakọ. N’ime afọ 1840 niile, ndịisi malitere ime ọgbakọ ugboro abụọ n’afọ.

Foto, oyiyi
Onyeisi Nelson nọ n’elu ikpo okwu

Otu Esi Ahazi Ọgbakọ Taa

Otu Ndịisi Mbụ, Kworum Ndị ozi Iri na Abụọ, na ndị ndu ndị ọzọ nke Nzukọ nsọ na-ekwu okwu n’oge ọgbakọ zuruọha. Otu Abụ Tabanakụl dị na Temple Square na otu abụ ọzọ nke Nzukọ nsọ na-enye egwu. Ọgbakọ ọbụla nwere nzukọ ise: atọ na Satọde na abụọ na Sọnde. Na April, nzukọ nke atọ na Satọde bụ maka ndị otu kworum nke Ọkwa nchụaja nke Erọn na Melkizedek. N’ọnwa Ọktoba, ọ bụ maka ndị otu nke Otu Enyemaka na Ndịinyom Nta.

Nkuzi niile nke Ndị ndu

N’ime ọnwa ole na ole tupu ọgbakọ, Ndị ndu Nzukọ nsọ na-ekpe ekpere banyere ihe a ga-akuzi. Onyenwe anyị na-akpali mmụọ ha ịmata ihe ha kwesịrị ikwu. Ha na akuzi eziokwu nke ozi ọma ma na-akpọku anyị idebe iwu nsọ niile nke Chineke. Ha na agbakwa ama Jizọs Kraịst ma gbaa anyị ume ka anyị soro Ya.

Mmụta site na Ọgbakọ

Tupu ọgbakọ zuruọha, anyị nwere ike ikpe ekpere ịnụrụ ihe Onyenwe anyị chọrọ ka anyị mụta. Dịka anyị na-ege okwu ndị ahụ, Mmụọ ahụ ga-akụziri anyị ihe anyị kwesịrị ịma. Ka emechara ọgbakọ, okwu ndị ahụ pụtara na ChurchofJesusChrist.org, na n’ime app Ọbá akwụkwọ Ozi ọma, na n’ime Liahona. Anyị nwere ike jiri ekpere mụọ okwu ndị ahụ ka anyị mụtakwuo banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya.

Site na Akwụkwọ nsọ

Jizọs Kraịst kụziri na anyị kwesịrị ị na-ezukọ mgbe na mgbe (lee 3 Nifaị 18:22).

Mgbe ndị otu Nzukọ nsọ na-efekọ ofufe ọnụ, Onyenwe anyi ga-anọnyere ha (lee Matiu 18:20).

Onyenwe anyi nyere ndị otu Nzukọ nsọ iwu ka ha “na-akụzi ma na-emezi onye ọbụla n’ibe ya” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 43:8).

Ka ndị otu Nzukọ nsọ na-egosi okwukwe n’ime Kraịst, Mmụọ Ya ga-anọnyere ha mgbe ha na-ezukọ (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 44:2).

Bipụta