2022
A Na-edu site n’aka Ndị Amụma Dị Ndụ
Septemba 2022


“A Na-edu site n’aka Ndị Amụma Dị Ndụ,” Liahona, Sept. 2022.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Septemba 2022

A Na-edu site n’aka Ndị Amụma Dị Ndụ

Ndị ndu Nzukọ nsọ nọ n’ihu akpụrụakpụ Krịstus

Ndị Amụma bụ ụmụnwoke ndị akpọrọ site n’aka Nna nke Eluigwe ikwutere Ya. Ha na-agba ama nke Jizọs Kraịst ma na-akụzi ozi ọma Ya. Ndị otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu a kwere ma na ndị amụma mgbe gboo ma oge ugbua.

Chineke na-ekwu okwu site na Ndị amụma.

Ndị Amụma na-anata mkpughe site n’aka Chineke. Mgbe mmụọ metụrụ ndị amụma ịkụziri anyị ihe, ọ bụ otu ihe ahụ dị ka na Chineke naara ekwuru anyị okwu (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:38). Anyị nwere ike ịtụkwasị obi na ha na-agwa anyị ihe Chineke ga-achọ ka anyị mata.

Mọmọn ji epekele ọlaedo niile

Mọmọn Na-egbu Epekele ndị ahụ Nkenke, site n’akaTom Lovell

Ndị Amụma Na-akuzi ihe banyere Jizọs Kraist

Ndị Amụma niile na-agba ama banyere Jizọs Kraist. Ha na-akuziri anyị na Ọ bụ Ọkpara nke Chineke. Ha na-akuziri anyị banyere ndụ Ya, ọmụmaatụ, na Aja mgbaghara mmehie Ya. Ma ha na-egosi anyị otu esi eso Ya ma rube isi nye iwu nsọ Ya niile.

Ọrụ niile nke Ndị amụma

Ndị Amụma na-akuzi ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ha na-akọwa ngọzi niile anyị na-anata mgbe anyị rubere isi nye iwu nsọ niile na nsonazụ ndị anyị na-anata ma ọ bụrụ na anyị emeghị. Mgbe ụfọdụ, mmụọ nwere kpalie ha ịgwa anyị banyere ihe omume dị n’ihu.

Mosis ji mbadamba nkume niile

Mosis na Mbadamba nkume niile, site n’aka Jerry Harston

Ndị Amụma Mgbe Gboo

Chineke akuziworo ndị mmadụ site n’aka ndị amụma kemgbe mmalite. Ndị Amụma biri n’oge Agba Ochie gụnyere Adam, Noa, Ebraham, Mosis, Aịzaya, na ndị ọzọ. E nwekwara ndị amụma n’etiti ndị nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Ndị amụma ndịa gụnyere Lehi, Mozaya, Alma, na Moronaị. Anyị nwere ike mụọ ihe ha kuziri site n’ịgụ akwụkwọ nsọ.

Ndị Amụma Oge Ugbua

Josef Smith bụ onye amụma mbụ n’oge ugba. O weghachitere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraist n’ụwa. Russell M. Nelson bụ onye amụma na Onyeisi nke Nzukọ nsọ taa. Ndị ndụmọdụ ya niime Otù Ndịisi Mbụ na Ndị Ozi Iri na Abụọ bụkwa ndị amụma, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe.

di na nwunye na-ele ọgbakọ n’ekwe ntị

Na-ege Onye Amụma ntị

Onye Amụma na-agwa anyị okwu n’oge ọgbakọ zuru ọha ma n’oge ndị ọzọ. Ọ na-akuziri anyị ihe Chineke chọrọ ka anyị mata ma otu esi eso Jizọs Kraist taa. Anyị nwere ike chọta nkuzi ya niile niime Liahona ma na ChurchofJesusChrist.org.

Ngozi niile nke Isoro Onye Amụma

A ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ ma anyị soro nkuzi niile nke onye amụma. Mgbe anyị sooro onye amụma, anyị nwere ike mata na anyị na-eme ihe Chineke ga-achọ ka anyị mee. Anyị nwere ike nwee mmetụta udo niime ndụ anyị ma bịarute Jizọs Kraist nso.