“Aịzaya Na-akuzi ihe banyere Jizọs Kraist,” Ozi niile nke Friend Kwa Ọnwa, Septemba 2022
“Aịzaya Na-akuzi ihe banyere Jizọs Kraist”
Ozi nke Friend Kwa ọnwa, Septemba 2022
Aịzaya Na-akuzi ihe banyere Jizọs Kraist
Aịzaya bụ onye amụma. O biri ndụ tupu a mụọ Jizọs Kraist. Mana ọ maara na Jizọs ga-abịa.
Aịzaya kwuru na a ga-amụ Jizọs dị ka Ọkpara nke Chineke. Jizọs ga-enye aka ma gwọọ ndị ọzọ.
Aịzaya kwukwara na Jizọs ga-abịa n’ụwa. A ga-akpọ Ya Onyeisi nke Udo. Ọ ga-enye ndụ Ya maka anyị n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.
Ihe niile Aịzaya kuziri mere eme. Ọtụtụ afọ gasịrị, Jizọs bịara n’ụwa. O gosiri anyị ụzọ ahụ. Ọ nwụrụ ma bie ndụ ọzọ. Ọ dị ndụ taa!
E nwere m ike ịmụta banyere Jizọs Kraist. Mgbe m chetara ihe O meworo maka m, e nwere m ike inwe mmetụta udo na olileanya!
© 2022 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa ọnwa, Septemba 2022. Asụsụ. 18299 593