Ozi Liahona Kwa ọnwa, Nọvemba 2022
Ihe nketa nke Agbamume
Mpempe edemede niile
Dị ka nne m gwara m mgbe m nyere mkpesa maka otu ihe siri sie ike, “Oo, Hal, eziokwu o siri ike. O kwesịrị ịdị. Ndụ bụ ihe mnwale.”
O nwere ike jiri nwayọ kwuo nke ahụ, ọbụna niihu ọchị, niihi na ọ maara ụzọ ihe abụọ. Na-agbanyeghị nsogbu ahụ, ihe kachasị mkpa ga-abụ ịlọrute n’ebe obibi ịnọ ya na Nna ya nke Eluigwe. Ma ọ maara na o nwere ike ime ya site n’okwukwe niime Onye Nzọpụta ya. …
Ihe nketa nke Agbamume nke ọ hapụụrụ anyị ka akachasị kọwaa na Moronaị 7, ebe Mọmọn gbara nwa ya nwoke Moronaị na ndị ya ume. …
O dowere Jizọs Kraịst niihu, dị ka ndị niile nwetere uru na-ịgba ndị na-agba mbọ agbago elu n’okporo ụzọ gawara ebe obibi nke eluigwe ha ume. …
Mọmọn hụtara ịdị nwayọ n’obi dị ka ihe aka ebe nke ike dị n’okwukwe ha. …
Mọmọn oge ahụ gbara ha ume site na-ịgba ama na ha nọ n’ụzọ ịnata onyinye nke obi ha ijuputara n’ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ. …
Na-ichela azụ, ugbua ana m ahụ otu onyinye afọ ọma ahụ—ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ—siri kwagide, duzie, kwado, ma gbanwee nne m na mbọ ya ịla n’ebe obibi. …
… Onye Nzọpụta maara maka nsogbu gị niile n’uju Ọ maara maka nnukwu ike dị niime gị iji too na okwukwe, olileanya na afọ ọma.
Iwu nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile ọ na-enye gị abụghị ihe mnwale iji jikwata gị. Ha bụ onyinye iji bulie gị chuwa ihu na-ịnata onyinye niile nke Chineke na ịlọta n’ebe obibi gakwuru Nna gị nke Eluigwe na Onyenwe anyị, ndị hụrụ gị naanya.