2023
Ụzọ 4 Jizọs Kraịst si Agba Gị Ume
Jenụwarị 2023


“Ụzọ 4 Jizọs Kraịst si Agba Gị ume,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Jan. 2023.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Janụwarị 2023

Ụzọ 4 Jizọs Kraịst si Agba Gị Ume

A pụrụ m ime ihe niile site na Kraịst.
Ndị Filipaị 4:13

Foto, oyiyi
cairn

Gburugburu ụwa, Ndị Kraịst na-aṅụrị ọṅụ nime akwụkwọ nsọ nke a: “A pụrụ m ime ihe niile site na Kraịst nke na-agba m ume” (Ndị Filipi 4:13).

Mgbe ndị mmadụ na-anụ nke a, ụfọdụ n’ime ha nwere ike chee na ọ pụtara na ha nwere ike imeri mnwale ọbụla, merie egwuregwu ọbụla, ma nwee ihe niile ha chọrọ bịa na mmezu. Mana ọbụghị ihe akwụkwọ nsọ nke a na-akuzi.

Onye ozi Pọl dere ya mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. Dị ka onye mkpọrọ, enwere ọtụtụ ihe nke Pọl enweghị ike ime, mana ọ maara na Jizọs Kraịst nwere ike ịgba ya ume ime ihe ndị kachasị mkpa.

Nke a bụkwa eziokwu maka gị!

1 Kraịst Na-agba Gị Ume Ịmata

Jizọs Kraịst enyewo gị ọtụtụ ụzọ dị mkpa i nwere ike isi mata ihe nke bụ eziokwu. Ọ kuziworo anyị niile ikpe ekpere mgbe niile (lee 3 Nifaị 18:18) ma rịọ ịmata ihe nke bụ eziokwu (lee Moronaị 10:4-5). I nwekwara ike chọta ma mata ihe nke bụ eziokwu site na ọmụmụ ihe gị nke akwụkwọ nsọ.

Ekpere na ọmụmụ akwụkwọ nsọ na-ewete Mmụọ ahụ nime ndụ gị. Mmụọ ahụ nwere ike gwa “uche gị okwu ma … obi gị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 8:2), “mejupụta mkpụrụ obi gị n’ọńụ,” ma mee ka uche gị ghọta” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:13).

Site n’ụzọ ndịa, ị pụrụ “ịnụrụ Ya”—nụrụ okwu niile nke Onye Nzọpụta ma soro ihe O kwuworo. Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo na nke a bụ “usoro nke ime nkeọma, ańụrị, na ọńụ nime ndụ nke a.”1

2 Kraịst Na-agba Gị Ume Ịme

Mgbam ume na-abịara gị dị ka ị na-agbalị idebe iwu nsọ niile ma mee ezi nhọrọ ndị na-eduba n’udo na ọńụ. Jizọs Kraịst na-agba gị ume ime nke a ọbụna mgbe nhọrọ ndị ahụ siri ike ime. Mgbe ụfọdụ i nwere ike mee nhọrọ ọjọọ. N’ekele, Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta na-eme nchegharị ịdị ire. N’ihi Jizọs Kraịst, ị pụrụ ịdị ọcha ma chọta ọńụ. Ọ pụrụ ịgba gị ume “ime karịa ma dịrị karịa”2 ụbọchi ọbụla.

3 Kraịst Na-agba Gị Ume Imeri

Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, Pọl dere: “A mụtawo m, n’ọnọdụ ọbụla m nọ, n’ebe ahụ inwe afọ ojuju.

“Ama m ma otu esi adabere, ma ama m otu esi ejupụta: ebe ọbụla ma nihe niile enyere m n’iwu” (Ndị Filipi 4:11-12).

Ya bụ, Pọl mụtara na, site na Kraịst, ọ pụrụ imeri ma mụta site na mnwale na aka mgba ya niile. Jizọs Kraịst pụrụ ịgba gị ume ime otu ụdị ahụ.

Onye Nzọpụta tara ahụhụ “mgbu niile na mkpagbu niile na ọnwụnwa niile nke ụdị ọbụla.” O wekwasịrị n’Onwe Ya adịghị ike anyị niile ka “o wee nwee ike mara … otu esi enyere [nke pụtara inye aka] ndị nke ya dị ka otu adịghị ike ha niile siri dị” (Alma 7:11-12). Na-agbanyeghị ihe ịgabigara, Jizọs Kraịst pụrụ ịgba gị ume ịnagide ma mezuo ihe niile ị na-enweghị ike ime n’onwe gị.

4 Kraịst Na-agba Gị Ume Ịbụ

Jizọs Kraịst emewo mbilite n’ọnwụ eziokwu nye anyị niile, ma Ọ na-eme ndụ ebighị ebi adị ire nye ndị ahụ na-echegharị, nata emume nsọ niile dị mkpa, ma mee ma debe ọgbụgba ndụ niile so ha. Ma enweghị Kraịst, anyị enweghị ike imezu ihe Nna nke Eluigwe chọrọ karịsịa—maka anyị ịdị karịa ka Ya na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, na ibinyere Ha ruo ebighị ebi.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst

I nwere ike dịrị karịa ka Jizọs Kraịst dị ka ị na-amụ maka Ya, dabere na ma tụkwasị obi na Ya, ma soro ọmụmaatụ Ya. Nke a ga-eduba gị ibi n’okwukwe, olileanya, afọma, ndidi, ịdị umeala n’obi, ịdị ọcha, na nrube isi karịa. Ndịa niile bụ àgwà nke Onye Nzọpụta.

Dị ka ị na-agbalị isoro Jizọs Kraịst, Ọ ga-abụ olileanya gị na ihe gị nke ga-edu gị ịbụ ihe niile Ọ maara na gị pụrụ ịbụ. Ma, isoro Pọl, i nwere ike ikwu, “A pụrụ m ime ihe niile site na Kraịst onye na-agba m ume.”

Hụba ama

  1. Russell M. Nelson, “Nụrụ Ya,” Apr. 2020 ọgbakọ zuru ọha (Ensign ma ọ bụ Liahona, Me 2020, 89).

  2. Lee Russell M. Nelson, “Anyị Pụrụ Ime Karịa ma Dịrị Karịa,” Epr. 2019 ọgbakọ zuru ọha (Ensign ma ọ bụ Liahona, Me 2019, 67).

Bipụta