2023
Ezi na ụlọ niile Dị Ebighị ebi
Jenụwarị 2023


“Ezi na ụlọ niile Dị Ebighị ebi,” Liahona, Jen. 2023.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Jenụwarị 2023

Ezi na ụlọ niile Dị Ebighị ebi

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ na-eme ihu ọchị

Ezi na ụlọ bụ isi akụkụ nke obodo na Nzukọ nsọ. Ndị otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu a kwere na ezi na ụlọ niile pụrụ ịdị ebighị ebi. Anyị na-arụ ọrụ ịgba ezi na ụlọ anyị ume n’elu ụwa. Anyị nwekwara okwukwe na anyị nwere ike ịnata ngọzi nke ezi na ụlọ ebighị ebi.

Ezi na ụlọ nke Chineke

Ndị mmadụ niile bụ ụmụ nwoke mmụọ na ụmụada mmụọ nke nne na nna nke eluigwe. Anyị niile bụ akụkụ ezi na ụlọ nke Chineke. Anyị niile nwere eke si na chi na akaraka. Ọbụrụ ma anyị bie ndụ ezi omume, anyị nwere ike laghachi ibinyere Nna nke Eluigwe dị ka akụkụ nke ezi na ụlọ Ya ruo ebighị ebi.

Foto, oyiyi
di na nwunye lụrụ ọhụrụ nọ na ezi tempụl

Foto Agbamakwụkwọ site n’aka Josef Kaluba

Ezi na ụlọ Mgbe Ebighị ebi

Mgbe otu nwoke na otu nwanyị lụrụ nime tempụl ma debe ọgbụgba ndụ ha, ọlụlụ ha ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi. Emume nsọ tempụl nke a ka akpọrọ nrachi. Ụmụntakịrị a mụrụ mgbe ndị nne na nna ha mesịrị nrachi ka a mụrụ n’ime ọgbụgba ndụ ahụ. Ụmụntakịrị a mụrụ tupu ndị nne na nna ha e mee nrachi ka e nwere ike ịrachi nye ha n’ime tempụl ka ha nwee ike bụrụ ezi na ụlọ ruo ebighị ebi. Ndị otu Nzukọ nsọ na-eme agụgụala ezi na ụlọ na ọrụ tempụl ka ha nwee ike rachikọta ezi na ụlọ ha niile ọnụ site na ndudugandu niile. Ngọzi nke ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi kwere omume nihi Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya.

Alụm di na nwunye

Alụm di na nwunye n’etiti otu nwoke na otu nwanyị ka akwadoro n’aka Chineke. Ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-akuziri di na nwunye iguzosi ike otu onye na ibe ya ma kwesị ntụkwasị obi nime ọgbụgba ndụ niile alụm di na nwunye ha. Ha kwesịrị ịdị eziokwu n’echiche, okwu ọnụ, na omume Alụm di na nwunye bụ nrukooru hara otu, ma di ma ọ bụ nwunye kwesịrị inye mgbam ume, kasịe obi, ma nyere onye ọbụla aka.

Foto, oyiyi
ndị nne na nna kpọ obere nwa

Ndị nne na nna na Ụmụntakịrị

Chineke nyere Adam na Iv iwu ịmụ ụmụ. Ndị ndu Nzukọ nsọ akuziwo na iwu nsọ nke a ka dị ike. Ndị nne na ndị nna na-arụkọ ọrụ izulite ụmụ ha n’ịhụnaanya ma n’ezi omume (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25-28). Ụmụntakịrị ka a na-akuziri inye nkwanye ugwu ma rubere ndị nne na nna ha isi (lee Ọpụpụ 20:12).

Nkuzi na Ọmụmụ ihe

Ndị nne na nna na-akuziri ụmụ ha ịhụ Chineke naanya ma rube isi n’iwu nsọ Ya niile. Ndụ ezi na ụlọ na-enye anyị ohere inwete mmetụta ọńụ ma mụta ndidi na achọghị ọdịmma onwe onye naanị. Àgwà ndị a na-enyere anyị aka dịrị karịa ka Chineke ma kwadoo anyị ibi ndụ n’ọńụ dị ka ndị ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi.

Ịgba Ezi na ụlọ niile Ume

Ọ na-ewe ọrụ, nraranye, na ndidi iji wulite ezi na ụlọ mere nke ọma. Ụkpụrụ niile nke ozi ọma dị ka okwukwe, ekpere, mgbaghara, ịhụnaanya, ọrụ, na ańụrị dị mma pụrụ inyere anyị aka chọta ọńụ nime ndụ ezi na ụlọ. Anyị nwekwara ike nata mkpughe nke onwe ịmata otu esi agba ezi na ụlọ anyị niile ume.

Foto, oyiyi
eserese nke Jizọs Kraịst

Eserese nke Kraịst, site n’aka Heinrich Hofmann

Ngọzi niile Dị adị nye Ndị niile

Ọbụghị onye ọbụla nwere ohere ịbụ akụkụ ezi na ụlọ n’enweghị atụ n’elu ụwa. Mana Chineke ekwewo nkwa na onye ọbụla na-edebe iwu nsọ Ya niile ga-anata ngọzi niile nke ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi. Anyị nwere ike tụkwasị obi na Ya ma nwee okwukwe n’oge Ya.

Bipụta