2023
Mmụọ Nsọ Ahụ Nwere ike Inyere Anyị aka
Jun 2023


“Mmụọ Nsọ Ahụ Nwere ike Inyere Anyị aka,” Liahona, Jun 2023.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Jun 2023

Mmụọ Nsọ Ahụ Nwere ike Inyere Anyị aka

Foto, oyiyi
nwoke nọ ọdụ na-ele anwụ na-awa awa

Mmụọ Nsọ bụ ọnye nke atọ niime Ndị bụ Chukwu. Akwụkwọ nsọ nakwa arụ Ya aka dị ka Mmụọ, Mmụọ nsọ, ma ọ bụ Onye Nkasi obi. Dị ka anyị na-amụ ịńa ntị n’olu Ya, Ọ ga-agbara anyị ama banyere Jizọs Kraịst ma nyere anyị aka mụta eziokwu niile banyere ozi ọma.

Onye otu Ndị bụ Chukwu

Nna nke Eluigwe, Jizọs Kraịst, na Mmụọ Nsọ bụ Ndị bụ Chukwu. Ha hụrụ anyị naanya ma na-arụkọ ọrụ n’otu obi iji weta na mmezu atụmatụ nke nzopụta. Na-agbanyeghị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nwere ahụ nke anụ ahụ na ọkpụkpụ, Mmụọ Nsọ enweghị. Ọ bụ mmụọ.

Foto, oyiyi
oyiyi bụ kpoo nke Nna na Ọkpara ahụ

Akaebe nke Nna na Ọkpara ahụ.

Mmụọ Nsọ na-agba akaebe banyere Nna na Ọkpara ahụ” (2 Nefi 31:18). Nke a pụtara na anyị nwere ike ịnata ama banyere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst site n’aka Mmụọ Nsọ.

Na-agba ama banyere Eziokwu

Mmụọ Nsọ na-agba ama banyere eziokwu niile. Ọ ga-enyere anyị aka mata na ọzi ọma ahụ—tinyere atụmatụ nke nzọpụta, iwu nsọ niile nke Chineke, Mweghachite ahụ, na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst—bụcha eziokwu. Ọ ga-agba ama anyị ume dị ka anyị na-aganiihu na-ekpe ekpere, edobe iwu nsọ niile, ma na-amụ ozi ọma.

Foto, oyiyi
aka jidere otu kọmpas

Na-edu ma Na-echekwa Anyị

Mmụọ Nsọ nwere ike duo anyị na mkpebi anyị ma chekwaa anyị site n’egwu nke anụ ahụ na nke ime mmụọ. Ọ ga-enyere anyị aka chọta azịza niile nye ajụjụ anyị niile ma ọ bụrụ ma anyị kpee ekpere ma gbaa mbọ ime ihe ziri ezi. Ọ ga-edu anyị mgbe niile “ime ihe ọma” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:12).

Na-akasi Anyị obi

Mmụọ Nsọ mgbe ụfọdụ ka a na-akpọkwa “Onye Nkasi obi” (Jọn 14:26). O nwere ike mee anyị “ejuputa n’olileanya na ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ“ (Moronaị 8:26) mgbe anyị nwere nchekasị, na-ewe iwe, ma ọ bụ na-atụ egwu. Dị ka Ọ na-enyere anyị aka enweta mmetụta ịhụnaanya nke Chineke, anyị nwere ike merie mmụọ ịda mba ma nwee mgbam ume niime mnwale anyị niile.

Onyinye nke Mmụọ Nsọ.

Mgbe emechara anyị baptizim, anyị na-anata onyinye nke Mmụọ Nsọ niime otu emume nsọ a kpọrọ emume nnabata. Ozugbo anyị natara onyinye nke a, anyị nwere ike inweta Mmụọ Nsọ ịnọnyere anyị mgbe niile ọbụrụraa na anyị na-ebi ndụ ezi omume.

Foto, oyiyi
onyeinyom na-agụ akwụkwọ nsọ

Ngosipụta sitere n’aka J. Kirk Richards

Otu Anyị si Na-anụ Mmụọ Nsọ.

Mmụọ Nsọ na-agwa ndị mmadụ okwu n’ụzọ dị iche iche. Ndị a nwere ike gụnye n’ụzọ udo, mmetụta na-enye nkasi obi ma ọ bụ nkuzi ndị gbasara ihe a ga-ekwu ma ọ bụ ihe a ga-eme. Dị ka anyị na-ekpe ekpere maka ntuziaka ma ńaa ntị maka nkwagide Ya, anyị nwere ike mụta otu O si agwa anyị okwu.

Bipụta