2023
Ikesa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst
Julaị 2023


“Ikesa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst,” Liahona, Julaị 2023.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Julaị 2023

Ikesa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

Foto, oyiyi
nwainyom nta ji akwụkwọ nsọ niile emepere emepe nọ n’elu apata ụkwụ

Mgbe anyị chere echiche banyere ngọzi niile nke anyị na a nata niihi n’anyị bụ ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, anyị na-enwe mmasị ikesa ozi ọma ahụ nye ndị ahụ anyị hụrụ naanya. Anyị ga-enwe ike ikesa ịgba ama ahụ niile anyị nwere maka eziokwu site n’okwu ọnụ ma ọmụmatụ anyị niile. Anyị ga-enwe ike ikpe ekpere maka mkpate mmụọ k’anyị nwee ike mata onye ahụ anyị ga-emere nkesa ahụ ma ihe a ga-ekwu.

Foto, oyiyi
Jizọs na-esetịpụ aka nye otu nwoke ụkwụ arụ.

Hụ Ndị ọzọ naanya

Otu akụkụ dị mkpa nke ikesa ozi ọma bụ ịhụ ndị ọzọ n’anya. Mgbe anyị gosiri ndị ọzọ ịhụnaanya anyị site na agwa niile yiri nke Kraịst, anyị na-ekesa ozi ọma nke Jizọs Kraịst—mgbe ụfọdụ na-ekwughịdị otu okwu ọbụla. Ma mgbe ndị ọzọ matara n’anyị jiri ezi obi nwee nlekọta maka ha, ọ ga-adịrị ha mfe ịmepe obi ha karịa maka ịnụrụ echiche anyị niile banyere ozi ọma ahụ. (Lee Gary E. Stevenson, “Hụ naanya, Kesaa, Kpọọ oku,” Liahona, Me 2022, 84– 87.)

Kesaa n’ụzọ dị Nkịtị ma n’ụzọ niile eji Emekarị ihe

Anyị nwere ike ikesa ihe banyere ozi ọma ahụ nke anyị hụrụ naanya. Mgbe anyị na-eme nke a dị ka otu akụkụ nke ndụ anyị nke kwa ụbọchị, ọ gaghị a rara anyị ahụ. N’ịmatụ, anyị nwere ike kwuoro ndị ezinaụlọ anyị na ndị enyi anyị okwu banyere ihe anyị n’eme n’ụbọchị Sọnde. Ma ọ bụ anyị nwere ike gwa ha banyere obi ụtọ anyị n’enwe mgbe anyị na-ejere ndị ọzọ ozi. (Lee Dieter F. Uchtdorf, “Ọrụ Mgbasa ozi ọma: Ịkesa Ihe nọ Gị N’obi,” Laịhona,Mee 2019, 15–18.)

Kpọkuo Ndi Ọzọ Isonye Anyị

Anyị nwere ike kpọkuo ndị ọzọ ịmụta banyere ozi ọma karịa. N’ịmatụ, anyị nwere ike ikpọku ha ịbịa otu ọgbakọ ma ọ bụ otu emume nke Nzukọ nsọ, gụọ Akwụkwọ nke Mọmọn, lee otu vidiyo nke Nzukọ nsọ, ma ọ bụ jee zute ndị mgbasa ozi ọma. Nhụmiihe ndịa niile nwere ike nyere ha aka nwete mmetụta nke Mmụọ ma nwee mmasị ịmụtakwu ihe ndị ọzọ.

Foto, oyiyi
ndị ụmụnwanyị agadi abụọ nọdụrụ ọdụ ma na-ekwu okwu

Jụọ ha banyere Nhụmiihe Ha

Mgbe ndị enyi na ndị otu ezi na ụlọ bịaworo nzukọ nsọ ma ọ bụ nata otu nkuzi n’aka ndị mgbasa ozi ọma, anyị nwere ike ịjụ ha banyere Nhụmiihe ha. Ụfọdụ nkuzi nke ozi ọma nwere ike ị bụụrụ ha ihe ọhụrụ, niihi nke a anyị nwere ike ịzaa ajụjụ niile ha nwere. Anyị nwere ike igosi ịhụnaanya na nkwado anyị maka mgbalị ha niile ịbịakwute Kraịst.

Gbakwunye ihe niime Nkwenye Ha niile

Anyị jiri nkwenye niile ndị ọzọ kpọrọ ịhe ma na-akwanyere ha ugwu, ma anyị na-agba mbọ ịgbakwunye ihe n’elu okwukwe nke ha dịbụ mbụ nwee. N’ịmatụ, otu enyi onye chọtaworo nkasị obi nime akwụkwọ nsọ nke Baịbụl nwekwara ike chọta nkasị obi nime nkuzi niile nke anyị na-ekesa site niime Akwụkwọ nke Mọmọn.

Foto, oyiyi
ndịinyom nta na-enyere otu agadi nwanyị aka na-agafe otu okporo ụzọ

Nyere Ndị otu Nzukọ nsọ dị Ọhụrụ aka

Mgbe ndị mmadụ batara nime Nzukọ nsọ, anyị nwere ike nye aka gbasie okwukwe ha ike. Anyị nwere ike ị bụ ndị enyi ha, zaa ajụjụ ha niile, ma kwado ha mgbe ha natara ọkpụkpọ oku. Anyị nwere ike ịgba ha ume ị ga niihu isoro Jizọs Kraịst ma na-amụta banyere ozi ọma Ya.

Foto, oyiyi
ndị mgbasa ozi ọma okenye abụọ na otu nwoke na-elekọ otu ekwenti ọnụ

Ije ozi nke Mgbasa oziọma nke Uju-Oge

N’ịgbakwunye n’elu ikesa ozi ọma ahụ nime ndụ anyị kwa ụbọchị, ndị otu Nzukọ nsọ ka enwere ike ịkpọ ije ozi dịka ndị mgbasa ozi ọma nke uju-oge. Ọ bụrụ na ha kwadoro akwado, ndịikom nta nwere ike ije ozi ọsịsọ ha gbara afọ 18. Ndịinyom nta ma ndị toro eto mere okenye nwekwara ike ije ozi. I nwekwara ike ichọta ozi ndị ọzọ n’ebe a ChurchofJesusChrist.org/callings/missionary.

Bipụta