2023
Ụbọchị Asaa nke Nkesa
Julaị 2023


“Ụbọchị Asaa nke Nkesa,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Julaị 2023.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Julaị 2023

ỤbọchịAsaa nke Nkesa

Ịnwere ike kesaa ozi ọma ahụ n’ụzọ niile dị nkịtị ma n’ụzọ niile dị mfe. Ị dị ike ịnara aka mgba ahụ?

Mgbe anyị na-ekwu banyere ịkesaa ịgba ama anyị, anyị na-echekarị mgbe anyị na-ekwupụta ịgba ama anyị na nzukọ oriri nsọ ma ọ bụ n’ụfọdụ ọnọdụ ndị ọzọ ahaziri ahazi. Mana agbawo anyị ume ị “chọọ ohere niile anyị ji akpọlite okwukwe anyị n’ụzọ niile dị nkịtị ma n’ụzọ niile dị mfe.”1

N’ime aka mgba ụbọchị asaa ahụ nọ n’okpuru, ị nwere ike ịkesa ịgba ama gị n’ụzọ dị iche ụbọchị ọbụla ruo n’otu izu ụka. Ị nwere ike ịmee ihe ndịa site n’usoro ọbụla, ma ọ bụ ịnwere ike ịchepụta echiche niile nke onwe gị! Ị dị ike ịnara aka mgba ahụ?

Foto, oyiyi
ụlọ nzukọ

Ngosipụta niile sitere n’aka Emily Davis

Ụbọchị 1: Nzukọ nsọ

Tulee ikwupụta ịgba ama gị nime nzukọ ibu ọnụ na ọgbụgba ama nime nzukọ nsọ ma ọ bụrụ na nke a bụ ịhe dịịrị gị mfe ịmee. Ma ọ bụghị ya, ịnwekwara ike ịkesa ịgba ama gị nime nzukọ nsọ site n’isonye nime klasị niile nke ụbọchị Sọnde ma n’ebe semịnarị. Ọkwu niile ịkesara n’ebe ahụ nwere ike ibuli ndị ọzọ elu ma gbaa ịgba ama ha niile ume tinyekwara nke gị.

Foto, oyiyi
ndị enyị

Ụbọchị 2: Ndị enyi

Gịnị ka ịmụtara nime nzukọ nsọ n’ụbọchị Sọnde? Ị nwere mmasị maka ihe otu onye kesara nime okwuchukwu nke nzukọ oriri nsọ ma ọ bụ nime mkparịta ụka nime klasị gị? Enwere ike abụ mmalite bụ otu nime abụ ịkachasị nwe mmasị. Gwa otu enyi banyere ya! Mgbe ahụ jụọ ha banere ngwụcha izuụka ha kwa.

Foto, oyiyi
ekwentị ya na soshịal midia

Ụbọchị 3: Soshial Midia

Soshial midia bụ nnukwu ebe eji ekesa ihe niile ndị ime mmụọ n’ụzọ dị nkịtị ma n’ụzọ dị mfe. Maka aka mgba nke ụbọchị nke a, tulee ịkesa otu nzipụ ozi banyere:

  • Otu niime amaokwu niile akwụkwọ nsọ nke ị kachasị nwe mmasị.

  • Otu okwu nke na-ebuli elu site n ọgbakọ zuru ọha.

  • Otu echiche ma ọ bụ Nhụmiihe nke ime mmụọ.

  • Otu ihe nke ịhụrụ naanya ma ọ bụ nwee obi ekele banyere Onye Nzọpụta.

  • Otu ụzọ O jiri nyere gị aka na nso nso a ma ọ bụ otu agwa Ya nke na-amasị gị na ihe kpatara ya.

Foto, oyiyi
ekwentị ya na vidio na ederede

Ụbọchị 4: Ederede ma ọ bụ Vidio

Zipuru otu enyi otu ozi na-ebuli elu site na ederede ma ọ bụ vidio. Ị nwere ike ikesa otu okwuchukwu nke ọgbakọ ị chere ga-amasị ha, gwa ha otu ihe banyere ha nke na-amasị gị, ma ọ bụ kesaa banyere okwukwe gị na Jizọs Kraịst. N’ịmatụ, ọ nwere ike dịịrị ha mkpa ị mata banyere ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe nwere maka ha. I nwekwara ike mgbe niile ị gwa ha na mmadụ!

Foto, oyiyi
nwainyom nta ji bolon bolon akpụrụ ka obi

Ụbọchị 5: Ije ozi

Ị nwere ike ịche otu ijere ndị ọzọ ozi nwere ike iji bụrụ ụzọ esi ekesa ịgba ama gị. Onye ozi Pọl gwara Timoti, “ Bụrụ ihe ịma atu nke ndị kwere ekwe , n’okwu ọnụ, na mkparịta ụka, n’afọ ọma, na mmụọ, n’okwukwe, na-enweghị ntụpọ.”(1 Timoti 4:12). Niihi nke a, ị nwere ike igosi nkwenye gị niile site na ọmụmaatụ gị, site na-ijere ndị ọzọ ozi dị ka Onye Nzọpụta naara iji jeere ha ozi.

Foto, oyiyi
ihe niile eji eme nka

Ụbọchị 6: Nka

Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-eji nka dị ka ụzọ dị iche eji ekesa echiche niile na mmetụta ha niile. Ị nwere ike iji eserese, ihe ọkpụkpụ, mbem, egwu, ma ọ bụ ụdị nka ndị ọzọ iji kesaa mmetụta ị nwere banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya.

Foto, oyiyi
otu ntoroọbịa na-ekwu okwu

Ụbọchị 7: Mkparịta ụka Nkịtị

Ụjọ atụkwala gị i kwupụta nkwenye gị niile n’ọnọdụ ndị dị nkịtị, dị ka otu ahụ ị nwere ike iji kesaa echiche niile ọbụla ị nwere banyere isiokwu ọbụla.

Ị nwere ike, n’ezie, kwuo banyere emume niile nke Nzukọ nsọ ma ọ bụ otu akwụkwọ nsọ ị gụrụ nso nso a, mana ọ nwekwara ike ịdị nkịtị karịadị otu ahụ. Maka ọmụmaatụ:

  • Ọ bụrụ na ị na-enwe mmetụta sitere na okike, gosipụta obi ekele ịnwere maka ihe okike niile nke Chineke.

  • E nwere ike ị nwenwo otu Nhụmiihe ime mmụọ dị jụụ na nso nso a. Gwa otu enyi banyere ya ma ọ bụrụ na ọdịghị oke nkeonwe.

  • Chọta ihe atụ niile nke ozioma nime otu akwụkwọ ma ọ bụ muvi nke masịrị gị, ma kesaa nghọta gị niile.

N’ụzọ dị Nkịtị ma N’ụzọ Mfe

Dị ka ị na-achọta ụzọ ndị dị iche iche iji ekesa nkwenye gị niile, ọ ga-aga niihu na-adịrị gị mfe maka gị ime otu ahụ. Ọ nwere ike raa gị ahụ na mmalite, mana nke ahụ dị mma! Cheta, ịgba ama gị n’onwe ya adịworị mfe nye gị—ọ bụ otu akụkụ nke onye ị bụ. Ịkesa ya nwekwara ike ịdịkwa mfe. Naanị ihe ọ ga-eri bụ igosipụta ya ihe karịtụrụ ntakịrị kwa ụbọchị ọbụla.

Kedụ otu ị ga-esi ekesa ịgba ama gị taa?

Lee anya

  1. Dieter F. Uchtdorf, “Apr. 2019 ọgbakọ zuru ọha” (Ensign ma ọ bụ Liahona, Mee 2019, 17).

Bipụta