2023
Nzukọ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst
Ọktoba 2023


“Nhazi ahụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst,” Liahona, Oct. 2023.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Ọktoba 2023

Nhazi ahụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst

Foto, oyiyi
eserese nke Jizọs Kraịst

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, site n’aka Del Parson

Jịzọs Kraịst bụ isi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a. Ọ na akpali obi ndị amụma na ndị ozi ka ha na-edu Nzukọ nsọ taa, dịka O mere n’oge Agba Ọhụrụ niile. Ndị ndu Nzukọ nsọ ọzọ na-enyere ha aka.

Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a bụ Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta. E “wukwasịrị ya n’elu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, Jizọs Kraịst n’onwe ya bụ isi nkume nkunku” (Ndị Efesọs 2:20). Nke a pụtara na Ọ bụ otu akụkụ kachasị mkpa nke ntọala ahụ. Ọ na-edu Nzukọ nsọ ahụ site na ndị amụma na ndị ozi Ọ họrọla ịbụ ndị ndu.

Foto, oyiyi
Otu Ndịisi Mbụ

Otu Ndịisi Mbụ Ahụ

Onyeisi nke Nzụkọ nsọ ahụ bụ onye amụma nke Chineke n’elu ụwa taa. Ọ bụ Onye ozi kacha elu ma bụrụ naanị mmadụ dị n’elu ụwa onye na-anata mkpughe na-eduzi Nzukọ nsọ dum. Onyenwe anyị na-akpali ya ịmata ndị Ozi abụọ ọ ga-akpọ ka ha jee ozi dịka ndị ndụmọdụ ya. Ha na-abụ Otu Ndịisi Mbụ ahụ. Ha atọ bụ ndị amụma, ndị ọhụụ na ndị mkpughe.

Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ

Ndị otu nke Kworum nke Ndị-ozi Iri na Abụọ bụkwa ndị amụma, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe. Ha ka akpọrọ ịbụ ndị aka ebe pụrụ iche nke Jizọs Kraịst . Ha na-agagharị ụwa niile ịkuzi ma gbaa ama gbasara Ya. (Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:23, 33.)

Kworum nke ndi Iri asaa

Ndị otu Iri Asaa ka a na-akpọkwa ịbụ ndị aka ebe nke Jizọs Kraịst (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107: 25). Ha na-enyere Kworum nke Ndị Iri na Abụọ aka ịkuzi ozi ọma ahụ ma wulite Nzukọ nsọ ahụ na gburugburu ụwa.

Foto, oyiyi
ndị ndu na-enye onwe ha ndụmọdụ

Foto site n’aka Machiko Horii

Ndị ndu niile nke Ime obodo

Otu ndịisi nduzi stek ma ọbụ distrit, otu ndị bishọp ma ọbụ ngalaba nta, na otu ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyem aka bụ ndị Chineke kpọkwara. Ha nwere ike inyere unu aka ịmụta ma bie ndụ ozi ọma. Anyị nwere ike ịmụta ihe gbasara ụfọdụ ọkpụkpọ oku niile ndị a nime Maach 2022 Gospel Basic article, “Ije ozi nime Ọkpụkpọ oku niile nke Nzukọ nsọ.”

Bipụta