2023
Ịkwadobe Ịga Tempụl
Disemba 2023


“Ịkwadobe Ịga Tempụl,” Liahona, Dec. 2023.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Disemba 2023

Ịkwadobe Ịga Tempụl

Foto, oyiyi
ndị mmadụ na-agbago elu ruo Ogden Utah Tempụl

Foto nke Ogden Utah Tempụl site n’aka Mark Brunson

Niime tempụl niile nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a anyị nwere ike ịnata ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile maka onwe anyị na ndị nna nna anyị ha. Anyị na-aga tempụl ịjij gosi ịhụnaanya anyị na obi ekele nye Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Anyị nwere ike kwadoo ịga tempụl site n’ịmụ ihe na ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Maka ozi ọzọ banyere tempụl niile, lee ederede Ntọala niile nke Ozi ọma “Ọrụ Tempụl” dị niime mbipụta Ọktoba 2021 nke Liahona.

Foto, oyiyi
mkpụrụokwu dị n’ezi Durban South Afrịịka Tempụl

Foto nke Durban South Afrịịka Tempụl site n’aka Mattew Reier

Ụlọụlọ nke Onyenwe anyị

Tempụl niile ka akpọrọ “ụlọ nke Onyenwe anyị.” Ha bụ ebe ndị dị nsọ anyị nwere ike inwete mmetụta Mmụọ nke Chineke na ịhụnaanya Ya maka anyị. Ha bụkwa ebe ndị anyị nwere ike ịgba ọgbụgba ndụ niile ma nata emume nsọ ndị pụrụ iche ga-akwado anyị inwe ndụ ebighị ebi. (Ọgbụgba ndụ bụ nkwa ndị dị nsọ n’etiti Chineke na ụmụ Ya.) Ikwesị ntụkwasị nye ọgbụgba ndụ anyị na ịnata ọgbụgba ndụ ndị a na-enyere anyị aka inwe mmekọrịta pụrụ iche anyị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst.

Foto, oyiyi
ntoroọbịa guzooro n’ezi Guayaquil Ecuador Tempụl

Foto nke Guayaquil Ecuador Tempụl site n’aka Janae Bingham

Onye Nwere ike Ịga Tempụl?

Ndị otu Nzukọ nsọ nwere ike ime baptizim maka ndị nwụrụ anwụ malite n’afọ ha ga-agba 12. Onye otu nwere ike nata onyinye dị nsọ ma ọ bụrụ ma ọ dị opekempe 18, abụrụworịị onye otu nke Nzukọ nsọ ruo opekempe otu afọ, ma chọọ ime ma debe ọgbụgba ndụ tempụl niile (lee Akwụkwọ Ntụziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu, 27.2.2, ChurchofJesusChrist.org). Otu nwoke na otu nwanyị ndị nataworo onyinye dị nsọ ha nke tempụl ka e nwere ike ịrachi (ịlụ ọlụlụ) ruo ebighị ebi niime tempụl.

Ọgbụgba ndụ niile na Emume nsọ niile

Ị ga-eme ọgbụgba ndụ niile ma nata emume nsọ niile niime tempụl. “Ịbanye niime mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke na-ejikọta anyị nye Ya n’ụzọ nke na-eme ihe niile gbasara ndụ adị mfe karịa (Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nov. 2022, 97). Emume nso bụ otu ihe omume dị nsọ e mere site n’ikike nke ọkwa nchụaja. Emume nsọ niile nwere mpụtara ime mmụọ dị omimi. N’ịma atụ, mgbe i sonyere n’otu emume nsọ, ị na-egosi Chineke na gị dị njikere ịnata ma debe ọgbụgba ndụ Ya niile.

Nkwadobe Nke Onwe

Mee nkwado ime mmụọ site n’isoro nkuzi niile nke Jizọs Kraịst na idebe ọgbụgba ndụ niile i mere gị na Chineke na baptizim. I nwekwara ike ịmụ akụrụngwa niile nke Nzukọ nsọ, dị ka akwụkwọ nsọ na okwu ọgbakọ zuru ọha niile. Temples.ChurchofJesusChrist.org na-ewete ozi banyere ihe a ga-atụ anya mgbe ị gara tempụl. Ọ gụnyekwara nkọwa ndị ọzọ banyere ọgbụgba ndụ niile, emume nsọ niile, na ihe atụ nke tempụl

Foto, oyiyi
n’ezi Tempụl Nauvoo Illinois

Foto nke Tempụl Nauvoo Illinois site n’aka Eve Tuft

Ihe atụ

Onyenwe anyị na-akuzikarị ihe jiri ụmụ ihe atụ. N’ịma atụ, baptizim—na-aga n’okpuru mmiri ma na-agbalite elu ọzọ—dị ka okenye onwe gị na-anwụ anwụ na onwe gị dị ọhụrụ amụgharịrị (lee Ndị Rom 6:3-6). Emume nsọ tempụl niile na-arụtụ aka na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya. O nwere ike sie ike ịghọta ihe atụ niile oge mbụ ị gara tempụl, mana i nwere ike na-amụ ihe esepụghị aka dị ka ị na-alaghachi tempụl gburugburu ndụ gị.

Rekọmend Tempụl

Ịbanye tempụl, i kwesịrị ịdị njikere ma tozuo oke. I nwere ike ịnata rekọmend iji banye tempụl mgbe ajụjụ ọnụ gị na bishọp ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta na onyeisi stek ma ọ bụ mishọn gasịrị. Ndị ndu ndị a ga-ajụ ajụjụ ole ma ole iji hụ na ị na-ebi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ndị ndu gị nwere ike ịgwa gị okwu banyere ajụjụ ndịa tupu oge eruo.

Ị Na-alaghachi tempụl maka Ndị nna nna Gị ha

Nna nke Eluigwe chọrọ ka ụmụ Ya niile gbaa ndụ ha na Ya ma nata emume nsọ ndị dị nsọ. Emume nsọ ndị a, dị ka baptizim na onyinye dị nsọ, ka a garịrị eme niime tempụl maka ndị ahụ nwụrụ anwụ na-anataghị ozi ọma. I nwere ike laghachi na tempụl ime emume nsọ niile maka ndị otu ezi na ụlọ gị nwụrụ anwụ.

Bipụta