2023
Ndị nwụrụ anwụ Ga-eguzoro niihu Chineke
Disemba 2023


“Ndị Nwụrụ anwụ Ga Eguzoro niihu Chineke,” Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa, Dec. 2023.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Disemba 2023

Ndị nwụrụ anwụ Ga Eguzoro niihu Chineke

Na mkpughe ya, Jọn hụrụ Ikpe nke Ikpeazụ.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst

Ọ Na-abịa Ọzọ Ịchị ma Bụrụ Eze, Site n’aka Meri Sauer

ndị nwụrụ anwụ, dị obere ma dị ukwuu, ka ha guzooro niihu Chineke

Ike nke Mbilite n’ọnwụ nke Jịzọs Kraịst na-akpọta ndị niile niihu nke Chineke ka ekpee ha ikpe (lee Alma 11:42–44; 33:22; 40:21; Helaman 14:15-17; Mọmọn 9:13-14).

ewee saghee akwụkwọ ndị ahụ

Akwụkwọ ndị a gosipụtara ndekọihe ndị edebere n’ụwa banyere ihe ndị mmadụ mere n’ụwa iji soro ụzọ ọgbụgba ndụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:7).

akwụkwọ nke ndụ

“N’otu uche nke akwụkwọ nke ndụ bụ ngụkọta nke echiche niile na omume niile nke mmadụ—ndekọihe nke ndụ ya. Kosiladị, akwụkwọ nsọ nakwa egosi na ndekọihe nke eluigwe ka edebere maka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, gụnyekọta aha ha na ndepụta niile nke ihe omume ezi omume ha” (Odudu nke Akwụkwọ nsọ, “Akwụkwọ nke Ndụ,” scriptures.ChurchofJesusChrist.org).

ekpere ikpe

Ikpe nke Ikpeazụ na-abịa mgbe ndị mmadụ bilitesiri n’ọnwụ. Jizọs Kraịst ga-abụ ọkaikpe nke onye ọbụla. Ikpe nke a ga-ekpebi ebube ebighị ebi nke onye ọbụla ga-anata. (Lee Odudu nke Akwụkwọ nsọ, “Judgment, the Last,” scriptures.ChurchofJesusChrist.org; Alma 41:3–5; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:26–32.)

dị ka otu ọrụ ha siri dị

A ga-ekpe onye ọbụla ikpe site n’ihe ha mere na ihe ndị ha buuru n’obi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 137:9). A ga-ekpe ha ikpe site ma ha dịịrị nrube isi nye iwu nsọ niile nke Chineke ma mee ihe na ndakọrịta nihe ọbụla bụ ihé na eziokwu ha nataworo niime ndụ nke a.

Bipụta