Liahona
Chineke Ga-akwado ma Chekwaa Anyị
Ọgọst 2024


“Chineke Ga-akwado ma Chekwaa Anyị,” Liahona, Ọg. 2024

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Ọgọst 2024

Chineke Ga-akwado ma Chekwaa Anyị

Dị ka Ọchị agha Moronaị, anyị pụrụ ịnata enyem aka na ike si na chi maka agha niile ndị anyị na-ezute na ndụ.

Ọchị agha Moronaị na-ejide aha nke mnwere onwe

Ngosipụta niile site n’aka Eric Chow

Mgbe m gụrụ Akwụkwọ nke Mọmọn na mbụ, agụgụala maka agha niile n’etiti ndị Nifaị na ndị Laman masịrị m. E nwetere m mmasị nihi okwukwe, ọgụgụ isi, na ụzọ nka nke Ọchị agha Moronaị jiri eme ihe, onyeisi militịrị onye akpọrọ onye ndu nke otù ndị agha ndị Nifaị niile mgbe ọ gbara naanị agọ 25. Ọ maara ihe, sie ike, ma nwee nleruanya. Ọ tụkwasịrị obi kpamkpam nye mnwere onwe na ọdịmma nke ndị ya. (Lee Alma 48:11–12.)

Kama inye onwe ya otuto mmeri militịrị, Moronaị weere mmeri ahụ nyefee Chineke na nkwado dị nsọ nke otù ndị agha ya natara sitere n’aka ndịinyom na ụmụntakịrị na-adịghị alụ agha. Ọ gwara onye ndụ ndị iro emeriri: “Onyenwe anyị … aranyewo gị n’aka anyị. Ma ugbua aga m achọ ka unu ghọta na nke a bụ … niihi okpukperechi anyị na okwukwe anyị niime Kraịst.” Moronaị mgbe ahụ kesara nghọta nke ibu amụma nke a: “Chineke ga-akwado, ma debe, ma chekwaa anyị, ọbụrụraa na anyị kwesịrị ntụkwasị obi na ya, na nye okwukwe, na okpukperechi anyị” (Alma 44:3, 4).

Ka oge gara, abịawo m mata na Moronaị gosipụtara ụkpụrụ ndị anyị nwere ike itinye n’ọrụ iji nyere anyị aka zute aka mgba niile nke ndu anyị ugbu a. Dị ka anyị na-enwe okwukwe niime Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta nke ụwa, Ọ ga-eji ike Ya agọzi anyị. Mana maka Ya ime otu a na maka anyị ịmata ngọzi Ya niile, anyị kwesịrị ịghọta ebumnobi anyị, tụọ atụmatụ maka ime nke ọma, ma kwadoo maka agha atụ ndị anyị na-ezute, dị ka nnọọ Moronaị kwadoro maka ma zute agha ndị dị ire niime ndụ ya. Dị ka anyị na-eme otu a, Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ga-akwado ma chekwaa anyị.

Ịghọta Ebumnobi Anyị

Moronaị cheteere ndị ahụ ugboro ugboro ndị ha bụ (ndị nketa oke ọgbụgba ndụ nke Abraham), onye ha bụ nke ya (ụmụ Chineke hụrụ naanya), na ihe kpatara ha ji alụ agha (ezi na ụlọ, okpukperechi, na mnwere onwe). Moronaị kuziiri ndị ya na ha naara alụ agha maka nlanarị ha na maka mnwere onwe site na mkpagbu na ibu ohu. Na ndịiche, ndị iro ha lụrụ agha maka mfuli elu na ike nke onwe site na-itinye ndị ọzọ n’okpuru ha.

Mgbe ụfọdụ ndị Nifaị chọrọ ịdọrọ ikike n’ike maka uru nke onwe, Moronaị dọwara kootu ya ma dee n’otu ibe ya isi mmewere niile nke ozi ya: “Na ncheta nke Chineke anyị, okpukperechi anyị, na mnwere onwe, na udo anyị, ndị nwunye anyị, na ụmụ anyị.” O welitere ọkọlọtọ nke a, nke ọ kpọrọ “aha nke mnwere onwe,” na ngwụcha nke poolu ma jiri ya iji chetere ndị ahụ ihe agha ahụ bụ maka ya kpọmkwem na iji kpọkọta ha maka ebumnuche ahụ. (Lee Alma 46:12–13, 19–20.)

N’agha niile nke ndụ nke ime mmụọ, “anyị anaghị agba mgba megide anụ ahụ na ọbara, mana megide … ndị ọchịchị nke ọchịchịrị … [ma] megide ajọọ omume ime mmụọ” (Ndị Efesọs 6:12). Anyị, kwa, kwesịrị ka echetere anyị ihe anyị ji alụ agha maka ya. Okenye Neal A. Maxwell (1926-2004), onye bubuuru onye otù nke Kworum nke Ndị Iri na Abụọ, gosiputara echiche nke a na mkparịta ụka, dị ike, na-agbanyeghị dị nkenke.

Na 2004, a gara m leta Okenye Maxwell nime ọnụ ụlọ ụlọọgwụ ya mgbe na-adịghị anya tupu ya anwụọ. Ọ dịịrị obiọma nye onye niile bịara nleta ma ọ bụ nyeere ya aka. Ndị ụlọ ọrụ nlekọta ahụike bara niime ọnụ ụlọ ya ma pụta na-ebe akwa. A sịrị m ya, “Okenye Maxwell, nke a siri ezigbo ike.” Ọ chịrị ọchị ma sị, “O, Dale, anyị bụ mmadụ ebighị ebi bi niime ụwa pụrụ ịnwụ anwụ. Anyị esitewo na mmewere anyị pụọ, dị ka azụ pụrụ site na mmiri. Ọ bụ naanị mgbe anyị nwere echiche ebighị ebi ka nke ọbụla niime nke a ga-ekwe nghọta.”

Ka anyị ghara ichefu nnukwu ihe mejuputara ọdịdị si na chi na akaraka ebighị ebi anyị na ike ọjọọ niile ndị na-emegide anyị. Ị nwe ezi nghọta maka atụmatụ nke Nna nke Eluigwe ga-akpali mmụọ anyị ịnọgide na-agba mgba maka nzọpụta ebighị ebi anyị na maka mnwere onwe anyị site na-ịbụ ohu ime mmụọ.

ndị mmadụ na-akwado ebe ndị siri ike

Tụọ atụmatụ maka Ime nke ọma

Gburugburu agha niile nke otu ndị agha ya niile lụrụ, Moronaị tụrụ atụmatụ ịhụ na emere nke ọma. O jiri ndị ọgbanke iji chọpụta ihe omume niile na ebumnuche niile nke ndị iro ya. Ọ chọrọ odudu site n’aka onye amụma, Alma. Moronaị mgbe ahụ jiri omume ahụ mmụọ kpatere niime ụzọ agha. Ọ webatara akụrụngwa niile dị ka otu o si dị mkpa, na-edebe ndị agha karịa niime obodo ukwu ndị kachasị peempe na-inwe ebe ndị siri ike. Na mkpachapụanya ọ tụrụ atụmatụ ndị eji arụ ọrụ dị ka otu ozi eji n’aka siri dị.

Ya mere o ritere uru megide otu agha ndị iro ya. Ọ dịghị mgbe mmeri ndị gara aga juru ya afọ; kama, ọ garaniihu izulite ike ya na nke otù ndị agha ya iji metazie aka mgba ndị nke ọdịniihu.

Anyị nwekwara ike jiri otu ụdị omume ndị ahụ iji metazie ndị nkwugide ime mmụọ. Anyị nwere ike malite site na-ịmata ihe Setan na-anwa ime niime ndụ anyị. Ọ na-agba mbọ ịdọpụ uche anyị site na ebumnobi anyị. Mgbe ọnwụnwa bịara, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị:

  • Kedụ otu omume nke a n’aka nke m si juputa megide okwu Chineke ekpughere ekpughe?

  • Gịnị bụ nsonazụ niile nke ime omume nke a?

  • Omume nke a ọ ga-enyere m aka mejuputa ebumnobi m n’elu ụwa?

Anyị kwesịkwara ịmata mpụtara ikpeazụ nke ịdaba n’aka ọbụna ụmụ obere ọnwụnwa. Dị ka anyị na-adaba n’ọnwụnwa, anyị na-eri “nsi ntakịrị ntakịrị” (Alma 47:18), atụmatụ kachasị dị irè nke ike niile nke ajọ omume ji mee ihe nke pụrụ iduba na risọọtụ ọjọọ nke ime mmụọ.

Anyị nwere ike wusie onwe anyị ike megide ọnwụnwa niile nke Setan site na-isoro ntuziaka anyị natara site n’aka onye amụma ụbọchị ikpeazụ anyị. Ime otu ahụ na-enyere anyị aka idobe echiche ebighị ebi site n’ebe esi enyocha omume anyị niile. Ịtụ atụmatụ otu anyị si ezute ọnwụnwa niile ndị na-apụta n’akụkụ dị iche iche nke ndụ anyị ga-enyere anyị aka mee nhọrọ ndị kacha zie ezie n’oge ahụ. Atụmatụ na ụzọ ndị atụrụ na mbụ ga-enyere anyị aka chekwaa megide mmeghara anya niile site n’ebe ebumnobi ebighị ebi anyị nọ.

Otu ọmụmaatụ bụ nke teknụzụ. Teknụzụ nwere ike bụrụ mma agha onụ abụọ, ma nke bara uru ma nke na-abaghị uru, dabere n’otu anyị si eji ya eme ihe. Inyere anyị aka mee nhọrọ ndị dị mma banyere ngwa anyị, ndị na-eto eto na ndị agadị nwere ike ịrụtụ aka na “Ilekọta Teknụzụ” na Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Ihe odudu maka Ime Nhọrọ niile. Ihe ndị a na-echetere anyị maka ebumnobi anyị, na-atụrụ anyị aka na Jizọs Kraịst, ma nyere anyị aka ịkpọku Mmụọ Nsọ niime ndụ anyị. Ịtụ atụmatụ otu, mgbe, na ebe anyị ga-eji teknụzụ eme ihe ga-eme anyị esie ike megide aghụghọ nke ụwa, dị njọ.

Ndị Lama na-awakpo ebe ndị Nifaị niile siri ike

Ịkwado maka Agha Atụ niile

Ị na-atụanya agha ndị na-abịa niihu, Moronaị kwadoro ndị ya notu notu jiri epekele obi niile, ngwa nchekwa niile, okpu nchekwa niile, na uwe siri ike. Ọ kwadokọtara ndị ya ọnụ site na-ịgba obodo ukwu niile okirikiri jiri nwusi ike niile, na-atulite mkpumkpu aja gburugburu ha.

Niime mmụọ, anyị na-akwado n’otu n’otu site n’idebe iwu nsọ niile nke Chineke. Anyị na-eme ma na-edebe ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke nke na-adọta ike nke Jizọs Kraịst niime ndụ anyị. Anyị na-esonye na nranye nke onwe, dị ka ikpe ekpere, ibu ọnụ, na ịchọgharị akwụkwọ nsọ. Anyị nakwa eme ihe n’okwukwe, na-azaghachi nye odudu ime mmụọ anyị na-anata. Anyị na mkpachapụ anya na-akwado maka ma na-eri oriri nsọ na ntozu oke. Dị ka anyị na-eme otu a, Onye Nzọpụta na-adịrịzi ire niime ndụ anyị, dị ka nnọọ Ọ dị ire nye Moronaị, onye guzosiri ike n’okwukwe ya niime Jizọs Kraịst. Moronaị maara na ya ga-adabere na Onye Nzọpụta maka odudu na nnapụta (lee Alma 48:16). Anyị, kwa, nwere ike ịdabere na Jizọs Kraịst maka odudu na nnapụta.

Anyị nwekwara ike ịganiihu site na-ịgba ezi na ụlọ anyị ume. Nna anyị nke Eluigwe haziri anyị niime ezi na ụlọ iji nyere anyị aka nwee obi ụtọ ma mụta otu esi alaghachikwuru Ya. Ezi na ụlọ anyị niile nwere ike bụrụ nzipụta nke enyemaka maka anyị. Anyị niile nwere ike inwete mmetụta ọńụ na ịhụnaanya site na-ichete na anyị bụ akụkụ nke ezi na ụlọ nke Chineke dị ukwuu, na-agbanyeghị ọnọdụ nke onwe nke ezi na ụlọ niile.

Anyị nwere ike na nchịkọta rite ume ma kwadoo maka agha ime mmụọ niile dị ka anyị na-esonye niime obodo niile nke Ndị Nsọ. Stek anyị niile na distrikt anyị niile na-ewete ụdị ebe mgbaba na nchekwa. Anyị nwere ike zụọ ibe anyị niime mmụọ, nyere ibe anyị aka idebe iwu nsọ niile nke Chineke, ma gbaa ibe anyị ume ịdabere na Kraịst, mgbe ọbụla na kacha nke n’oge niile nke ịma aka. Mgbe anyị gbakọtara, anyị na-amata na anyị anaghị alụ agha anyị niile naanị anyị. Anyị nwere ndị enyi, ndị nkuzi, na ndị ndu ndị nwere ike inyere anyị aka ma chekwaa anyị. Anyị niile siri ike karịsịa mgbe anyị kwadokọtara ọnụ.

N’ụzọ dị ịrịba ama, Moronaị kwuru na obi ụtọ niile nke ndị ya sitere na-ịkwụdesi ike na okwukwe ha niime Chineke na okpukperechi ha. Dị ka Moronaị, anyị kwesịrị ịmata na ọńụ na-abịa niihi Nna nke Eluigwe na atụmatụ Ya na niihi Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya. Dị ka anyị na-abịa ghọta ebumnobi anyị, tụọ atụmatụ maka ime nke ọma, ma kwadoo maka agha ihe atụ niile, anyị na-anata enyem aka na ike si na chi.

Dị ka Moronaị, ama m na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst na-ewete mnwere onwe kachasị site na-ịbụ ohu—mnwere onwe site n’ọnwụ na mmehie. Ha na-agọzi anyị jiri ike Ha mgbe anyị lekwasịrị Ha anya niihe niile.

Hụba ama

  1. Ilekọta Teknụzụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  2. Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile (2022), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  3. Russell M. Nelson, “Ọńụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 82.