Liahona
Ndị Dike Na-eto eto
Ọgọst 2024


“Ndị Dike Na-eto eto,” Friend, Ọgọst 2024, 26–27.

Ozi Kwa Ọnwa nke Friend Ọgọst 2024

Ndị Dike Na-eto eto

Foto, oyiyi
Ndị mmadụ na-eli ngwa ọgụ ha niime olulu

Ngosipụta niile site n’aka Andrew Bosley

Ndị ahụ Amọn na ụmụnne ya ndị nwoke kuziiri ihe chọrọ isoro Jizọs Kraịst. Ha liri ngwa ọgụ ha ma kweere Chineke nkwa na ha enweghị ike alụ ọgụ ọzọ.

Foto, oyiyi
Otu otù ndị ikom nta garutere ụlọ ebe ndị okenye dimkpa nọ n’ekwu okwu

Mana mgbe na-adịghị anya ọ dịịrị ha mkpa ichekwa ezi na ụlọ ha niile. Ndị nna ndị liri ngwa ọgụ ha achọghị imebi nkwa ha kweere Chineke. Ya mere ụmụ ha ndị nwoke kwadoro ịlụchitere ha ọgụ. A kpọrọ ha ndị dike na-eto eto puku abụọ. Na-eto eto pụtara “nta.”

Foto, oyiyi
Onyeikom nta ya na nne ya na-ekpe ekpere ebe ndị ikom nta ndị ọzọ na-agbakọta ọnụ jiri ngwa ọgụ.

Ndị dike ndị a na-eto eto alụtụbeghị ọgụ n’agha mbụ. Mana ndị nne ha nyeere ha aka kwadoo ma kuziere ha ịtụkwasị obi na Chineke.

Foto, oyiyi
Helaman na-edu ndị dike ndị ahụ na-eto eto na nzọm ije; otu onyeikom nta na-enyere onyeikom nta ọzọ merụrụ ahụ ịga ije

Ha họọrọ Helaman ịbụ onye ndu ha. Obi siri ha ike, ma Chineke nyeere ha aka. Ha niile merụrụ ahụ, mana ha nyeere onwe ha aka. Chineke nabatara okwukwe ha, ma ha niile dịịrị ndụ!

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Akwụkwọ nsọ Pụrụ Inyere M aka Ụbọchị Niile

Foto, oyiyi
Ihu akwụkwọ a na-ete agba nke ihe niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn na-apụta site niihu akwụkwọ niile nke akwụkwọ ghe oghe

Ngosipụta site n’aka Adam Koford

Olee akụkọ akwụkwọ nsọ ị nwere mmasị na ya?

Bipụta