“Jizọs Kraịst Bụ Isi nke ‘Olileanya Dị gara gara,’ ‘Dị mma,’ ma ‘Kacha Magbuo onwe ya na mma,’” Liahona, Diz. 2024.
Ozi Liahona Kwa ọnwa, Dizemba 2024
Jizọs Kraịst Bụ Isi nke “Olileanya Dị gara gara,” “Dị mma,” ma “Kacha Magbuo onwe ya na mma”
N’oge mmemme nke a pụrụ iche nke ọmụmụ nwata ahụ na Bethlehem, ka anyị na-echeta mgbe niile na Jizọs Kraịst bịara n’ụwa ị bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị.
Onye ozi Pita na Jekọb na Moronaị ndị amụma nke Akwụkwọ nke Mọmọn na-ekwusi ike onyinye nke ime mmụọ gbasara olileanya niime Kraịst na inye nkuzi nʼụzọ niile yiri ndị a.
Iji maatụ, Pita mara ọkwa, “Ngọzi dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nke bụ site na uju ebere ya amụwokwa anyị ọzọ inwe olileanya dị gara gara site na mbilite nʼọnwụ nke Jizọs Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ” (1 Pita 1:3; nkwusi ike agbakwunyere). Biko huta ojiji nke mkpụrụokwu ahụ “ịdị gara gara” iji kọwaa “olileanya.”
Jekọb mara ọkwa, “Ya mere, ụmụnne m ndị m hụrụ naanya, mee udo n’ebe ọ nọ site n’aja mgbaghara mmehie nke Kraịst, Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya, ma unu ga-enweta mbilite n’ọnwụ, dị ka otu ike nke mbilite n’ọnwụ ahụ nke dị niime Kraịst siri dị, ma ka e gosị unu dị ka mkpụrụ mbụ niile nke Kraịst nye Chineke, na-enwe okwukwe, ma nweta olileanya dị mma nke otuto niime ya tupu ya egosipụta onwe ya n’anụ ahụ” (Jakọb 4:11; nkwusi ike agbakwunyere). Biko hụta ojiji nke mkpụrụokwu ahụ “ịdị mma” iji kọwaa “olileanya.”
Ma Moronaị kwuru, “Ma e chetakwara m na ị sịwo na ị kwadowo ụlọ maka ndị mmadụ, ee, ọbụna nʼetiti nnukwu ụlọ niile nke Nna gị, niime nke mmadụ nwere ike nwee olileanya kacha magbuo onwe ya na mma; ya mere mmadụ ga-enwerịrị olileanya, ma ọ bụ ọ gaghị anata ihe nketa nʼebe ahụ nke i kwadoworo” (Eta 12:32; nkwsi ike agbakwunyere). Biko huta ojiji nke mkpụrụokwu ahụ “magburu onwe ya na mma” iji kọwaa “olileanya.”
Gịnị Bụ Olileanya niime Kraịst?
Onyinye nke ime mmụọ banyere olileanya niime Kraịst bụ iji ọńụ atụanya ndụ ebighị ebi site na “nrite uru niile, na ebere, na amara nke Mezaya Dị Nsọ” (2 Nifaị 2:8) na ọchịchọ siri ike maka ngọzi niile nke ezi omume e kwere na nkwa. Nkọwa niile “dị gara gara,” “dị mma,” na “kacha magbuo onwe ya na mma” nọ niime amaokwu ndị a na-atụ ero mmasi obi ike mgbasa nọ na-aganiihu ma dị nkọ banyere Mbilite nʼọnwụ na ndụ ebighị ebi site na okwukwe niime Jizọs Kraịst.
Onye amụma Mọmọn kọwara:
“Ma ọzọkwa, ụmụnne m ndị m hụrụ naanya, aga m agwa unu okwu gbasara olileanya. Olee otu ọ ga-esi mee na unu ga-enwe ike toruo nʼinwe okwukwe, ma ọbụghị na unu ga-enwe olile anya?
“Ma gịnị ka ọ bụ nke unu ga-enwe olileanya ya? Lee a sị m unu na unu ga-enwe olileanya site nʼaja mgbaghara mmehie nke Kraịst na ike nke mbilite nʼọnwụ ya, iji nwee mkpọlite baa na ndụ ebighị ebi, ma nke a niihi okwukwe unu na ya dị ka otu nkwa ahụ siri dị.
“Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ e nwee okwukwe ọ ga-enwerịrị olileanya; niihi na ma enweghị okwukwe enweghị ike enwe olileanya ọbụla” (Moronaị 7:40–42).
Atụmatụ nke Ańụrị nke Nna
Olileanya niime Kraịst nke dị gara gara, dị mma, ma kacha magbuo onwe ya na mma na-amalite site na ọmụma ihe na Chineke Nna nke Ebighị ebi dị ndụ. Ọ bụ Nna anyị, ma anyị bụ ụmụ nke mmụọ Ya. Anyị nʼezie bụ ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị nke mmụọ nke Chineke ma anyị eketawo njirimara niile sinachi site na Ya.
Nna bụ onye mmalite banyere atụmatụ nke ańụrị (lee Abraham 3:22–28). Dị ka ụmụ nke mmụọ ndị nwoke na ndị nwanyị nke Chineke, anyị “nabatara atụmatụ Ya site na nke ụmụ Ya nwere ike iji nweta anụ ahụ ma nwete nhụmiihe nke elu ụwa iji gaaniihu chee ihu n’izu oke ma n’ikpeazụ chọpụta akaraka ha sinachi dị ka ndi nketa oke nke ndụ ebighị ebi.” Niime akwụkwọ nsọ niile, anyị na-amụ: “Nna ahụ nwere ahụ nke anụ ahụ na ọkpụkpụ niile e nwere ike imetụ aka dị ka nke mmadụ; Ọkpara ahụ kwa” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:22). Site otu a, inweta ahụ niile nke anụ ahụ dị oke mkpa niime nsoro nke ị na-aganiihu chewe ihu na-akaraka sinachi anyị.
Anyị bụ okike abụọ nwere otu chi. Mmụọ anyị niile, akụkụ anyị nke dị ebighị ebi, ka eyikwasịrị ahụ anụ ahụ nke nọ nʼokpuru ọchịchọ niile na inwe agụụ nke anụ ahụ pụrụ ịnwụ anwụ. Atụmatụ nke ańụrị nke Nna bụ nke ahaziri iji wete ntuziaka maka ụmụ Ya, iji nyere ha aka lọghachikwute Ya nebe obibi na nchekwa jiri ahụ ndị bilitere n’ọnwụ ebuliri elu, na ịnata ngọzi niile nke ọńụ na ańụrị dị ebighị ebi.
Ọrụ nke Mgbapụta nke Jizọs Kraịst nwere ịrụ niime Atụmatụ nke Nna
Jizọs Kraịst bụ Ọkpara ahụ a Mụrụ Naanị Ya nke Nna nke Ebighị ebi. Ọ bịara niime ụwa ime uche nke Nna Ya (lee 3 Nifaị 27:13). Jizọs Kraịst bụ onye ahụ e tere mmanụ site nʼaka Nna ị bụ onye nnọchi anya nke onwe Ya niime ihe niile gbasara nzọpụta nke ụmụ mmadụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị niihi na O meriri ma ọnwụ ma mmehie.
Alma buru amụma nye ndị nke Gideon gbasara ọrụ nzọpụta nke Mezaya:
“Ma ọ ga-agagharị, na-ata ahụhụ mgbu niile na mkpagbu niile na ọnwụnwa niile n’ụdị ọbụla; ma nke a ka e wee mezuo okwu ahụ nke sịrị na ọ ga-ebukwasị onwe ya ihe mgbu niile na ọrịa niile nke ndị ya.
“Ma ọ ga ebukwasị onwe ya ọnwụ, ka o wee tọpụ agbụ niile nke ọnwụ nke kere ndị ya; ma ọ ga-ebukwasị onwe ya adịghị ike ha niile, ka afọ ya niile wee juputa n’ebere, dị ka n’anụ ahụ, ka o wee mata dị ka n’anụ ahụ otu ọ ga-esi nyere ndị ya aka dị ka otu adịghị ike ha niile siri dị.
“Ugbua Mmụọ ahụ maara ihe niile; otu o sila dị Ọkpara Chineke na-ata ahụhụ dị ka n’anụ ahụ ka o wee nwee ike bukwasị onwe ya mmehie niile nke ndị ya, ka o wee nwee ike hichapụ njehie ha niile dị ka otu ike nke nnapụta ya siri dị” (Alma 7:11–13).
Ụkpụrụ mbụ nke ozi ọma bụ okwukwe niime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ezigbo okwukwe na-elekwasị anya niime na nʼihe banyere Onye Nzọpụta ma na-enye anyị ike inwe ntụkwasị obi na Ya ma nwee ntụkwasị obi zuru oke nʼike Ya ịzọpụta anyị site nʼọnwụ, sachaa anyị site na mmehie, ma gọzie anyị site nʼume nke karịrị nke anyị onwe anyị.
Moronaị gbara ama, “Ma niihi mgbapụta nke mmadụ, nke sitere na Jizọs Kraịst bịa, a na-akpọghachite ha nʼebe Onyenwe anyị nọ; ee, nke a bụ ụzọ nke esi agbapụta ụmụ mmadụ niile, niihi na ọnwụ nke Kraịst na-eme ka mbilite-nʼọnwụ mezuo, nke na-eweta na mmezu mgbapụta site nʼụra na-enweghị nsọtụ, site nʼụra nke a ga-esi akpọte ụmụ mmadụ niile site nʼike nke Chineke mgbe ụda opi ga-ada; ma ha ga-apụta, ma ndị nta ma ndị ukwu, ma mmadụ niile ga-eguzoro nʼihu oche ikpe ya, ebe a gbapụtara ma tọpụ ha site nʼagbụ nke ọnwụ dị ebighị ebi, ọnwụ nke bụ ọnwụ nke anụ ahụ” (Mormon 9:13).
Ana m agba ama na Onye Nzọpụta gbajiri agbụ niile nke ọnwụ. O bilitere n’ọnwụ, Ọ dị ndụ, ma Ọ bụ Ya bụ naanị isi nke olileanya dị gara gara, dị mma, ma kacha magbuo onwe ya na mma.
Ihe ndabere nye mkpụrụ obi ahụ
Onye amụma Eta gbara ama, “Ya mere, onye ọbụla nke kwere na Chineke nwere ike nʼezie nwee olileanya maka ụwa kacha mma, ee, ọbụna ọnọdụ nʼaka nri nke Chineke, bụ nke olileanya na-abịa site nʼokwukwe, na-eme ndabere nye mkpụrụ obi nke ụmụ mmadụ, nke ga-eme ka ha kwusie ike ma guzogide, mgbe niile na-anọgide nʼezi ọrụ niile, ebe a na-eduba ha na-ito Chineke” (Eta 12:4; nkwusi ike agbakwunyere).
N’oge mmemme nke a pụrụ iche nke ọmụmụ nwata ahụ na Bethlehem, ka anyị na-echeta mgbe niile na Jizọs Kraịst bịara niime ụwa ị bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị. O kwere inye anyị onyinye nke ime mmụọ ego na-apụghị ịzụta banyere ndụ, ihe, mmegharị ọhụrụ, ịhụnaanya, udo, ịhụ nuuche, ọńụ, na olileanya.
Ana m akpọku unu ịchọ site nʼụzọ ziri ezi maka onyinye nke ime mmụọ nke olileanya na Onye Nzọpụta site na-ịmụ nkuzi niile na ama niile nke ndị amụma mgbe ochie na oge ugbua gbasara aja ịkwụ ụgwọ mmehie na Mbilite nʼọnwụ Ya nʼezie. Mgbe ị na-eme otu ahụ, ana m ekwe nkwa na ịgba ama gị banyere ị bụ Chi nke Onye Mgbapụta ga-enweta mgbam ume, ntọgharị gị nye Ya emikpuo ime, ọchịchọ na mkpebi gị iguzoro dị ka onye aka ebe banyere Ya siri ike ga-abawanye, ma ị ga-abụ onye a gọziri agọzi nwere ndabere nye mkpụrụ obi gị—ọbụna dị gara gara, dị mma, na olileanya kacha magbuo onwe ya na mma.
Site na Ndịozi ndị na-agbawo ama banyere Ya kemgbe niile, eji m ọńụ ama ọkwa aka ebe m na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara dị ndụ nke Chineke dị ndụ. Ọ bụ Onye Mgbapụta anyị bilitere nʼọnwụ nwere ahụ dị ebube, nwere njide aka nke anụ ahụ na ọkpụkpụ. Ma niihi mgbapụta na mkpezi anyị na Chineke nke Onyenwe anyị mere ya ekwe omume maka ụmụ mmadụ niile, anyị nwere ike nata mmasị obi ike nke ime mmụọ na olileanya dị gara gara, dị mma, ma kacha magbuo onwe ya na mma na “niime Kraịst ka mmadụ niile ga-adị ndụ” (1 Ndị Kọrịnt 15:22).
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Dizemba 2024. Igbo. 19296 593