Liahona
Nifaị Wee Hụ Nwata Jizọs
Dizemba 2024


“Nifaị Wee Hụ Nwata Jizọs,” Friend, Dizemba 2024, 26–27.

Ozi nke Friend Kwa Ọnwa, Dizemba 2024

Nifaị Wee Hụ Nwata Jizọs

Lehi na-akuziri Nifaị ihe, na Nifaị na-ekpe ekpere

Ngosipụta niile site n’aka Andrew Bosley

Nna nke Nifaị, Lehi, hụrụ ọhụ banyere Jizọs Kraịst. Nifaị chọburu ịhụ ọhụ nke a kwa. O kpere ekpere ma rịọ ịhụihe ihe nke nna ya hụrụ.

Nifaị na-ahụ Meri na nʼọhụ

Mmụọ Nsọ gosịrị Nifaị otu ọhụ ahụkwa. Nifaị hụrụ otu nwata nwanyị a kpọrọ Meri. Mmụọ Nsọ sịrị na ọ ga-abụ nne nke Ọkpara nke Chineke, Jizọs Kraịst.

Nifaị na-ahụ Meri na Nwata Jizọs nʼọhụ

Nifaị hụrụ nwata Jizọs ya na Meri. Mmụọ Nsọ ahụ sịrị na Jizọs ga-abịa nʼụwa inyere ụmụ Nna nke Eluigwe aka.

Nifaị na-ededata ọhụ ya; nwata nwanyị na-agụ  akwụkwọ nsọ

Nifaị hụrụ ndụ nke Jizọs Kraịst. Ọ hụrụ Ya ka ọ na-eje ozi ma na-akuziri ndị mmadụ ihe. Nifaị mụtara ọtụtụ ihe gbasara Onye Nzọpụta. I nwekwara ike mụọ ihe gbasara Ya site n’ịgụ akwụkwọ nsọ.

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Ekeresimesi Bụ gbasara Jizọs

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Ngosipụta site n’aka Adam Koford

“Niihi na amụworo anyị otu nwa, enyewo anyị otu nwa nwoke” (Aịzaya 9:6).