Come, Follow Me
Dizemba 8–14: “Anyị Kwere”: Edide niile nke Okwukwe na Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2


“Dizemba 8–14: ‘Anyị Kwere’: Edide niile nke Okwukwe na Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Edide niile nke Okwukwe na Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

akwa na-egosi aka ndị nwere ọtụtụ agba akpụkpọ anụ

Nkọwa n’uju sitere na Nye Ndị nwoke Niile Bụ Ndị otu Tozuru oke, site n’aka Emma Allebes

Dizemba 8–14: “Anyị Kwere”

Edide niile nke Okwukwe na Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2

Kemgbe Ọhụ nke Mbụ nke Josef Smith, Chineke agawo niihu idu Nzukọ nsọ Ya site na mkpughe. N’ụfọdụ ọnọdụ, mkpughe ahụ agụnyewo mgbanwe nye iwu niile na omume niile nke Nzukọ nsọ. Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2 mara ọkwa ụdị mkpughe nke a—otu dubara na ịkwụsị ọtụtụ alụmdi na nwunye, ma nke ọzọ mere ngọzi niile nke ọkwa nchụaja dịrị nye ndị si agbụrụ niile. Mgbanwe ndị dị ka ndị a so bụrụ akụkụ nke ihe ọ pụtara inwe “ezi nzukọ nsọ na nke dị ndụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:30), nwere ezigbo onye amụma na nke dị ndụ, nke ezi Chineke na nke dị ndụ na-edu.

Mana eziokwu dị ebighị ebi adịghị agbanwe agbanwe, agbanyeghị na nghọta anyị maka ya na-agbanwe. Ma mgbe ụfọdụ mkpughe na-agbakwunye ihè nye eziokwu. Edide niile nke Okwukwe na-emejuputa nzube nke a na-edo anya. Nzukọ nsọ ka atọrọsiri ntọala ya ike n’elu eziokwu dị ebighị ebi otu ọ dị nwere ike ito ma gbanwee “dị ka otu uche nke Onyenwe anyị siri dị, na-adaba na ebere ya niile dị ka otu ọnọdụ niile nke ụmụ mmadụ siri dị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:15). Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, “Anyị kwere ihe niile nke Chineke kpugheworo, ihe niile Ọ na ekpughe ugbua, ma anyị kwenyekwara na Ọ ka ga-ekpughe ọtụtụ oke ihe na ihe ndị dị mkpa gbasara Alaeze Chineke” (Edide niile nke Okwukwe 1:9).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Edide niile nke Okwukwe

akara ngosi semịnarị
Edide niile nke Okwukwe nwere niime ya ntọala eziokwu niile nke ozi ọma ahụ eweghachitere.

Tulee usoro nke a iji mụọ Edide niile nke Okwukwe: Maka edide nke Okwukwe ọbụla, dee “obere ihe ọmụmụ” iji kọwaa ihe i kwenyere. Obere ihe ọmụmụ gị nwere ike ịgụnye niime ya akwụkwọ nsọ, foto, abụ ma ọ bụ egwu ụmụntakịrị, ma ọ bụ nhụmiihe nke onwe banyere ibi otu eziokwu nke edide nke Okwukwe ahụ na-akuzi.

Kedụ ndịiche eziokwu ndị a na-eme niime mmekọrịta gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst? Kedụ otu Edide niile nke Okwukwe siworo melite ọmụmụ ozi ọma gị ma ọ bụ nyere gị aka kesaa ozi ọma nye ndị ọzọ?

Lee kwa Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Edide niile nke Okwukwe,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; L. Tom Perry, “Ozizi niile na Ụkpụrụ niile Dị niime Edide niile nke Okwukwe,” Liahona, Nov. 2013, 46–48; “Isi nke 38: Leta Wentworth,” niime Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smith (2011), 435–47.

Edide niile nke Okwukwe 1:9; Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst bụ nke mkpughe na-edu.

“Anyị kwere na [Chineke] ka ga-ekpughe ọtụtụ oke ihe na ihe ndị dị mkpa gbasara Alaeze Chineke” (Edide niile nke Okwukwe 1:9). Buru ụkpụrụ nke a n’uche, nyochaa Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2, ma chọọ mkpụrụokwu na nkebiokwu ndị na-agba okwukwe gị ume niime mkpughe na-aganiihu. Kedụ otu mkpughe ndị a si emetụta ndụ gị? Kedụ otu ha siworo nye aka n’ọrụ ọganiihu nke alaeze nke Nna nke Eluigwe?

Kedụ akaebe ị na-ahụ na nke mere na ana edu Nzukọ nsọ “site na mkpatemmụọ nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile” taa? (Nkwusa niile Akwadoro 1). Ikekwe i nwere ike nyochaa otu ma ọ bụ karịa nke ozi ndị nke ọgbakọ zuru ọha emere na nso nso a, na-achọ otu Onyenwe anyị si na-edu Nzukọ nsọ Ya—na ndụ gị. Ozi kacha nso sitere n’aka Onyeisi Nzukọ nsọ nwere ike bụrụ ebe dị mma iji bido.

Kedụ ihe i nwere ike ime ọ bụrụ ma gị ma ọ bụ onye ị hụrụ naanya na-adọlị ịghọta ma ọ bụ ịnabata ihe Onyenwe anyị na-akuzi site n’aka ndị amụma Ya? Gịnị mere i jiri nwee obi ekele maka onye amụma?

Lee kwa Emọs 3:7; 2 Nifaị 28:30; Allen D. Haynie, “Onye amụma Dị ndụ maka Ụbọchị Ikpeazụ ndị a,” Liahona, Me 2023, 25–28; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndị amụma,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; “Anyị Ekelee Gị, O Chineke, maka Onye Amụma,” Abụ niile, ọn. 19.

Nkwusa niile Akwadoro 1

Ọrụ nke Chineke ga-agarịrị niihu.

Niime “Edemede sitere na Ndụmọdụ Atọ si n’aka Onyeisi Wilford Woodruff gbasara Manifesto” (dị na ngwụcha nke Nkwusa Akwadoro 1), kedụ ebumnuche ndị onye amụma na-enye maka Onyenwe anyị ịkwụsị omume nke alụmdi na nwunye karịrị otu? Gịnị ka nke a na-akuziri gị banyere ọrụ nke Chineke?

Maka ozi ndị ọzọ banyere ọnọdụ agụgụala nke Nkwusa niile Akwadoro 1, lee Ndị nsọ, 2:602–15; “Oje ozi na Manifesto ahụ,” dị niime Mkpughe ndị nọ n’Ọnọdụ, 323–31; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Alụmdi na nwunye karịrị Otu na ndị Ezi na ụlọ na Isimbụ Utah,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

Onyeisi Wilford Woodruff

Wilford Woodruff, site n’aka H. E. Peterson

Nkwusa Akwadoro 2

A pụrụ m ịtụkwasị obi niime Onyenwe anyị, ọbụna mgbe m na-enweghị nghọta zuru oke.

Anyị amaghị ihe mere echichi ọkwa nchụaja na emume nsọ niile nke tempụl ji bụrụ nke enweghị maka ndị otù Nzukọ nsọ ndị si na agbụrụ Afrịịka otu mgbe. Ọbụna mgbe izute ajụjụ ndị siri ike na-enweghị ọsịsa banyere atụmatụ ahụ, ọtụtụ Ndị nsọ Ojii Ụbọchi ikpeazụ a tụkwasịrị obi na Onyenwe anyị (lee Ilu 3:5) ma nọgide na nkwesị ntụkwasị obi nye Ya oge ndụ ha niile. Ịmụ ihe banyere okwukwe na nhụmiihe ha nwere ike na-akpate mmụọ nye gị. Ebe a bụ ụfọdụ nkọwapụta ha, a na-ahụ na history.ChurchofJesusChrist.org:

Dị ka ị na-agụ Nkwusa Akwadoro 2, gịnị ka ị na-amụ banyere usoro nke Onyenwe anyị maka iduzi atụmatụ niile nke Nzukọ nsọ Ya? Tụgharịa uche otu i siworo mụọ ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị ọbụna mgbe ị na-enweghị nghọta zuru oke.

Lee kwa 2 Nifaị 26:33; “Ịgba aka ebe nke Ịkwesị ntụkwasị obi,” niime Mkpughe niile dị ka Ọnọdụ siri dị, 332–41; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Agbụrụ na Ọkwa nchụaja,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; Ahmad Corbitt, “Edemede nke Onwe maka Agbụrụ na Ọkwa nchụaja,” akụkụ 1–4, history.ChurchofJesusChrist.org; BeOne.ChurchofJesusChrist.org.

Ọ dị Mma ikwu “Amaghị M.” Ebe i kwesịrị ịgbalị ịme otu ikachasị nwee ike inyere ndị ị na-akuziri aka ịza ajụjụ niile banyere ozi ọma, Onyenwe anyị anaghị atụanya na gị ga-ama ihe niile. Mgbe ị na-amaghị otu esi aza ajụjụ, kwere ya. Mgbe ahụ rụtụrụ ndị na-amụ ihe ozizi ekpughere, ma gbaa ezi ama banyere ihe ị maara.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Edide niile nke Okwukwe

Ekwere m na ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

  • Tulee ịchọta na ịgụ abụ niile ma ọ bụ egwu ụmụntakịrị ndị nwere ike inyere ụmụ gị aka ghọta otu ma ọ bụ karịa niime Edide niile nke Okwukwe. Ikekwe ha nwere ike nyere gị aka họrọ abụ niile na egwu niile. Nyere ụmụ gị aka hụ otu egwu niile si metụta Edide niile nke Okwukwe.

  • Gị na ụmụ gị nwere ike rụkọọ ọrụ ọnụ ide ajụjụ ndị mmadụ nwere ike inwe banyere ozi ọma nke Jizọs Kraịst ma ọ bụ Nzukọ nsọ Ya. I nweziri ike rụkọta ọrụ ọnụ ịza ajụjụ ndị ahụ jiri Edide niile nke Okwukwe. Kedụ ebe ọzọ anyị nwere ike ịga mgbe anyị nwere ajụjụ niile banyere ozi ọma a?

Edide niile nke Okwukwe 1:9; Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2

Onyenwe anyị na-edu Nzukọ nsọ Ya site n’aka Ndị amụma Ya.

  • Na-inyere ụmụ gị aka ghọta edide nke Okwukwe nke itolu, ikekwe i nwere ike inye ha ukwu akwụkwọ nsọ na foto nke onye amụma dị ndụ (ma ọ bụ mbipụta ọgbakọ zuru ọha nso nso a nke Liahona). Gwa ha iwelite akwụkwọ nsọ elu dị ka ị na-agụ mkpụrụokwu nke a “ihe niile nke Chineke kpugheworo” na foto ma ọ bụ magazin mgbe ị na-agụ “ihe niile nke Ọ na-ekpughe ugbu a” (Edide niile nke Okwukwe 1:9). Gịnị mere anyị ji na-achọ ma ndị amụma oge gboo ma nke oge ugbu a?

  • Ụmụ gị nwere ike mụọ otu mkpụrụokwu nke ndị amụma si edu anyị site na-isoro ntuziaka niile iji mee ihe, dị ka nri ma ọ bụ ngwa egwuregwu. I nwere ike tụnyere nke a na nkuzi niile Jizọs Kraịst nyere anyị site n’aka onye amụma. Gịnị bụ ụfọdụ ụmụ ihe Onyenwe anyị kuziworo anyị site n’aka onye amụma Ya dị ndụ taa?

ụmụntakịrị na-ele ọgbakọ zuru ọha

Chineke na-akpọ ndị amụma idu Nzukọ nsọ Ya.

Nkwusa niile Akwadoro 1 na 2

Ndị amụma na-enyere anyị aka mata uche nke Nna nke Eluigwe.

  • Ikekwe ịhụta otu akwụkwọ nsọ mgbe gboo si metụta mkpughe oge ugbu a nwere ike nyere ụmụ gị aka ghọta Nkwusa niile Akwadoro. I nwere ike rịọ ha ịgụ Ọrụ 10:34–35 na Jekọb 2:27–30 ma kpọkuo ha ikpebi akwụkwọ nsọ nke metụtara Nkwusa niile Akwadoro 1 (nke dubara na nkwụsị alụmdi na nwunye karịrị otu) na nke metụtara Nkwusa niile Akwadoro 2 (nke mara ọkwa na echichi ọkwa nchụaja na emume nsọ niile nke tempụl dị adị nye ndị nke agbụrụ niile). Gbaa ama gị na Onyenwe anyị na-ekpughe uche Ya nye ndị amụma oge gboo na oge ugbu a.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.