“Dizemba 22-28: ‘Onyinye Na-enweghị atụ nke Ọkpara Sinachi nke Chineke’”: Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ekeresimesi,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Dizemba 22–28: Onyinye Na-enweghị atụ nke Ọkpara Sinachi nke Chineke
Ekeresimesi
Onye amụma Josef Smith mara ọkwa, “Isi ukpuru niile nke okpukperechi anyị bụ ama nke Ndị Ozi na Ndị amụma gbasara Jizọs Kraịst, na Ọ nwụrụ, elie ya, ma bilite ọzọ n’ụbọchị nke atọ, ma rigooro n’eluigwe; ma ihe ndị ọzọ niile nke metụtara okpukperechi anyị bụ naanị ihe ndị agbakwụnyere niime ya” (Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smith [2011], 49). Mgbe ihe gafere afọ 160 gasịrị, nkwuputa nke a kpatere mmụọ nke Otù Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ ibipụta “Kraịst Ahụ Dị ndụ: Ama nke Ndị Ozi” na nkwanye ugwu nke emume ncheta ugboro 2,000 nke ọmụmụ nke Onye Nzọpụta (lee Russell M. Nelson, “Ịdọta Ike nke Jizọs Kraịst niime Ndụ Anyị,” Liahona, Me 2017, 40).
Dị ka Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, anyị na-enwe ọńụ na ngọzi nke mkpughe na-aganiihu site n’aka ndị amụma na ndị ozi oge ugbu a. Anyị juputara n’ekele maka okwu ndụmọdụ ha, ịdọ aka na ntị, na mgbam ume mmụọ kpatere. Mana kachasị ihe niile, agọziwo anyị site na ama ha nke Jizọs Kraịst dị ike—n’oge Ekeresimesi na gburugburu afọ ahụ niile. Ndị a karịrị naanị nnọọ okwu ndị na-akpali akpali nke ndị ode akwụkwọ nwere nkà ma ọ bụ ndị na-okwu okwu ọha ma ọ bụ nghọta ndị sitere n’aka ndị ọkacha mara ihe gbasara akwụkwọ nsọ. Ha bụ mkpụrụokwu nke “ndị akaebe pụrụ iche nke aha nke Kraịst n’ụwa niile” nke Chineke họrọworo, kpọọ, ma nye ikike (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:23).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
“Onweghị onye ọzọ nweteworo ụdị nnukwu mmetụta pụtara ihe otu a.”
Kedụ ihe ị ga-ekwu iji kwadoo nkwupụta ahụ na “onweghị onye ọzọ nweteworo ụdị nnukwu mmetụta pụtara ihe otu a [dị ka Jizọs Kraịst] n’isi ndị niile biworo n’ụwa ma ka ga-ebi n’elu ụwa”? Chọọ edereede ndị dị niime “Kraịst Ahụ Dị ndụ” nke na-agba ama nke nnukwu mmetụta nke Onye Nzọpụta. Kedụ otu O siworo metụta gị?
Ọ bụrụ na onye na-amachaghị ihe banyere okpukperechi ndị otu Kraịst jụrụ gị ihe kpatara i ji na-eme mmemme Ekeresimesi. Kedụ otu i ga-esi azaghachi? Buru ajụjụ nke a nobi ji nyochaa “Kraịst Ahụ Dị ndụ” ma tulee idedata echiche ọbụla ma ọ bụ mmetụta ọbụla nke na-abịara gị.
Lee kwa “Ihe Kpatara Anyị Si Nwee Mkpa Onye Nzọpụta” (vidiyo), Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
“O biliri site n’ili.”
Niime “Kraịst Ahụ Dị ndụ,” Ndị ozi gbara ama Mbilite n’ọnwụ nke Onye Nzọpụta, na-akpọpụta mpụta atọ nke Onyenwe anyị bilitere n’ọnwụ (lee nkeji edemede 5). Tulee ịgụ ụfọdụ akọwapụta nke nleta ndị a niime Jọn 20; 3 Nifaị 11; na Josef Smith—Agụgụala 1:14–20. Kedụ ihe ị na-amụta banyere Onye Nzọpụta site n’okwu na omume Ya niile n’oge mpụta ndị a?
“Ọkwa nchụaja Ya na Nzukọ nsọ Ya ka eweghachitere.”
N’oge ọmụmụ ihe gị nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile afọ nke a, i nweteworịị ohere iji mụtakwuo banyere otu esiworo “weghachite ọkwa nchụaja nke Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ya.” Kedụ eziokwu niile ma ọ bụ ụkpụrụ niile eweghachiteworo kachasị baara gị uru? Tulee inyochagharị ụfọdụ niime akwụkwọ nsọ ndị a sotere nke na-akuzi banyere Mweghachite: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:17–23; 13; 20:1–12; 65; 110; 112:30–32; 124:39–42; 128:19–21. Tụgharịa uche otu eziokwu niile nke ozi ọma eweghachitere si nyere gị aka mara ma hụ Jizọs Kraịst naanya.
“Ọ ga-alọghachi n’ụwa otu ụbọchị.”
Ekeresimesi bụ oge iji chelaa uche azụ n’ụbọchị a mụrụ Jizọs Kraịst na ịtụanya n’ụbọchị Ọ ga-alọghachi ọzọ. Kedụ ihe ị na-amụta banyere nlọghachi ya sitere na nkeji edemede nke abụọ tupu nke ikpeazụ nke “Kraịst Ahụ Dị ndụ”? I nwekwara ike tulee ịgụ ihe, ịgụ egwu, ma ọ bụ ige ntị nye abụ niile nke Ekeresimesi na-akuzi ihe banyere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, ụdị dị ka “Ọńụ nye Ụwa” ma ọ bụ “Ọ Bịara niime Etiti abalị Doro anya” (Abụ niile, nos. 201, 207).
“Ọ bụ ihè, ndụ, na olileanya nke ụwa.”
Niime nkeji edemede ikpeazụ nke “Kraịst Ahụ Dị ndụ,” hụba ama njirimara niile na aha niile enyere maka Onye Nzọpụta. Tulee itinye oge wee mụọ ihe banyere ụfọdụ niime ha. Iji maatụ:
Ihè: Kedụ otu Jizọs Kraịst ji dị ka ihè nye gị? I nwere ike tulee iji aka see foto ma ọ bụ see foto nke, nye gị, gosipụtara ìhè Ọ na-enye gị. Kedụ ihe na-akpate mmụọ gị ime iji kesaa ìhè Ya? (Lee kwa Jọn 8:12; 3 Nifaị 18:24; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:24.)
Ndụ: Gịnị mere i ji na-eche na ndụ bụ ezigbo mkpụrụokwu iji kọwaa Jizọs Kraịst? N’uche dị ọlịa ka O si nye gị ndụ? Kedụ otu ndụ gị ga-esi adị iche ma enweghị Ya na ozi ọma Ya? (Lee kwa Jọn 10:10; 1 Ndị Kọrịnt 15:19-23; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 66:2.)
Olileanya: Kedụ ihe i na-enwe olileanya maka ya niihi Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya? Ị maara otu onye dị na-eche na ya enweghị olileanya banyere ọdịniihu? Tụgharịa uche otu i nwere ike i si kesaa nye onye ahụ olileanya i na-enwete niime Jizọs Kraịst. (Lee kwa Ndị Rom 8:24–25; Ita 12:4; Moronaị 7:41.)
Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Jizọs Kraịst,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
“Ekele dịrị Chineke maka onyinye [Ya] na-enweghị atụ.”
Niime “Kraịst Ahụ Dị ndụ,” Ndị Ozi rụtụrụ aka na Onye Nzọpụta dị ka “onyinye” sitere n’aka Nna nke Eluigwe. Ịdabere nihe ị chọtara niime “Kraịst Ahụ Dị ndụ,” kedụ otu i ga-esi edezu ahịrịokwu nke a: Site na Jizọs Kraịst, Chineke na-enye m onyinye niile nke …” Tụgharịa uche n’ihe i nwere ike ime iji nata onyinye ndị a n’uju karịa.
Kedụ otu ọmụmụ ihe nke “Kraịst Ahụ Dị ndụ” si metụta okwukwe gị niime ma ịhụnaanya maka Onye Nzọpụta?
Lee kwa Russell M. Nelson, “Onyinye Anọ Nke Jizọs Kraịst Na-enye Gị” (Devotional Ekeresimesi Otu Ndịisi Mbụ, Dec. 2, 2018), Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; “Ederede niile ewepụtara sitere niime ‘Kraịst Ahụ Dị ndụ: Ama nke Ndị Ozi’” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
A pụrụ m “ịgba ama [m]” iji mee mmemme ọmụmụ nke Jizọs.
-
Tulee otu i nwere ike i si dubata ụmụ gị nye “Kraịst Ahụ Dị ndụ.” Ikekwe i nwere ike inyere ha aka ịrụtụ aka na aha ahụ Kraịst niime aha na mbịanye aka niile nke Otù Ndịisi Mbụ na Iri na abụọ. I nwere ike kọwaa na nke a bụ ama ha banyere Jizọs Kraịst nke ha chọbuuru ikesaara ụwa.
-
I nwere ike inye nwa ọbụla otu nkebiokwu sitere na “Kraịst Ahụ Dị ndụ” ma rịọ ha ịchọta ma ọ bụ ise foto nke nkebiokwu ahụ. Emesịa i nwere ike nyere ha aka chọta nkebiokwu ahụ niime “Kraịst Ahụ Dị ndụ.” I nwekwara ike chịkọta foto ndị ahụ na nkebiokwu ndị ahụ n’otu akwụkwọ.
-
Kesaara ibe unu otu i si nweta ama gị nke Jizọs Kraịst. Ikekwe i nwere ike nyefegharịa foto nke Onye Nzọpụta ma n’otu n’otu na-akọ ihe ị maara banyere Ya (gụnyere eziokwu ndị akuziri niime “Kraịst Ahụ Dị ndụ”).
“Ọ nọ na-agagharị na-eme ihe dị mma.”
-
Dị ka gị na ụmụ gị na-agụ nkeji edemede nke abụọ nke “Kraịst Ahụ Dị ndụ,” gị na ha kwuo banyere ụfọdụ niime ihe ndị Jizọs mere. I nwekwara ike lee anya na foto ndị sitere na ndụ Ya (lee ihu akwụkwọ ihe omume izu ụka nke a na Akwụkwọ Nka Ozi ọma). Kpọkuo ụmụ gị ikwu okwu banyere ihe Onye Nzọpụta na-eme niime foto ndị ahụ. Kedụ otu anyị ga-esi ejere ndị ọzọ ozi dị ka O mere? Vidiyo niile nke “Nye Ụwa Ihè” dị niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma nwere ike inye gị uche.
“Ọ bụ ihè ahụ, ndụ ahụ, na olileanya nke ụwa.”
-
Nyere ụmụ gị aka chọta abụ Ekeresimesi ndị nke na-ekwu maka ihè, ndụ, na olileanya nke ọmụmụ nke Onye Nzọpụta wetere nye ụwa, dị ka “O Obere Obodo ukwu nke Bethlehem” (Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 208). Bụkọtanụ abụ ndị a ọnụ, ma kwe ụmụ gị ịkọ otu Jizọs siworo wetere anyị ihè, ndụ, na olileanya niime ndụ anyị.
“Ekele dịrị Chineke maka onyinye na-enweghị atụ nke Ọkpara Ya dị nsọ.”
-
Kedụ onyinye ndị anyị nataworo niihi Jizọs Kraịst? Elemaanya gị na ụmụ gị nwere ike chọọ maka onyinye ndị a niime “Kraịst Ahụ Dị ndụ” ma ọ bụ niime otu egwu dị ka “O Zitere Ọkpara Ya” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 34–35). Mgbe ahụ ha nwere ike kechie ihe iji dochie anya onyinye ndị ahụ. I nwere ike tụpụta ka ụmụ gị mepee onyinye ndị ahụ n’Ụbọchị Ekeresimesi iji nyere ha aka cheta Onye Nzọpụta na onyinye Ya nye anyị.