Come, Follow Me
Appendix A: Maka ndị Nne na nna—Ikwado Ụmụ Unu maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke


“Appendix A: Maka ndị Nne na nna—Ịkwado Ụmụ Unu maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Appendix A,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: 2025

nne na nwa

Appendix A

Maka ndị Nne na nna—Ikwado Ụmụ Unu maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke

Niihi na Ọ hụrụ gị naanya, tụkwasị obi na gị, ma maara ike mmepụta gị, Nna nke Eluigwe enyewo gị ohere iji nyere ụmụ gị aka banye ma gaaniihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ Ya, ụzọ nke ndụ ebighị ebi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ 68:25–28). Nke a gụnyere inyere ha aka kwadoo ime na idebe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, dị ka ọgbụgba ndụ nke baptizim na ọgbụgba ndụ ndị e mere niime tempụl. Site n’ọgbụgba ndụ ndị a, ụmụ unu ga-enwe ike n’obi ụtọ jikọta onwe ha nye Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst.

E nwere ọtụtụ ụzọ ndị eji akwado ụmụ unu maka njem nke a n’ụzọ ọgbụgba ndụ, ma Nna nke Eluigwe ga-enyere gị aka chọta ụzọ kachasị mma iji nyere ha aka. Dị ka ị na-achọ mkpatemmụọ, buru n’obi na ọ bụghị ọmụmụ ihe niile na-eme n’oge ihe ọmụmụ ndị ahọpụtara. N’ezie, akụkụ nke ihe na-eme ọmụmụ ihe n’ebe obibi adị ike nke ukwuu bụ ohere iji mụọ site n’ọmụmaatụ na site n’oge nkuzi ihe dị ntakịrị ma dị mfe—ụdị nke na-eme n’ụdị eke dị ka ibi ndụ si apụta kwa ụbọchị. Dị nnọọaanị ka isoro ụzọ nke ọgbụgba ndụ bụ usoro oge ndụ na-anọgide, otu ahụ kwa ka ọmụmụ ihe banyere ụzọ nke ọgbụgba ndụ dị. (Lee “Ebe obibi na Ezi na ụlọ,” Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta [2022], 30–31.)

N’okpuru bụ ụfọdụ nchepụta nke nwere ike iduba na mkpatemmụọ ndị ọzọ. I nwere ike ịchọta nchepụta ndị agbakwunyere maka ikuziri ụmụntakịrị gbara afọ ndị Praịmarị niime “Appendix B: Maka Praịmarị—Ịkwado Ụmụntakịrị maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke.”

Baptizim na Emume nnabata

Nifaị kuziri na “ọnụ ụzọ ama site ebe [anyị] kwesịrị ịbanye” ụzọ nke ọgbụgba ndụ “bụ nchegharị na baptizim site na mmiri” (2 Nifaị 31:17). Mgbalị gị inyere ụmụ gị aka kwadoo maka baptizim na emume nnabata pụrụ idebesi ụkwụ ha ike n’ụzọ ahụ. Mgbalị ndị a na-amalite jiri nkuzi banyere okwukwe niime Jizọs Kraịst na nchegharị. Ha gụnyekwara ikuzi ihe banyere otu anyị si emegharị ọhụrụ ọgbụgba ndụ nke baptizim anyị site i na-eri oriri nsọ izu ụka ọbụla.

baptizim

Nifaị kuziri na “ọnụ ụzọ ama site ebe [anyị] kwesịrị ịbanye” ụzọ nke ọgbụgba ndụ “bụ nchegharị na baptizim site na mmiri” (2 Nifaị 31:17).

N’ebe a bụ ụfọdụ akụrụngwa ndị nwere ike inyere gị aka: 2 Nifaị 31; mbipụta pụrụ iche nke magazin Friend banyere baptizim; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Baptizim,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

  • Mgbe ọ bụla i nwetere nhụmiihe nke na-agba okwukwe gị niime nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ume, kesaa ya nye nwa gị. Nyere ha aka ghọta na okwukwe bụ ihe nke pụrụ ị na-esiwanye ike n’ike oge ndụ niile. Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị nwa gị nwere ike ime iji zulite okwukwe siri ike niime Kraịst tupu ha e mee baptizim?

  • Mgbe nwa gị mere nhọrọ na-adịghị mma, kwuo okwu n’obi ụtọ banyere onyinye nke nchegharị. Ma mgbe i mere nhọrọ na-adịghị mma, kesaa ọńụ na-abịa mgbe i chegharịrị. Gbaa ama na niihi Jizọs Kraịst tara ahụhụ ma nwụọ niihi mmehie anyị, anyị nwere ike chegharịa kwa ụbọchị, agbaghara anyị, ma anyị anata ike ịgbanwe. Mgbe nwa gị chọrọ mgbaghara, gbaghara n’efu ma n’obi ụtọ.

  • Gwa nwa gị banyere baptizim gị. Gosi foto niile ma kesaa ihe ncheta niile. Kwuo banyere otu o si metụta gị, otu idebe ọgbụgba ndụ nke baptizim gị siworo nyere gị aka mata Jizọs Kraịst karịa, na otu ọgbụgba ndụ gị si aganiihu na agọzi ndụ gị. Gbaa nwa gị ume ịjụ ajụjụ niile.

  • Mgbe e nwere baptizim niime ezi na ụlọ gị ma ọ bụ ngalaba ukwu gị, kpọrọ nwa gị ịhụ ya. Kwukọrịtanụ okwu banyere ihe gị na nwa gị hụrụ ma nwete mmetụta. Ọ bụrụ ma o kwe omume, gwa onye a na-eme baptizim okwu ma jụọ ajụjụ ndị dị ka ndị a sotere: “Kedụ otu i siri mee mkpebi nke a? Kedụ otu i siri kwadoo?”

  • Mgbe ọ bụla ị matara na nwa gị na-eme ihe ha kwere nkwa ime, nye ezi otito. Rụtụ aka na idebe nkwa niile na-enyere anyị aka kwadoo idebe ọgbụgba ndụ niile anyị na-eme mgbe anyị mere baptizim. Gịnị ka anyị na-ekwe Chineke nkwa mgbe anyị mere baptizim? Gịnị ka Ọ na-ekwe anyị nkwa? (Lee Mozaya 18:8-10, 13.)

  • Kwuo maka otu ịbụ onye anabatara na ịbụ onye otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a siworo gọzie gị. N’ịmaatụ, kedụ otu i si bịaruo Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nso dị ka i jewooro ndị ọzọ ozi na dị ka ndị ọzọ jewooro gị ozi? Nyere nwa gị aka chee maka ụzọ ije ozi niile ma gbaa ndị ọzọ ume dị ka onye otù Nzukọ nsọ. Nyekwara ha aka nwete nhụmiihe ma mata ọńụ nke na-abịa site na-ije ozi.

  • Mgbe gị na nwa gị nwekọtara nhụmiihe dị nsọ (dị ka na nzukọ nsọ, mgbe ị na-agụ akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ dị ka ị na-ejere mmadụ ozi), gwa ha banyere mmetụta ime mmụọ niile ma ọ bụ echiche niile i nwetara. Kpọkuo nwa gị ikesa mmetụta ha na-enwe. Mata ụzọ ndị dị iche iche Mmụọ nwere ike i si kwuoro ndị mmadụ okwu, gụnyere ụzọ ndị o si na-agwa gị okwu n’onwe gị. Nyere nwa gị aka mata ma kesaara gị oge ndị mgbe ha nwere ike ị na-enweta mmetụta nke Mmụọ Nsọ.

  • Unu lekọta ọnụ viidiyo ole ma ole dị niime nchịkọta niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma akpọrọ “Nụrụ Ya!” Kwurịkọta okwu banyere ụzọ ndị dị iche iche ụmụ odibo nke Onyenwe anyị si anụrụ olu ya. Kpọkuo nwa gị ise otu foto ma ọ bụ ime vidiyo banyere otu ha si anụrụ olu nke Onye Nzọpụta.

  • Mee oriri nsọ ihe omume dị nsọ ma na-enye obi uto niime ezi na ụlọ gị. Kesaara nwa gị otu i si elekwasị anya na Jizọs Kraịst n’oge oriri nsọ. Nyere nwa gị aka ịtụ atụmatụ igosi na oriri nsọ dị nsọ nye ha. N’ịmaatụ, ige ntị na mkpụrụokwu niile nke ekpere oriri nsọ nwere ike chetara anyị maka ọgbụgba ndụ nke baptizim anyị.

  • Ọtụtụ mbipụta nke magazin Friend gụnyere edereede niile, akụkọ niile, na ihe omume niile iji nyere ụmụntakịrị aka kwadoo maka baptizim na emume nnabata. Kwe ka nwa gị họrọ ụfọdụ ihe a ga-agụ ma nwee obi ụtọ gị na ya. (Lee kwa nchịkọta ahụ “Ịkwado maka Baptizim” niime nkeji ụmụntakịrị nke Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.)

Ike, Ikike, na Ọtụghe niile nke Ọkwa nchụaja

Ọkwa nchụaja bụ ikike na ike nke Chineke site ebe O si na-agọzi ụmụ Ya. Ọkwa nchụaja nke Chineke nọ n’ụwa taa niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a. Ndị otù Nzukọ nsọ niile ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ha—ụmụnwanyị, ụmụnwoke, na ụmụntakịrị—ka a na-agọzi jiri ike ọkwa nchụaja nke Chineke niime ebe obibi ha iji gbaa onwe ha na ndị ezi na ụlọ ha ume” (Akwụkwọ ntuziaka Izugbe: Ije ozi niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a, 3.6, Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Ike nke a ga-enyere ndị otù aka na-ịrụ ọrụ nzọpụta na mbuli elu nke Chineke niime ndụ nke onwe ha na nke ezi na ụlọ ha (lee Akwụkwọ ntuziaka Izugbe, 2.2).

Mgbe ndịikom na ndịinyom na-eje ozi niime ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ niile, ha na-eme otu ahụ jiri ikike ọkwa nchụaja, n’okpuru ntuziaka nke ndị ahụ ji ọtụghe ọkwa nchụaja niile. Ụmụ Nna nke Eluigwe niile—ụmụ Ya ndị nwoke na ụmụ Ya ndị nwanyị—ka a ga-agọzi dị ka ha na-abịa aghọtazi ọkwa nchụaja nke ọma.

Anyị na-anata emume nsọ niile site n’ikike nke ọkwa nchụaja. Ndị otù Nzukọ nsọ ndị nwoke tozuru oke na-anata ikike ọkwa nchụaja site na-inyefe na ichi echichi ọkwa nchụaja gaa n’ọkwa ọrụ niile nke ọkwa nchụaja” (Akwụkwọ ntuziaka Izugbe, 3.4). Ndị ahụ ji ọkwa ọrụ niile nke ọkwa nchụaja ka e nwere ike inye ikike site n’aka otu onye ji ọtụghe ọkwa nchụaja niile iji mee emume nsọ ọkwa nchụaja niile.

Ịmụtakwu banyere ọkwa nchụaja, lee Russell M. Nelson, “Akụ niile nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2019, 76–79; Russell M. Nelson, “Ọnụ ahịa nke Ike Ọkwa nchụaja,” Liahona, Me 2016, 66–69; “Ụkpụrụ niile nke Ọkwa nchụaja,” isi nke 3 niime Akwụkwọ ntuziaka Izugbe.

  • Mee emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja ka ọ bụrụ akụkụ ọdịnụdị nke ndụ ezi na ụlọ gị. N’ịmaatụ, nyere nwa gị aka kwadoo niime mmụọ maka oriri nsọ izu ụka ọ bụla. Gbaa nwa gị ume ịchọ ngọzi niile nke ọkwa nchụaja mgbe ha na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee mkpa nkasị obi ma ọ bụ ntuziaka. Mee ka ọ bụrụ agwa ikwupụta ụzọ niile Onyenwe anyị si na-agọzi ezi na ụlọ gị site n’ike nke ọkwa nchụaja.

  • Dị ka ị na-agụkọ akwụkwọ nsọ ọnụ, chọọ maka ohere iji kwurịta otu Chineke si agọzi ndị mmadụ site n’ike Ya. Kesaa nhụmiihe nke onwe gị maka mgbe Chineke gọziri gị site n’ọkwa nchụaja Ya. Maka ọmụmatụ nke ngọzi niile anyị na-anata site n’aka Chineke site n’ọkwa nchụaja, lee Akwụkwọ ntuziaka Izugbe, 3.2, 3.5.

  • Kuziere nwa gị na emesịa baptizim, ha nwere ike ịnata ike ọkwa nchụaja site na-idebe ọgbụgba ndụ nke baptizim. Nyochagharịkọtanụ ọnụ ozi nke Russell M. Nelson “Akụ Ime Mmụọ niile” (Liahona, Nov. 2019, 76–79). Gwa nwa gị otu emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja siworo wete ike nke Chineke niime ndụ gị. Maka ndepụta nke ụzọ ndị esi gọzie anyị site n’ike ọkwa nchụaja, lee Akwụkwọ ntuziaka Izugbe, 3.5.

  • Kwurịta ajụjụ ahụ “Kedụ ihe nwa odibo nke Onyenwe anyị dị ka ya?” Gụkọta ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:36–42, ma chọọ azịza niile. Mgbe ọbụla ị matara na nwa gị (ma ọ bụ onye ọzọ) na-etinye otu niime ụkpụrụ niile ma ọ bụ njirimara niile dị niime amaokwu ndị a n’ọrụ, kwupụta ya.

  • Mgbe gị ma ọ bụ nwa gị na-eji ọtụghe iji gbaghee ọnụ ụzọ ma ọ bụ gbanye ụgbọala, were obere oge tụnyere ọtụghe ndị ahụ nye ọtụghe niile nke ndị ndu ọkwa nchụaja ji. (Maka nkọwasị nke ọtụghe ọkwa nchụaja niile, lee Akwụkwọ ntuziaka Izugbe, 3.4.1). Kedụ ihe ọtụghe ọkwa nchụaja niile “na-agbaghe” ma ọ bụ “na-agbanyere” anyị? Lee kwa Gary E. Stevenson, “Ebee Ka Ọtụghe niile na Ikikere niile nke Ọkwa nchụaja nọ?,” Liahona, Me 2016, 29-32; “Ebee Ka Ọtụghe niile nọ?” (vidiyo), Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

    2:51

    Where Are the Keys?

    Priesthood authority and keys start the engine, open the gates of heaven, facilitate heavenly power, and pave the covenant pathway back to our Heavenly Father.

  • Mgbe edopụrụ gị iche maka otu ọkpụkpọ oku, kpọkuo nwa gị ị nọ ebe ahụ, ọ bụrụ ma o kwe omume. Kwe ka nwa gị hụ ka ị na-emejuputa ọkpụkpọ oku gị. I nwekwara ike ọbụna chọọ ụzọ ndị dabara adaba ha nwere ike iji nyere gị aka. Kọwaa otu i si enwe mmetụta ike nke Onyenwe anyị niime ọkpụkpọ oku gị.

Ị na-eme Baptizim na Ịnabata maka Ndị nna nna

Tempụl niile bụ otu akụkụ atụmatụ nke Nna nke Eluigwe maka ụmụ Ya. Niime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na-eme ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ anyị na Nna nke Eluigwe dị ka anyị na-esonye niime emume nsọ niile dị nsọ, nke ha niile na-arụtụ aka na Jizọs Kraịst. Nna nke Eluigwe ewetewo ụzọ maka ụmụ Ya niile iji mee ọgbụgba ndụ niile ma sonye niime emume nsọ niile, gụnyere ndị na-anataghị ha niime ndụ nke a. Na mbido nke afọ nwa gị na-agba 12, ha etozuwo ime baptizim na ime nnabata niime tempụl maka ndị nna nna nwụrụ anwụ (lee kwa 1 Ndị Kọrịnt 15:29).

  • Gaa n’ụlọ nke Onyenwe anyị dị ka ọnọdụ gị si kwe. Gwa ụmụ gị okwu banyere ihe mere i ji na-aga na otu tempụl si enyere gị aka nwee mmetụta ịdị nso nye Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst.

  • Nyochaa ma mkpakọrịtanụ ụka n’ajụjụ niile nke rekọmend tempụl. I nwere ike ịchọta ha na ihu akwụkwọ 36–37 nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile (2022). Gwa nwa gị okwu banyere ihe na-eme niime ajụjụ ọnụ nke rekọmend tempụl. Kesaa ihe mere inwe rekọmend tempụl jiri dị mkpa nye gị.

  • Gụkọtanụ ọnụ Malakaị 4:6. Kwuo banyere otu obi gị nwere ike iji tụgharịa nye ndị nna nna gị ha. Mụtakwuo ọzọ banyere ndị nna nna gị ha site na-inyochakọtagharị agụgụala ezi na ụlọ gị na FamilySearch.org. Chọọ maka ndị nna nna ndị ekwesịrị ime baptizim ma nabata. Onye njụta tempụl na agụgụala ezi na ụlọ nke ngalaba ukwu nwere ike inyere gị aka.

  • Nyochakọtanụ ọnụ ụfọdụ niime akụrụngwa ndị dị niime nchịkọta a kpọrọ “Tempụl” niime nkeji nke ụmụntakịrị nke Ọba akwụkwọ Ozi ọma. (Lee kwa “Ịkwado Nwa Gị maka Baptizim niile na Emume nnabata niile nke Tempụl” na ChurchofJesusChrist.org.)

Ịnata Ngọzi nke Onye Petrak

Ngọzi nke onye petrak nwere ike ịbụ nsịpụta nke odudu, nkasị obi, na mkpatemmụọ. O nwere niime ya ndụmọdụ nke onwe enyere anyị site n’aka Nna nke Eluigwe ma na-enyere anyị aka ghọta njirimara na nzube ebighị ebighị ebi anyị. Nyere nwa gị aka kwadoo ịnata ngọzi nke petrak site na-ikuziri ha mkpa na ọdịdị dị nsọ nke ngọzi niile nke onye petrak.

Maka ịmụtakwu ọzọ, lee Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ngọzị niile nke Onye Petrak,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; Julie B. Beck, “I Nwere Ikike ọmụmụ Mara mma,” Liahona, Me 2006, 106–8.

  • Kesaara nwa gị nhụmiihe gị banyere ịnata ngọzi nke onye petrak. I nwere ike kesaa ihe ndị dị ka otu i si kwadoo ịnata ya, otu o siworo nyere gị aka bịarute Chineke nso, na otu O si na-edu gị esepụghị aka site na ngọzi nke a. I nwekwara ike kpọkuo nwa gị ikwuru ndị otù ezi na ụlọ ndị ọzọ okwu ndị nataworo ngọzi niile nke onye petrak nke ha.

  • Nyochakọtanụ ọnụ ozi nke Okenye Randall K. Bennett “Ngọzi nke Onye Petrak Gị—Ntuziaka Mmụọ kpatere sitere n’aka Nna nke Eluigwe” na ozi nke Okenye Kazuhiko Yamashita “Oge maka Ịnara Ngọzi nke Onye Petrak Gị”(Liahona, Me 2023, 42–43, 88–90). Kesaara ibe unu ihe unu mụtara site na ozi ndị a banyere ihe mere Nna nke Eluigwe si na-achọ ka anyị nata ngọzi nke onye petrak. Ịmụ banyere usoro nke ịnata ngọzi nke onye petrak, lee Akwụkwọ ntuziaka Izugbe, 18.17.

  • Ọ bụrụ na i nwere ndị nna nna natara ngọzi niile nke onye petrak, o nwere ike na-akpate mmụọ ịgụ ụfọdụ niime ha gị na nwa gị. Ịrịọ maka ngọzi niile nke ndị nna nna nwụrụ anwụ, banye niime ChurchofJesusChrist.org, pịa Ngwa ọrụ niile nọ n’elu aka nri nke skiriin ahụ, ma họrọ Ngọzi nke Onye Petrak.

  • Mgbe nwa gị natasịrị ngọzi nke petrak, kpọkuo onye otù ezi na ụlọ ọbụla ndị nọ oge ahụ idekọ mmetụta ha ma kesaara ha nwa gị.

Ịnata Onyinye dị nsọ

Chineke na-achọ inye onyinye dị nsọ, ma ọ bụ gọzie, ụmụ Ya niile jiri “ike sitere n’elu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 95:8). Anyị na-aga na tempụl ịnata onyinye dị nsọ nke onwe anyị naanị otu mgbe, mana ọgbụgba ndụ ndị anyị na Chineke na-eme na ike nke ime mmụọ Ọ na-enye anyị dị ka akụkụ nke onyinye dị nsọ nwere ike ịgọzi anyị ụbọchị niile nke ndụ anyị.

  • Gosi otu foto nke tempụl n’ebe obibi gị. Gwa nwa gị okwu banyere mmetụta ndị i nwetere niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Na-ekwu ugboro ugboro banyere ịhụnaanya gị maka Onyenwe anyị na ụlọ Ya na ọgbụgba ndụ ndị i meworo ebe ahụ. Chọọ oghere niile iji gaa tempụl gị na nwa gị iga mee baptizim niile na emume nnabata niile maka ndị nna nna ha ha.

  • Nyochakọtanụ ọnụ temples.ChurchofJesusChrist.org. Gụkọtanụ ọnụ edide ndị dị ka “Banyere Onyinye dị nsọ nke Tempụl” na “Kwadoo maka Ụlọ nke Onyenwe anyị.” Kwe ka nwa gị jụọ ajụjụ ọbụla ndị ha nwere banyere tempụl. Maka odudu banyere ihe i nwere ike ikwu maka ya na mpụta tempụl, lee ozi nke Okenye David A. Bednar “A Kwadoro Ịnata Ihe Niile Dị mkpa” (Liahona, Me 2019, 101-4; lee kacha nke nkeji akpọrọ “Ọmụmụ ihe Dabeere Ebe obibi na nke Nzukọ nsọ Kwadoro na Nkwadobe Tempụl”)

  • Dị ka gị na nwa gị na-esonye na-eme ihe ma ọ bụ na-agba aka ebe emume nsọ ndị ọzọ (dị ka oriri nsọ ma ọ bụ ngọzi nke ọgwụgwọ), were obere oge kparịta ụka akara ngosi dị niime emume nsọ ahụ. Kedụ ihe akara ndị a nọchitere? Kedụ otu ha si na-agba ama Jizọs Kraịst? Nke a nwere ike inyere nwa gị aka kwadoo ịtụgharị uche na mpụtara akara ngosi nke emume nsọ tempụl niile, nke nakwa agba ama banyere Jizọs Kraịst.

  • Nyere nwa gị aka mata otu ha si na-edebe ọgbụgba ndụ baptizim akọwara niime Mozaya 18:8–10, 13. Nyekwara nwa gị aka mata otu Onyenwe anyị si na-agọzi ha. Mee ka nwa gị nwee obisiike niime ike ha nwere idebe ọgbụgba ndụ niile.

  • Kwuo okwu na-ezoghị ọnụ na ugboro ugboro banyere otu ọgbụgba ndụ tempụl gị si edu nhọrọ gị niile ma na-enyere gị aka bịaruo Jizọs Kraịst nso. I nwere ike jiri Akwụkwọ ntuziaka Izugbe, 27.2, iji nyochagharịa ọgbụgba ndụ ndị anyị na-eme niime tempụl. Ọ bụrụ na ị natawo onyinye dị nsọ, gwa nwa gị banyere otu gament nke tempụl si enyere gị aka cheta ọgbụgba ndụ gị na Jizọs Kraịst (lee “Uwe Tempụl Dị nsọ” [vidiyo], Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma).

4:12

Sacred Temple Clothing

From ancient times, men and women have embraced sacred music, different forms of prayer, religious vestments full of symbolism, gestures and rituals to express their innermost feelings of devotion to God.

Ije ozi Mishọn

Okenye Devid A. Bednar kuziri: “Otu ihe kachasị mkpa i nwere ike ime iji kwadoo maka ọkpụkpọ oku ije ozi bụ ịghọ onye mgbasa ozi ọma ogologo oge tupu gị agaa mishọn. … Isiokwu abụghị ịga mishọn; kama, isiokwu bụ ịghọ onye mgbasa ozi ọma na ije ozi n’oge ndụ anyị niile jiri obi anyị niile, ike, uche, na ume. … Ị na-akwado maka ọrụ mgbasa ozi ọma oge ndụ” (“Ịbụ Onye mgbasa ozi ọma,” Liahona, Nọv. 2005, 45–46). Nhụmiihe niile nwa gị nwere ịbụ onye mgbasa ozi ọma ga-agọzi ha ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị naanị maka oge ha nwere ike ije ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma.

Ịmụtakwu ọzọ, lee Russell M. Nelson, “Ikwusa Ozi ọma nke Udo,” Liahona, Me 2022, 6–7; M. Russell Ballard, “Ije ozi Mgbasa Ozi ọma Gọziri Ndụ M Ruo Ebighị ebi,” Liahona, Me 2022, 8–10; “Nkwadobe Mgbasa ozi ọma: Ịnọzigharị na Ndụ Mgbasa Ozi ọma,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

  • Mepụta otu esi ekesa ozi ọma n’ụzọ eke niile. Dịrị njikere oge niile nye oghere niile ikesara ndị ọzọ mmetụta gị niile banyere Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta na ngọzi niile ịnatara site na ozi ọma nke Onye Nzọpụta eweghachitere na dị ka onye otù Nzukọ nsọ Ya. Kpọkuo ndị ọzọ isonye ezi na ụlọ gị niihe omume Nzukọ nsọ na ndị nke metụtara ezi na ụlọ gị.

  • Chọgharịa ohere niile maka ezi na ụlọ gị inwe mmekọrịta ha na ndị mgbasa ozi ọma. Kpọkuo ha ikuziri ndị enyi unu, ma ọ bụ nye ohere ikwe ka ha kuziere ndị nọ n’ebe obibi unu ihe. Jụọ ndị mgbasa ozi ọma banyere nhụmiihe ndị ha na-enwe na otu ije ozi mgbasa ozi ọma si enyere ha aka bịarute Jizọs Kraịst nso. Jụọkwa ihe ha mere (ma ọ bụ cheburu na ha mere) iji kwadoo ịbụ ndị mgbasa ozi ọma.

  • Ọ bụrụ na ị jere ozi mishọn, kwuo okwu na-ezoghị ọnụ ma ugboro ugboro banyere nhụmiihe gị niile. Ma ọ bụ kpọkuo ndị enyi ma ọ bụ ndị otù ezi na ụlọ ndị jere mishọn ikwu okwu banyere nke ha. I nwekwara ike kwuo okwu banyere ụzọ ndị i siworo kesaa ozi ọma nye ndị ọzọ oge ndụ gị niile. Nyere nwa gị aka chee maka ụzọ ndị ha nwere ike i si ekesa ozi ọma.

  • Nye nwa gị ohere niile ikuziri ezi na ụlọ gị ụkpụrụ niile nke ozi ọma. Nwa gị nwekwara ike nwalee ikesa nkwenye ha nye ndị ọzọ. N’ịmaatụ, i nwere ike kparịta ụka n’ajụjụ ndị dị ka “Kedụ otu anyị ga-esi akọwa Akwụkwọ nke Mọmọn nye onye na-anụtụbeghị ya mbụ?” ma ọ bụ “Kedụ otu anyị ga-esi akọwa mkpa inwe Onye Nzọpụta nye onye na-abụghị Onye otu Kraịst?”

  • Nyere nwa gị aka nwee obi iru ala ịna agwa ndị mmadụ okwu. Gịnị bụ ụfọdụ ezigbo ụzọ ndị eji amalite mkparịta ụka? Gbaa nwa gị ume ịmụ otu esi ege ntị nye ihe ndị ọzọ na-ekwu, ghọta ihe dị n’obi ha, ma kesaa eziokwu niile nke ozi ọma nke nwere ike ịgọzi ndụ ha.

  • Chọọ ohere niile maka nwa gị ịmụ banyere omenaala na okpukperechi nke ndị ọzọ. Nyere ha aka mata ma sọpụrụ ụkpụrụ ndị dị mma ma bụrụ eziokwu niime nkwenye nke ndị ọzọ.

Ịnata Emume nsọ nke Nrachi

Niime tempụl, otu di na Nwunye nwere ike lụọ ruo ebighị ebi. Nke a na-eme niime emume nsọ akpọrọ “nrachi.” Ọbụladị na-emume nsọ nke a nwere ike bụrụ ọtụtụ afọ niihu maka nwa gị nwanyị ma ọ bụ nwoke, ụmụ ihe ndị dị ntakịrị, dị mfe, ị na-emekọta ọnụ na-adịgide n’oge afọ ndị ahụ nwere ike nyere ha aka kwadoo maka ngọzi nke a dị ịtụnaanya.

  • Gụkọtanụ ọnụ “Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa” (Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Kedụ ihe ọkwa nke a a mara na-akuzi banyere obi ụtọ niime ndụ ezi na ụlọ na banyere alụmdi na nwunye na-eme nke ọma? Gị na nwa gị, họrọ otu niime ụkpụrụ ndị edepụtara niime ọkwa iji mụọ ihe. I nwere ike chọgharịa akwụkwọ nsọ metụtara ụkpụrụ ahụ niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ. I nwekwara ike hiwe ebumnuche itinye ụkpụrụ ahụ ebe ọ kachasị zuo oke n’ezi na ụlọ gị. Dị ka ị na-arụ ọrụ n’ebumnuche gị niile, kparịkọtanụ ụka na mpụtara nke ibi ndụ ụkpụrụ ahụ nwere na ndụ ezi na ụlọ.

  • Gị na nwa gị, gụọ ozi nke Onyeisi Dieter F. Uchtdorf “N’Otito nke Ndị ahụ Na-azọpụta” (Liahona, Me 2016, 77-80). Mgbe ị bịaruru na nkeji nke akpọrọ “Obodo nke Ihe mkpofu niile,” i nwere ike chọọ maka ihe ndị dị niime ebe obibi gị nke a ga-ekpofu ekpofu na ihe ndị ọzọ na-agaghị ekpofu. Kwuo banyere otu i si ejikwa ihe n’ụzọ dị iche mgbe ị chọrọ ka ha nọtụkwuo. Kedụ aro nke a na-atụpụta banyere otu anyị kwesịrị iji emeso alụmdi na nwunye na mmekọrịta niile nke ezi na ụlọ? Kedụ ihe ọzọ anyị na-amụta site n’ozi nke Onyeisi Uchtdorf banyere otu Onye Nzọpụta nwere ike i si enyere anyị aka wulite alụmdi na nwunye na ezi na ụlọ ndị siri ike?

  • Ezokwala ọnụ n’ebe nwa gị nọ banyere ihe ndị gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-amụta banyere inwe alụmdi na nwunye dị ebighị ebi dabeere na Kraịst na ụzọ ndị i si na-agbalị imetazi. Ọ bụrụ ma gị na nwunye ma ọ bụ di gị arachiwo niime tempụl, gosi nwa gị site n’ọmụmaatụ otu i si na-agba mbọ iji debe ọgbụgba ndụ gị na Onyenwe anyị. Gwa nwa gị otu i si na-agba mbọ ime Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta isi nke mmekọrịta unu na otu Ha si na-enyere gị aka (lee kwa Ulisses Soares, “Na Mmekọrịta gị na Onyenwe anyị,” Liahona, Nọv. 2022, 42-45).

  • Mgbe ọ dị mkpa ime mkpebi nke ezi na ụlọ, meenụ kansụl ezi na ụlọ na mkparịta ụka niile. Hụ na echiche nke ndị otù ezi na ụlọ ka anụrụ ma ji kpọrọ ihe. Jiri mkparịta ụka ndị a dị ka ohere imepụta nzikọrịta ozi dị mma na obi ọma niime mmekọrịta ezi na ụlọ, ọbụna mgbe na-abụghị onye niile na-ahụta ihe n’otu ụdị ụzọ ahụ kwa. (Lee M. Russell Ballard, “Kansụl Ezi na ụlọ,” Liahona, Me 2016, 63–65.)

  • Mgbe e nwere nghọtahie ma ọ bụ esemokwu niime ezi na ụlọ, gosipụta ndidi na ọmịiko. Nyere nwa gị aka hụta otu ijikwa esemokwu n’ụzọ ndị dị ka Kraịst ji nwere ike inyere ha aka kwadoo maka alụmdi na nwunye obi ụtọ. Gụkọtanụ ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:41–42, ma kwuo okwu banyere otu enwere iji tinye ụkpụrụ ndị dị niime amaokwu ndị a niime alụmdi na nwunye.