Ọgbakọ Zuru ọha
Oge Ekwesịrị Ịnata Ngọzị nke Onye petrak
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


10:47

Oge Ekwesịrị Ịnata Ngọzị nke Onye petrak

Mgbe unu natara ngọzi nke unu, unu ga amata ma nwee mmetụta otu Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst si hụ unu naanya ma ọtụ Ha sị lekwasị anya n’ebe unu nọ n’otu n’otu.

Ụnyahụ ezigbote enyim Okenye Randall K. Bennet kwuru banyere ngọzị niile nke onye petrak. Ọ bụ ozi magburu onwe ya ma ọ kpaliri mmụọ anyị niile. Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, unu ọ ga ekwe m ka m kwuokwa banyere ngọzị nile nke onye petrak? Ndị Petrak, dịka arịrịọ maka ngọzị niile nke onye petrak ga-amụbanye, A na m ekpe ekpere na Onyenwe anyị ga-agọzị unu dịka unu na-aga n’ ihu imezu ọkpụkpọ okù unu.

Dịka oge m n’aga ọgbakọ niile nke stek, a na m ezutekarịrị onye petrak nke stek ahụ ya na nwunye ya. Ndị petrak bụ ndị ndu nke Chineke kpọrọ dị jụụ, dịrị nrube isi ma dịrị ịtụnanya. Ha n’akọrọ m ọtụtụ nhụmịhe nke ime mmụọ dị ịtụnanya. A na m ajụ ha maka afọ ole onye kachasị dị nta gbara na nke onye kachasị mee okenye dị onye ha nyeworo ngọzi. Rute ugbua onye kachasị nta dị 11, ma nke kachasị mee okenye dị 93.

A natara m ngọzi onye petrak nke onwem dịka onye otù ọhụrụ nke Nzukọ nsọ mgbe m nọ afọ 19, nke bụ afọ abụọ e mere m baptizim. Onye petrak nke m kara ezigbote nka. Ọ batara Nzukọ nsọ n’afọ 1916 ma ọ bụbụrụ onye mbute ụzọ nke Nzukọ nsọ n’ime Japan. Ọ bụụrụ m ihe nkwanye ugwu ịnata ngọzi onye petrak nke m site n’aka onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị nke a ama ama. Asụsụ Japan nke ya rara m ezigbo ahụ ịghọta, mana ọ dị ezigbo ike.

Ndị petrak m zuteworo na-agwa m na ọtụtụ ndị mmadụ na anata ngọzi niile nke onye petrak ha nanị tupu ha eje ozi mgbasa ozi ọma. Ezigbo ndịikom nta nkem, ndịiyom nta, ndị nne na nna, ndị bishọp, ngọzị niile nke onye petrak abụghị naanị maka nkwado ije ozi mgbasa ozi ọma. Ndị otù tozuru oke nwere ike ị nata ngọzi onye petrak nke ha mgbe ọge ahụ ziri ezi maka ha.1

Ezi ndị otù ndị toro eto, ụfọdụ nime unu anatebeghi ngọzi niile nke onye petrak nke unu. Chetakwa, enweghi afọ a n’eji etofe ya.

Nne nwunye m bubụrụ onye otù kwụsriri ike, n’eje ozi dịka onye nkuzi nime Otù Enyemaka tutu ruo mgbe ọ nwụrụ mgbe ọ gbara afọ 91. O wutere m ị mata na ọ nataghị otu ngọzị nke onye petrak. Ọ gabigara ọtụtụ ihe isi ike na ndụ ya, ma nihi ọ nweghi onye ji ọkwa nchụaja nime ebe obibi, ọ nataghị ọtụtụ ngọzi niile nke ọkwa nchụaja. Ngọzi onye petrak gaara enye ya nkasị obi n’oge ọ chọsiri ya ike.

Ndị toro eto, ọbụrụ na unu anatebeghi ngọzi niile nke onye petrak, biko unu echegbula onwe unu! Oge nke ime mmụọ nke onye ọbụla dị iche iche. Ọ bụrụ na ịgbara 35 mọbụ 85 ma i nwere mmasị, kwusara bishọp gị banyere inata ngọzi nke gị.

Ndị otú ọhụrụ nke Nzukọ nsọ, unu anụwo banyere ngọzi niile nke onye petrak? A mabughị m maka ohere nke ịnata nke a n’oge ahụ m batara Nzukọ nsọ, mana onye bishọp m dị ihụnanya gwara m maka ngọzị niile nke onye petrak ma gbaa mụ ume ịkwado ịnata nke m mgbe m mesiworo baptizim. Ezigbo ndị otù ọhụrụ nke m, ịnwere ike ịnata ngọzị nke onye petrak n’otu aka ahụ. Onyenwe anyị ga enyere gị aka kwadowe maka ohere nke a dị nsọ.

K’anyị lebara anya nime ebumnuche abụọ nke ngọzị nke onye petrak:

  1. Ngọzị onye petrak nwere ndụmọdụ nke onwe nke sitere n’aka Onyenwe anyị nye anyị.2

  2. Ngọzi onye petrak na-ekwpụta agbụrụ gị nʼime ụlọ nke Israel.

Ngọzị unu nke onye petrak bụ ozi sitere na Nna nke Eluigwe ma ọ g’adịkwa ka ọ gụnyere nkwa niile na ndụmọdụ mmụọ kwalitere maka iduuru unu ogologo ndụ unu. Ngọzị nke onye petrak agaghị arọpụta otu ndụ unu g’esi aga mọbụ zaa ajụjụ niile unu nwere. Ọ bụrụ na ọ kwughi banyere otu emume dị mkpa mere na ndụ gị, ewekwala na nke a pụtara na ị gaghị enweta ohere ahụ. N’otu aka ahụ, iwu emegideghi ya na ịhe niile dị nime ngọzi gị ga emezurịrị na ndụ nke a. Ngọzị nke onye petrak dị ebighị ebi, ma ọ bụrụ na i bie ndụ zuru oke, nkwa niile ahụ nke a n’emezughi na ndụ nke a ga-abịarịrị na ndụ nke ọzọ.3

Dịka unu na anata nkwupụta nke agbụrụ unu, unu g’abịa mata na unu bụ nke ụlọ nke Israel ma mkpụrụ nke Abraham.4 Ị ghọta ịdị mkpa nke ihe a dị, lekwasị anya na nkwa niile nke Onyenwe anyị meere nye ụlọ nke Israel site na Abraham.

Nkwa ndị ahụ gụnyere:

  • “Ụmụ ụmụ ya g’adịrị ọtụtụ (lee Jenesis 17:5–6; Abraham 2:9; 3:14).

  • “Mkpụrụ ya, mọbụ ụmụ ụmụ ya, ga anata ozi ọma ahụ ma ha ga ebu ọkwa nchụaja ahụ (lee Abraham 2:9).

  • “Site n’ije ozi nke mkpụrụ ya, ‘ezi na ụlọ niile nke ụwa [ga enwe ike] nwee ngọzi, ọbụna jiri ngọzi niile nke Oziọma, nke bụ ngọzi niile nke nzọpụta, ọbụna nke ndụ ebighi-ebi’ (Abraham 2:11).”5

Dịka ndị otù nke Nzukọ nsọ, anyị bụ ụmụ nke ọgbụgba ndụ ahụ.6 Anyị na anabata ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ nke Abraham dịka anyị n’erube isi nye iwu niile na emume-nsọ niile nke oziọma.

Nkwadobe maka ngọzi onye petrak nke gị ga enyere gị aka bawanye okwukwe gị n’ebe Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist nọ. Ma mgbe ị natara ngọzi onye petrak gị ma gụọ ma tulee ya, ị nwere ike ịlekwasi anya na Ha karịa na mbụ.

Onyeisi Thomas S. Monson kọwara na “Otu Onyenwe anyị ahụ onye wepụtara Liahona nye Lehi, taa na-ewepụtakwara maka gị ma maka mụ otu onyinye dị ụkọ ma nwee uru maka ịnye ndụ anyị niile odudu, maka igosipụta ihe egwu niile maka nchekwa anyị, ma maka ị gosipụta ụzọ, ọbụna ụzọ nchekwa—n’abụghị ruo na ala e kwere na nkwa, kama ruo n’ebe obibi anyị nke igwe.”7

Ezi ndị bishọp nke m, ndị nne na nna, ndịisi kworum nke ndị okenye na nke ndị Otù Enyemaka, ndị ndu mgbasa oziọma nke ngalaba ukwu, ndị ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị ije ozi nlekọta, biko gbaanụ ume nye ndị ikom nta na ndịiyom nta ahụ, ndị otù toro eto, ma ndị otù ọhụrụ ndị na anatebeghi ngọzị nke onye petrak ha, ka ja chọọ odudu na enyemaka nke Onyenwe anyị maka ịkwadobe onwe ha ịme otu ahụ.

Mgbe na mgbe ma jiri ekpere ka m na agụ ngọzi onye petrak nke m; ọ n’enye m agbam ume obi oge niile. A na m akọta ihe Onyenwe anyị chọrọ n’aka m, ma ọ nyewom aka chegharịa ma dịrị umeala. Mgbe m n’agụ ma na-atule ya, a na m enwe mmasị i bi ndụ ntozu oke nke ịnata ngọzi ya niile ekwere na nkwa.

Dịka akwụkwọ nsọ nke anyị gụworo ọtụtụ mgbe na enwe ihe nkọwa ọhụrụ mgbe emesịrị, ngọzị nke onye petrak ga enwe nkọwa dị iche nyere anyị n’ọge ọbụla dị iche iche. Nke mụ nwere nkọwa dị iche ugbua karịa otu ọ nwere mgbe m ndị afọ 30, ma mgbe m dị afọ 50. Ọ bụghị na mkpụrụ okwu ndị ahụ gbanworo, kama anyị n’ahụ ha n’ụzọ dị iche.

Onyeisi Dallin H. Oaks ekwupụtawo na ngọzi onye petrak “ka a n’enye n’okpuru mkpali nke Mmụọ Nsọ ma ekwesịrị ịgụ ya ma tapịa ya n’okpuru mmetụta nke otu ụdị Mmụọ ahụ. Ihe nkọwa na ọpụrụiche nke ngọzi onye petrak ka a ga-akụzi ahịrị n’elu ahịrị dịka oge n’agafe site n’ike nke otu ụdị Mmụọ ahụ nke kpalitere [ya].”8

Ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị, A na m agba akaebe na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ọ Hụrụ naanya Naanị, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, dị ndụ. Ha hụrụ anyị n’anya. Ngọzị niile nke onye petrak bụ onyinye dị nsọ nke sitere n’aka Ha. Mgbe unu natara ngọzi nke unu, unu ga amata ma nwee mmetụta otu Ha si hụ unu naanya ma ọtụ Ha sị lekwasị anya n’ebe unu nọ n’otu n’otu.

Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ama ọzọ nke Jizọs Kraịst. Enwere m obi ekele ị nata nduzi n’aka onye amụma dị ndụ, Onyeisi Russell M. Nelson.

Enwere m ezigbote obi ekele maka Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. N’ụbọchị Sọnde Ista nke a, A ga m elekwasị anya n’ebe Ọ nọ ma n’ebe Mbilite n’ọnwụ Ya nọ, ma fee Ya ofufe ma nye ekele maka aja Ya. A ma m na Ọ tara ahụrụ dị omimi n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. A ma m na O bilitere n’ọnwụ n’ihi ịhụnanya Ya n’ebe anyị nọ. Ọ dị irè. Otu a ka m si gbaa ama n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee Akwụkwọ ntụzi aka Zuru ọha: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a,, 18.17, ChurchofJesusChrist.org.

  2. Lee “Ngọzị niile nke Onye Petrak,” nime Ikwụdesi ike N’ọkwukwe ahụ (2004), 112.

  3. Lee “Ngọzị niile nke Onye Petrak,” nime Ikwụdesi ike N’ọkwukwe ahụ, 113.

  4. Lee Abraham 2:10.

  5. Ọgbụgba ndụ Abraham,” nime Ikwụdesi ike N’ọkwukwe ahụ, 5.

  6. Lee 3 Nefi 20:25–26.

  7. Thomas S. Monson, “Ngọzị nke Onye Petrak Gị: Liahona nke Ihè,” Ensign, Nov. 1986, 65.

  8. Dallin H. Oaks, “Ngọzị niile nke Onye petrak,” Ọgbakọ Ọzụzụ Ndị-ndu niile nke Gburu gburu ụwa: Onye petrak ahụ, Jan. 8, 2005, 10.