Ọgbakọ Zuru ọha
Lekwasị anya na Jizọs Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Lekwasị anya na Jizọs Kraịst

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ọ bụ ihe ngwọta nye nsogbu anyị niile, mana anyị ga-ebulirị anya anyị elu ma welie anya anyị ịhụ Ya.

Nna m nara agwa m, “Elekwasịla anya nke ukwuu na nsogbu ndị ahụ nke ị n’aghị ahụ ọziza ya.”

A na m agba ama na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụ ọzịza nye ọbụna nsogbu anyị niile kacha sie ike. Kpọmkwem, O meriela nsogbu anọ nke n’ezute onye ọbụla nime anyị na nke ọ dịghị onye nime anyị pụrụ idozi n’onwe anyị:

  1. Nsogbụ nke mbụ bụ ọnwụ anụ ahụ. Anyị nwere ike ịgbalị igbu oge ya mọbụ leghara ya anya, mana anyị enweghị ike imeri ya n’onwe anyị. Jizọs Kraịst, otu o sila dị, meriri ọnwụ n’ihi anyị, na n’ihi nke a, a ga-akpọlite anyị niile n’ọnwụ otu ụbọchị.1

  2. Nsogbu nke abụọ gụnyere mkpagbu niile, ahụmihe ndị tara akpụ, mwute, ihe mgbu, na ikpe na-ezighị ezi nke ụwa. Jizọs Kraịst meriri ihe ndị a niile. Maka ndị ahụ na-agbalịsi ike iso Ya, otu ụbọchị Ọ “ga-ehichapụ anya mmiri niile” ma mee ka ihe niile zie ezi ọzọ.2 Ka ọ dị ugbu a, Ọ pụrụ ime ka anyị sie ike iji obi ike, obi ụtọ, na udo gabiga ọnwụnwa anyị niile.3

  3. Nsogbụ nke atọ bụ ọnwụ ime mmụọ nke na-esi na mmehie pụta. Jizọs Kraịst meriri nsogbu a site na-iwụkwasị onwe Ya “ahụhụ nke udo anyị.”4 N’ihi aja mgbaghara mmehie Ya, anyị nwere ike nwere onwe anyị site na nsonaazụ nke mmehie anyị ọbụrụ na anyị nwee okwukwe na Onye Nzọpụta, chegharịa n’ezi-okwu, nabata ọgbụgba ndụ nke Nna na-enye anyị site na emume-nsọ dị mkpa dịka baptizim, na ịtachi obi ruo ọgwụgwụ oge.5

  4. Nsogbu nke anọ bụ ágwá anyị niile na-ezughị oke. Jizọs Kraịst nwekwara ọziza ahụ nye nsogbu a. Ọ bụghị naanị na ọ na-ehichapụ njehie anyị niile ma mee ka anyị dị ọcha ọzọ. O nwere ike ịrụ ọrụ “nnukwu mgbanwe n’ime … obi anyị niile, na anyị enwekwaghị ọchịchọ ịme ịhe ọjọọ kama ịme ịhe ọma esepụghị aka.”6 Anyị nwere ike izuoke site na amara nke Kraịst ma dịrị ka Ya otu ụbọchị.7

Ịdị nwute, ọtụtụ mgbe anyị na-etinye uche nke ukwuu n’elu nsogbu anyị niile nke na-eme ka anyị hapụ ịlekwasị anya na ngwọta ya, Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. O lee otu anyị ga-esi zere mmejọ ahụ? E kwenyere m na aziza ya dabere na ọgbụgba ndụ niile a kpọrọ ka anyị na Nna anyị nke Eluigwe mee.

Ilekwasị Jizọs Kraịst anya site na Ọgbụgba ndụ niile.

Ọgbụgba ndụ anyị niile na-enyere anyị aka ilekwasị anya anyị, echiche anyị, na omume anyị niile na Kraịst. Dịka anyị “na-arapara na ọgbụgba ndụ niile nke [anyị] meworo,” ọ ga-adiri anyị mfe ịhụ “ihe niile nke ụwa nke a” nke anyị kwesịrị “ịtọgbọ iche” na “ihe niile nke [ụwa] ka mma” anyị kwesịrị ịchọsike.8

Nke a bụ ihe ụmụ Amọn mere nime Akwụkwọ nke Mọmọn. Dịka ha mụtara banyere Jizọs Kraịst ma malite ịdebe ndụ ha n’ebe Ọ nọ, ha ghọtara na ha kwesịrị ili ngwa agha ha niile ma bụrụ ndị eziokwu zuru oke na “ndị ahụbara ama n’ihi ọnụnụ ọkụ n’obi ha n’ebe Chineke nọ.”9

Idebe ọgbụgba ndụ na-eduga anyị ịchọ ihe ọbụla nke na-akpọku mmetụta nke Mmụọ ma jụ ihe ọbụla na-achụpụ ya—“n’ihi na anyị mara na ọbụrụ na anyị ga-eru eru maka ọnụnọ nke Mmụọ Nsọ, anyị nwekwara ike iru eru ibi n’iru nke Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst.”10 Nke a nwere ike ịpụta na anyị ga-agbanwe okwu anyị, na-eji okwu niile ndị dị nrọ. O nwere ike ịpụta iji ágwá ọhụrụ na-ewusi mmekọrịta anyị na Onyenwe anyị ike, dịka ekpere kwa ụbọchị na ọmụmụ akwụkwọ nsọ, nke nanị otu onye na nke onye na ezinụlọ ya, dochie ágwá adịghị mma n’ụzọ ime mmụọ.

Onyeisi Russell M. Nelson kwuru na “onye ọbụla nke mere ọgbụgba ndụ niile na fọnt ndị nke baptizim na niime tempụl niile—ma na-edobe ha—nwere ụzọ bara ụba esi Inweta ike nke Jizọs Kraịst. …

“Ụgwọ ọrụ nke idobe ọgbụgba ndụ niile nke gị na Chineke bụ ike nke eluigwe—ike nke na-agba anyị ume iji nagide mnwale niile, ọnwụnwa niile, na obi mgbu niile n’ụzọ dị mma karịa.”11

Ime ka ọgbụgba ndụ niile dị ọhụrụ n’oge oriri nsọ kwa ụbọchị Sọnde bụ nnukwu ohere iji nyocha onwe anyị12 na ilekwasịkwa anya na ndụ anyị na Jizọs Kraịst. Site na iketa oké oriri nsọ, anyị na-ekwupụta na anyị “na-echeta ya oge niile.”13 Okwu nke a oge niile dị oke mkpa. Ọ na-agbasa mmetụta nke Onye Nzọpụta n’akụkụ niile nke ndụ anyị. Anyị anaghị echeta Ya naanị na nzukọ nsọ mọbụ naanị n’oge ekpere ụtụtụ anyị mọbụ naanị mgbe anyị nọ na nsogbu na mgbe anyị chọrọ ihe.

Ee, mgbe ụfọdụ anyị na-adọpụ uche. Anyị na-echefu. Anyị na-atụfu uche anyị. Mana ime ka ọgbụgba ndụ anyị niile dị ọhụrụ pụtara na anyị chọrọ icheta Onye Nzọpụta mgbe niile, na anyị ga-agbalị ime otu ahụ nime izu ụka dum, ma na anyị ga-akwadoghachi ma tụgharịa uche na Ya ọzọ na tebụl oriri nsọ n’izu ụka na-abịa.

Ilekwasị Jizọs Kraịst Anya nime Ebe obibi Anyị niile

N’ụzọ doro anya, ilekwasị anya n’ebe Jizọs Kraịst nọ ga-abụrịrị ihe karịrị ọrụ nzukọ nsọ, Sọnde. Mgbe Onyeisi Nelson wepụtara Bia, Soro M nime afọ 2018, o kwuru “oge eruola maka Nzukọ nsọ na-ebe obibi.”14 O kwuru na anyị kwesịrị “ịgbanwe ebe obibi [anyị] ka ọbụrụ ebe nsọ nke okwukwe” na “ebe mmụta nke ozi ọma.” Ma okwekwara anyị nkwa anọ ọbụrụ na anyị mee ya.15

Nkwa nke mbụ: Ụbọchị izu ike “unu niile ga-abụ ihe ụtọ n’ezia.” Ọ ga-abụ ụbọchị mgbe anyị abịarukwu Onye Nzọpụta anyị nso. Dịka otu nwa agbọghọ si Peru kwuru, “Ụbọchị nke Onyenwe anyị bụ ụbọchị m na-enweta ọtụtụ aziza site n’aka Onyenwe anyị.”

Nkwa nke abụọ: “Ụmụunu ga-enwe mmasị ịmụta ihe na ibi ndụ nkuzi niile nke Onye Nzọpụta.” Ya mere “anyị na-ekwu maka Kraịst, anyị na-an̄ụrị-ọn̄ụ n’ime Kraịst, anyị na-ekwusa maka Kraịst, … ka ụmụ anyị wee mata ebe ha ga-esi wee lee anya maka nsachapụ nke mmehie ha niile.”16

Anyị na-eme nke a ka otu ụbọchị, mgbe nwa anyị nwoke pụrụ ịrụ ọrụ mọbụ ịga ije n’ugwu mọbụ ịchụ nta anụ nime ọhịa, dịka Inọs mere, o nwere ike cheta ihe anyị kuziri ya banyere Kraịst na ọńụ nke ibi ndụ oziọma. Ma onye maara? Ma eleghị anya nke a ga-abụ ụbọchị mgbe ọ ga-emesị nwee aguu nke ime mmụọ nke ga-eme ka ọ bịakwute Jizọs Kraịst ka o wee nụ olu nke Onyenwe anyị na-agwa ya, “mmehie gị niile ka a gbagharaworo gị, ma ị ga-adị ngọzi.”17

Nkwa nke atọ: “Mmetụta nke onye iro nime ndụ gị na nime ebe obibi gị ga-ebelata.” Maka Gịnị? N’ihi na ka anyị na-elekwasị anya na Jizọs Kraịst, otu ahụ ka mmehie na-efunahụ mmasị ya.18 Dịka ebe obibi anyị niile jupụtara na ihè nke Onye Nzọpụta, ọ na-emelata ohere maka ọchịchịrị nke onye iro.

Nkwa nke anọ: “Mgbanwe niile nime ezinaụlọ gị ga-adị egwu ma na-adịgide.” Maka Gịnị? Maka na mgbanwe ahụ nke Jizọs Kraịst na-eweta bụ “nnukwu mgbanwe.”19 Ọ na-agbanwee ọdịdị anyị niile; anyị na-aghọkwa “ndị e kere ọhụrụ.”20 Anyị na-eji nwayọ na-adị ka Onye Nzọpụta, jupụtara n’ịhụnanya Ya dị ọcha maka ụmụ niile nke Chineke.

O lee ndị na-agaghị achọ ka e mezuo nkwa ndị a niile na ndu ha na ezinaụlọ ha? Kedụ ịhe anyị kwesịrị ime ka anyị nweta ha? Aziza ahụ bụ ịgbanwe ebe obibi anyị niile ka ọbụrụ ebe nsọ nke okwukwe na ebe mmụta nke ozi ọma. Ma o lee otu anyị ga-esi mee nke ahụ? Site na ilekwasị Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst anya, na-eme ka Ha bụrụ isi na ndụ nke ezinaụlọ anyị, mmetụta ahụ kachasị mkpa nime ebe obibi anyị.

Enwere m ike ịtụ aro ka ịmalite site na ime ka okwu niile nke Kraịst, nke a na-achọta nime akwụkwọ nsọ niile, bụrụ akụkụ nke ndụ gị kwa ụbọchị? Enweghị usoro edepụtara maka ọmụmụ akwụkwọ nsọ zuru oke. O nwere ike bụrụ nkeji 5 mọbụ 10 ụbọchị ọbụla—mọbụ karịa ọbụrụ na inwere ike. O nwere ike bụrụ otu isiakwụkwọ mọbụ amaokwu ole na ole otu ụbọchị. Ụfọdụ ezinaụlọ na-ahọrọ ịmụ ihe n’ụtụtụ tupu ha apụọ ga ụlọ akwụkwọ mọbụ ọrụ. Ndị ọzọ na-ahọrọ ịgụ akwụkwọ n’abalị tupu ehie ụra. Ụfọdụ ndị di na nwunye na-eto eto agwala m na ha na-amụ ihe n’otu n’otu n’ụzọ ọrụ ma na-ekerịta nghọta niile n’etiti ha site na ederede ya mere a na-edekọ aziza na mkparịta ụka ha.

Bia Soro M na-enye ọtụtụ aro na akụrụngwa ndị nwere ike inyere ndị mmadụ na Ezi-na-ụlọ niile aka ịmụta ụkpụrụ oziọma niile site na akwụkwọ nsọ niile. Vidio nịịle nkee Baịbụl na nke Akwụkwọ nke Mọmọn nwekwara ike ịbụ ngwa ọrụ bara uru iji mee ka Akwụkwọ nsọ niile na-abịakwute ezinaụlọ gị. Ndi ntorobịa na umuaka na-enwekarị mmụọ nsọ site n’akụkọ niile ndị ha agaghị echefu dị nime akwụkwọ nsọ niile. Akụkọ ndị a na ụkpụrụ niile oziọma ha na-akuzi ga-anọnyere ụmụ unu, dịka ndị enyi a tụkwasịrị obi, mgbe ha chọrọ ezi ihe ịmaatụ niile nke ije ozi, omume ọma, nrube isi, ndidi, ntachi obi, mkpughe nke onwe, afọ ọma, ịdị umeala n’obi, na okwukwe n’ime Jizọs Kraịst. Ka oge na-aga, ịdịgidesị ike unu n’ịgba oriri n’okwu nke Chineke ga-enyere ụmụ unu aka ịbịaru nso na nso Onye Nzọpụta. Ha ga-amakwa Ya otu ọ na-adịtụbeghị mbụ.

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị ndụ taa. O nwere ike iwere ọnọdụ kwa ụbọchị, kwa nime ndụ anyị niile. Ọ bụ Ya bụ ihe ngwọta nye nsogbu anyị niile, mana anyị ga-ebulirị anya anyị elu ma welie anya anyị ịhụ Ya. O kwuru, “Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi-abụọ, atụla ụjọ.”21 Dịka anyị lekwasịrị Ya na Nna anyị nke Eluigwe anya, na-eme ma na-edobe ọgbụgba ndụ niile anyị na Ha, ma na-eme ka Ha bụrụ mmetụta kachasị mkpa n’ebe obibi na ezinaụlọ anyị, anyị ga-abụ ụdị ndị ahụ Onyeisi Nelson tụrụ anya: “Ndị mmadụ nwere ike, dị njikere, na tozuru oke ịnabata Onyenwe anyị mgbe Ọ ga-abịa ọzọ, ndị họrọlarị Jisọs Kraịst karịa ụwa nke a dara ada, ndị mmadụ na-ańụrị ọńụ nọchịchọ ha ibi ndụ n’iwu dị elu karịa, dị nsọ karịa nke Jisọs Kraịst.”22 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta