Olu nke Obi ụtọ!
Iwu tempụl niile abụrụworịị otu n’ime ihe ndị dị mkpa nye ndị amụma kemgbe Onye amụma Josef Smith.
“Ụgbu a, gịnị ka anyị na-anụ n’ozi ọma nke anyị nataworo? Olu nke Obi ụtọ! Olu nke ebere sitere n’eluigwe; na olu nke eziokwu sitere n’ala; … olu nke obi ụtọ maka ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ; ozi ọma niile nke oke ọn̄ụ.”1
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ọ fọrọ nke nta na ọ gaghị ekwe omume ịnụ okwu ndịa site n’aka Onye amụma Josef Smith ma ghara ịdapụ na nnukwu ịmụmụ ọnụ ọchị!
Nkwupụta n’obi ụtọ nke Josef n’ezie n’ejide uju ọńụ dị ebube a na-ahụta n’ime nnukwu atụmatụ obi ụtọ nke Chineke Nna anyị nke Eluigwe, n’ihi na O kwewo anyị nkwa, “Ụmụ mmadụ dị, ka ha wee nwee ọńụ.”2
Anyị niile tipụrụ mkpu ọńụ3 n’ime ndụ tupu ndụ anụ ahụ anyị mgbe anyị nụrụ atụmatụ obi ụtọ nke Chineke, ma anyị na-aganiihu na-eti mkpu maka ọńụ n’ebe a dị ka anyị na-ebi ndụ dị ka otu atụmatụ Ya sịrị dị. Mana gịnị kpọmkwem bụ ọnọdụ maka nkwupụta obi ụtọ nke a site n’aka Onye amụma? Gịnị kpaliri mmetụta ndị a miri emi sitere n’obi?
Onye amụma Josef anọworịị na-akuzi banyere baptizim maka ndị nwụrụ anwụ. Nke a bụ n’ezie mkpughe dị ebube nke a natara n’oke ọńụ. Mgbe ndị otù Nzukọ nsọ mụtara na mbụ na ha nwere ike ime baptizim maka ndị ha hụrụ naanya ha nwụrụ anwụ, ha ńụrịrị. Wilford Woodruff kwuru sị, “Oge ahụ m nụrụ maka ya, mkpụrụ obi m maliri elu [n’ihi] ọńụ!”4
Baptizim maka ndị anyị hụrụ naanya nwụrụ anwụ abụghị naanị eziokwu Onyenwe anyị ga-ekpughe ma weghachi. Enwere igwè nke onyinye ndị ọzọ, ma ọ bụ onyinye dị nsọ niile, nke Chineke diwororịị na njikere inyekwasị n’isi ụmụ Ya ndị nwoke na ụmụ ada Ya.
Onyinye ndị ọzọ gụnyere ikike ọkwa nchụaja, ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile, alụm di na nwunye ndị nwere ike ịnọ ruo ebighị ebi, nrachi ụmụ nye ndị nne na nna ha n’etiti ezi na ụlọ nke Chineke, ma n’ikpeazụ ngọzi nke ịlọghachi ebe obibi n’ihu nke Chineke Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Ngọzi ndị a niile ka emere ịdị irè site n’Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.
N’ihi na Chineke tụlere ndị a ịnọ n’etiti ngọzi Ya niile kachasị elu ma kachasị dị nsọ,5 Ọ nyere iwu na ụlọ nsọ niile ka a ga-ewu ebe O nwere ike inyefe onyinye ndị a dị oke ọnụ ahịa n’isi ụmụ Ya.6 Ụlọ ndị a ga-abụ ebe obibi Ya n’elu ụwa. Ụlọ ndị a ga-abụ tempụl niile ebe ihe ọbụla nke arachiri ma ọ bụ kechie n’elu ụwa n’aha Ya, site n’okwu Ya, ma jiri ikike Ya ka a ga-ekechi n’eluigwe niile.7
Dị ka ndị otù nke Nzukọ nsọ taa, ọtụtụ nime anyị ka o nwere ike ịdịrị mfe iwere eziokwu ebighị ebi ndị a dị ebube were gwurie egwu. Ha abụrụwo ọdịdị nke abụọ nye anyị. Mgbe ụfọdụ ọ na-enyeaka mgbe anyị hụrụ ha site n’anya nke ndị ahụ na-amụ ihe banyere ha na nke mbụ ya Nke a bịara bụrụ eziokwu nye m site na nhụmiihe na-etebeghị anya.
Afọ gara aga, naanị tupu mmegharị nrara nye nke Tempụl Japan Tokyo, ọtụtụ ndị ọbịa na-abụghị nke okpukperechi anyị mere njegharị na tempụl ahụ. Otu n’ime njegharị ahụ gụnyere otu onye ndu na-eche ezigbo echiche sitere na okpukperechi ọzọ. Anyị kuziiri ndị ọbịa anyị banyere atụmatụ nke obi ụtọ nke Nna nke Eluigwe, ọrụ nke Jizọs Kraịst na-agbapụta n’ime atụmatụ ahụ, na ozizi nke na ezi na ụlọ niile ka enwere ike ijikọta ọnụ ebighị ebi site n’emume nsọ nke nrachi.
Na njedebe nke njegharị ahụ, akpọkuru m enyi anyị ikekọrịta mmetụta ya niile. Na nrụtụ aka nye njikọta nke ezi na ụlọ niile—nke gara aga, nke ugbua, na nke ọdịniihu—nwoke ọma nke a jụrụ n’eziokwu niile, “Ọ bụ na ndị otu nke okwukwe gị n’ezie ghọtara nnọọ otu ịdị mma ozizi nke a dị?” Ọ gbakwunyere, “Nke a nwekwara ike ịbụ otu nime nkuzi niile nke nwere ike ijikọta ụwa nke a nke kebiworo otu a.”
Lee oke nlebanya dị otu a. Nwoke nke a abụghị na ịdị nka mara mma nnọọ dị n’ime tempụl metụrụ ya mana kama site n’ozizi dị ịtụnaanya ma dị omimi na ezi na ụlọ niile ka ejikọtara ma rachie nye Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ruo mgbe ebighị ebi.8
O kwesịghị ịtụ anyị naanya, emesịa, mgbe ọbụna onye na-abụghị nke okpukperechi anyị matara ịdị ebube nke ihe na-eme n’ime tempụl. Ihe nwere ike ịdịrị anyị nkiti ma ọ bụ dị n’usoro nye anyị mgbe ụfọdụ ka ndị ọzọ nụrụ ya na-ahụta ma ọ bụ nwee mmetụta ya na nke mbụ ya n’ịma mma na n’ịdị ebube ya.
Na-agbanyeghị na enweworịị tempụl niile mgbe gboo, tinyekọta Mweghachite ozi ọma nke Jizọs Kraịst, mwulite tempụl niile abụrụwo otu nime ihe ndị kachasị dị mkpa nke ndị amụma niile kemgbe Onye amụma Josef Smith. Ma ọ dị mfe ịghọta ihe kpatara ya.
Mgbe Onye amụma Josef nọ na-akuzi banyere baptizim maka ndị nwụrụ anwụ, o kpughere eziokwu ọzọ dị ukwuu. Ọ kuziri: “Ka m mesie obi unu ike n’ihe ndịa bụ ụkpụrụ niile metụtara ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ nke n’agaghị akpọ ihe efu, dị ka ihe metụtara nzọpụta anyị. N’ihi nzọpụta ha dị mkpa ma baa uru nye nzọpụta nke anyị, … ha, asị na anyị anọghị ya a gaghị eme ka ha zuo oke—ọbụghị ma anyị asị ha anọghi ya a ga-eme ka anyị zuo oke.”9
Dị ka anyị na-ahụ, mkpa maka tempụl niile na ọrụ a na-eme ma maka ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ na-edo anya nke ọma.
Onye iro nọ na-eche. Ike ya ka emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile a na-eme n’ime tempụl niile na-eyi egwu, ma ọ na-eme ihe ọbụla o nwere ike ịgbalị ime iji kwụsị ọrụ nke a. Maka gịnị? N’ihi na ọ maara maka ike ahụ nke na-abịa site n’ọrụ nke a dị nsọ. Dị ka aranyere tempụl ọhụrụ ọbụla,ike nzọpụta nke Jizọs Kraịst na-abawanye gburugburu ụwa iji megide mbọ niile nke onye iro na iji gbapụta anyị dị ka anyị na-abịakwute Ya. Dị ka ndị na-aga tempụl na ndị na-edebe ọgbụgba ndụ na-etolite n’ọnụọgụgụ, onye iro na-ada mba.
N’ụbọchị isimbụ niile nke Nzukọ nsọ, ụfọdụ na-echegbu mgbe a ga-ama ọkwa tempụl ọhụrụ, nihi na ha ga-ekwu, “Ọdịghị mgbe anyị malitere iwu tempụl ma asị na mgbịrịgba nke ala mmụọ amaliteghị ịkpọku.” Mana Brigham Young n’obi ike zaghachiri, “A chọrọ m ịnụ ka ha na-akụ ọzọ.”10
N’ime ndụ anụ ahụ nke a, anyị enweghị ike ịgbanarị agha ahụ, mana anyị pụrụ inwe ike megide onye iro ahụ. Ike ahụ na ume na-esite n’aka Jizọs Kraịst abịa dị ka anyị na-eme ma na-edebe ọgbụgba ndụ tempụl anyị.
Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo: “Oge ahụ na-abịa mgbe a ga-ekewapụ ndị ahụ na-anaghị erube isi nye Onyenwe anyị site na ndị ahụ na-erube isi. Ihe mkpuchi anyị kachasị n’inwe nchekwa bụ ịganiihu na-etozu oke nke nnabata n’ụlọ nsọ Ya.”11
Ndị a bụ ụfọdụ ngọzi ndị agbakwunyere Chineke kweworo anyị nkwa site na onye amụma Ya:
Ị chọrọ ọrụ ebube niile? Onye amụma anyị ekwuwo sị: “Ana m ekwe unu nkwa na Onyenwe anyị ga-ewete ọrụ ebube ndị Ọ maara dị gị mkpa dị ka ị na-achụ aja ije ozi ma fee ofufe nime tempụl Ya niile.”12
Ị chọrọ ike ọgwụgwọ na mgbam ume nke Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst? Onyeisi Nelson na-emesigharị anyị obi ike na “ihe niile akuziri n’ime tempụl … na-amụbanye nghọta anyị nke Jizọs Kraịst. … Dị ka anyị n’edobe ọgbụgba ndụ anyị niile, Ọ n’enye anyị onyinye ike ọgwụgwọ Ya nke na-agba ume.” Ma o, otu anyị ga-esi achọ ike Ya nime ụbọchị ndị dị nihu.”13
Na Sọnde Igwunkwụ nke mbụ dị ka Jizọs Kraịst banyere Jerusalem na mmeri, igwe nke ndị na-eso ụzọ Ya “ńụrị[rị] ma too Chineke n’oke olu” na-asị, “Ngọzi dịrị Eze ahụ na-abịa n’aha nke Onyenwe anyị udo n’eluigwe, na ekele n’ebe kachasị elu.”14
Otu itinye nke ahụ na Sọnde Igwunkwụ nke 1836, ka araara nye Tempụl Kirtland. Na mmemme ahụ ndị ozi nke Jizọs Kraịst naara ańụrịkwa. N’ime ekpere nraranye ahụ, Onye amụma Josef Smith mara ọkwa okwu otito ndị a:
“O Onyenwe anyị Chineke Kachasị elu, nụrụ anyị … ma za anyị site n’eluigwe, … ebe ị nọdụụrụ n’oche eze, n’ebube, nkwanye ugwu, ike, ụdị eze, [na] ume. …
“… Nyere anyị aka site n’ike nke Mmụọ gị, ka anyị wee jikọọ olu anyị na nke ndị seraph na-amụke amuke gburugburu oche eze gị, jiri iti mkpu niile nke ịja mma, na-agụ Hosana dịrị Chineke na Nwa atụrụ ahụ!
“Ma kwe ka ndị a … ndị nsọ gị tie mkpụ ọńụ.”15
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, taa nụbọchị Igwunkwụ, ka anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst nyekwa Chineke anyị dị Nsọ otito ma ńụrịa n’ịma mma Ya nye anyị. “Gịnị ka anyị na-anụ n’ozi ọma nke anyị nataworo?” N’ezie “olu nke obi ụtọ!”16
Ana m agba ama na gị ga-enwete ọńụ karịrị akarị dị ka ị na-abanye nime tempụl nsọ niile nke Onyenwe anyị. Ana ma agba ama na gị ga-enwete nhumiihe ọńụ nke O nwere maka gị, n’aha Jizọs Kraịst, amen.