Ọgbakọ Zuru ọha
Ịdị njikere dị ka Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


11:17

Ịdị njikere dị ka Kraịst

“Ma o biliri, wee baara ifufe ahụ mba, ma sị oke osimiri ahụ, Udo, dere duu. Ma ifufe ahụ kwụsịrị, ma ebe niile wee daa jụụ nke ukwuu.” (Mark 4:39).

Oge gara aga m kwuru okwu n’ọgbakọ zuru ọha, ọgọ m nwoke Ryan gosịrị m otu tweet nke sịrị, “Ọ bụ Eziokwu? Aha nwoke ahụ bụ Bragg”—nke pụtara “itu ọnụ”—“ma ọ naghị ekwu okwu ihe banyere ịdị umeala? Ụdị ịla n’iyi dị ka nke a!” Ebe o si dị njọ, ndakpọ olileanya ahụ garaniihu.

Don Bragg dị ka onye ọkụ basketbọl

Nna m dị ịtụnaanya bụụrụ onye ọkụ basketbọl ndị Amerịka Oge niile maka UCLA n’okpuru Onye nkuzi Jọn Wooden a na-ekwu maka ya. Ha dịgidere na mma n’oge ndụ nna m niile, ma ụfọdụ mgbe Onye nkuzi na Ork. Wooden ga-abịa na-ebe obibi anyị maka nri anyasị. Ọ naara enwe obi ụtọ ịgwa m okwu gbasara basketbọl ma ọ bụ ihe ọbụla ọzọ nọ m n’obi. Otu mgbe ajụrụ m ya olee ndụmọdụ o nwere inye m mgbe m banyere afọ ka n’ọkwa nke ụlọakwụkwọ m dị elu. Onye nkuzi mgbe niile, ka ọ sịrị, “Nna gị gwara m na isonyewo Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst, ya mere ama m na I nwere okwukwe niime Onyenwe anyị Site n’okwukwe ahụ hụ na inwere ike ịdị njikere n’ọnọdụ ọbụla. Bụrụ nwoke dị mma n’oke ikuku mmiri.”

Ke mgbe afọ ndị ahụ, nkata ahụ bara niime m. Ndụmọdụ ahụ ịda jụụ, jụọ oyi, ma kpakọta ọnụ niime ọnọdụ niile, nke ka nke n’oge nsogbu na ezughị ike, naara ehi ụda niime m. A naara m ahụta otu ndị otu bọl nke Onye nkuzi Wooden siri kụọ bọl site na-ịdị njikere na nnukwu uru ha nwetere imeri ugboro 10 na-ịsọmpi nke mba niile.

Mana ike ịdị njikere abụghị ihe a na-ekwu okwu ya nnukwu n’oge ụbọchị ugbu a ma megharịa aka oge nta n’oge ọgba aghara na oge nkewa. Ọtụtụ mgbe ọ na-abụ ihe nrụtụ aka n’egwuregwu niile—onye ọkụ bọl dị njikere ka a na-anaghị akwụsị akwụsị n’egwuregwu kpachiri anya ma, ọ bụ otu egwuregwu ekpughee niihi adịghị njikere. Mana ụdị agwa nke a dị ịtụnaanya rutere ihe ndị ọzọ karịrị egwuregwu niile. Ike ịdị njikere nwere abadaba ihe ndị ọzọ ọ na-emetụta na ndụ ma nwere ike gọzie ndị nne na nna, ndị ndu, ndị mgbasa ozi ọma, ndị nkuzi, na onye ọbụla ọzọ na-ezute ihe isi ike nke ndụ.

Ike ịdị njikere niime mmụọ na-agọzi anyị ịda jụụ ma na-elekwasị anya niihe ndị kachasị mkpa mgbe anyị nọ na nsogbu. Onyeisi Hugh B. Brown kuziri, “Okwukwe na Chineke na niime mmeri nke ihe ziri ezi ma emesịa na-enye aka n’ike ịdị njikere nke uche na nke ime mmụọ n’oge ihe isi ike niile.”1

Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye eji ama atụ dị ịtụnaanya nke ike ịdị njikere nke ime mmụọ. Otu mgbe, ebe ọ bụ mgbe ahụ-Dkt. Nelson nọọrọ na-eme quadruple coronary artery bypass, ọbara mgbali elu nke onye ọrịa ahụ gbadara n’otu ntabi anya. Dkt. Nelson jiri nwayọ nyochaa ọnọdụ ahụ ma chọpụta na clamp ka ewepụrụ na mberede site n’aka otu niime ndị otu ya Edoghachiri ya ozugbo, ma Dkt. Nelson kasiri onye otu ahụ obi, na-asị, “A ka m hụkwara gị naanya,” ma mesịa gbakwunye na-egwuregwu, “Mgbe ụfọdụ a hụrụ m gị naanya karịa oge ndị ọzọ!” O gosịrị otu esi ejikwa oge mberede—site n’ike ịdị njikere, lekwasị anya na naanị ihe kachasị dị mkpa—na-ekwu maka ihe mberede ahụ. Onyeisi Nelson kwuru, “Ọ bụ ihe chọrọ ezigbo ọzụzụ onwe nke kachasị elu. Ihe ị gaara eme n’ọnọdụ eke bụ, ‘Wepụ m, onye nkuzi! A chọrọ m ịla n’ebe obibi.’ Mana n’ezie i nweghị ike ya. Ndụ dabeere kpam kpam n’elu ndị otu dum na-awa ahụ. Ya mere ị ga-ada nnọọ jụụ ma weda obi ala ma dị nkọ dị ka ịdịrịị na mbụ.”2

N’ezie, Onye Nzọpụta bụ ekwuchaa ọgwụ n’ọmụmaatụ nke ike ịdị njikere.

Niime Ubi nke Getsemane, n’oke mgbu na-enweghị atụ, dị ka “ọ gbara ọsụsọ dị ka ọ bụ nnukwu ọkpụrụkpụ ọbara,”3 O gosipụtara ọmụmaatụ ike ịdị njikere si na chi site na ịdị mfe ma otu ọ dị n’okwu nwere ugwu, “Ọbụghị uche m, kama uche gị, mee.”4 N’elu oke nsogbu iji kwe ka nzọpụta nke ụmụ mmadụ niile dịrị, Jizọs gosịpụtara ọnọdụ atọ dị mkpa nke nyeere anyị aka ghọta oke ịdị njikere Ya. Nke mbụ, Ọ maara Onye ọ bụ ma dịịrị eziokwu nye ozi Ya si na chi. Nke ọzọ, Ọ maara na enwere nnukwu atụmatụ nke ọńụ. Ma na-ikpeazụ, Ọ maara na site na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ọgwụgwụ, ndị niile ji okwukwe yokukọta onwe ha na Ya site na-ime na idebe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ anatara site n’emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja ka a ga-azọpụta, dị ka akuziri ya nke ọma site n’aka Okenye Dale G. Renlund taa.

Na-ịhọpụta ndịiche dị n’etiti ntufu na njigide ike ịdị njikere, chee echiche gbasara ihe mere mgbe Kraịst na Ndị ozi Ya hapụrụ Ubi nke Getsemane. Mgbe ndị agha zutere ma nwụchie Jizọs, ihe Pita mere bụ itufu ike ịdị njikere ya ma wakpo n’oke iwe site na-ibepụ ntị onye odibo nke onyeisi nchụaja, Makọs. Ihe Jizọs Kraịst mere, n’aka nke ọzọ, bụụrụ idobe ike ịdị njikere Ya ma kụjụọ ọnọdụ kpụ ọkụ site na-ịgwọ Makọs.5

Ma maka anyị onwe anyị ndị ọ na-ara ahụ ijigide ike ịdị njikere anyị ma ikekwe agbagowo n’ịda mba, tụlee maka akụkọ banyere Pita ndị fọdụrụ. Obere oge ihe nke a mechara na obi mgbawa nke ịgọnarị mkpakọta ya na Kraịst,6 Pita guzooro niihu otu ụdị otu ndị ndu okpukperechi ahụ ndị mara Onye Nzọpụta ikpe, ma na nnukwu ike ịdị njikere n’okpuru ịjụ ajụjụ kpụ ọkụ n’ọnụ, ọ gbara ama hoo haa banyere ọdịdị chi nke Jizọs Kraịst7

Mara Onye Ịbụ ma Bụrụ Onye Eziokwu nye Ejiri mara Gị Si na chi

Ka anyị tulee mmewere niile nke ike ịdị njikere dị ka Kraịst. Na-ịmalite, ịma onye anyị bụ na ịbụ onye eziokwu nye ejiri mara anyị si na chi na-eweta ịda jụụ. Ike ịdị njikere dị ka Kraịst chọrọ na anyị ga-agbanarị ịji ndị ọzọ tụnyere onwe anyị ma ọ bụ na-eme ka echee ịbụ onye anyị na-abụghị8 Josef Smith kuziri, “Ọbụrụ na ụmụ mmadụ aghọtaghị agwa nke Chineke, ha aghọtaghị onwe ha.” O kweghị nnọọ omume inwe ike ịdị njikere si na chi na-amaghị na anyị bụ ụmụ ndị nwoke na ụmụada sitere na chineke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya.

N’okwu ya, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi,” Onyeisi Nelson kuziri eziokwu ndị a dị ebighị ebi gbasara onye anyị bụ: anyị bụ ụmụ Chineke, anyị bụ ụmụ ọgbụgba ndụ, ma anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. O mechara kwe nkwa, “Dị ka unu nabatara eziokwu ndị a, Nna anyị nke Eluigwe ga-enyere unu aka rute ebumnoobi nke ibi niihu Ya dị nsọ ruo ebighị ebi ma emesịa,”10 N’ezie anyị bụ ndị nke mmụọ si na chi nwere nhụmiihe nke anụ ahụ Ịma onye anyị bụ na ịbụ onye eziokwu nye ejiri mara anyị si na chi bụ ntọala achọrọ nye mwulite nke ịdị njikere dị ka Kraịst.

Mara Na Enwere Atụmatụ Si na chi

Nke ọzọ, icheta na enwere atụmatụ dịkachara mkpa na-eweta mgbam ume na ike ịdị njikere niime ọnọdụ niile na-eche aka mgba. Nefi nwere ike “gaa ma mee”11 dị ka Onyenwe anyị siri nye ya iwu “na-ebughị ụzọ mara”12 ihe ndị ọ gaara eme niihi na ọ maara na Mmụọ ga-edu ya, na mmejupụta nke atụmatụ dị ebighị ebi nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Ịdị njikere na-abịa mgbe anyị hụtara ihe niile site na nhụnuche dị ebighị ebi. Onyenwe anyị enyewo ndị na-eso ụzọ Ya ndụmọdụ “iwelite anya unu elu”13 na “ikwe ka mmemme niile nke mgbe ebighị ebi nọrọ n’obi unu.”14 Site na-ime mbuibo oge niile na-eche aka mgba dị niime atụmatụ dị ebighị ebi, ezughị ike na-aghọ ohere dị iche iji gosị ịhụnaanya, jee ozi, kuzie ihe, ma gọzie. Ọnọdụ ịhụta ihe dị ebighị ebi na-ekwe ike ịdị njikere dị ka Kraịst.

Mata Ike nke Ime ihe dị na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya

Ma nke ikpeazụ, ike nke dị na Kraịst, nke aja mgbaghara mmehie Ya mere ka okwe omume, na-enye anyị ike ịnagide ma merie. N’ihi Jizọs Kraịst anyị nwere ike mee ọgbụgba ndụ anyị na Chineke ma nwete ume n’idobe ọgbụgba ndụ ahụ. E nwere ike ikekọ anyị na Onye Nzọpụta niime ọńụ na ịda jụụ, na-agbanyeghị ọnọdụ niile nke anụ ahụ.15 Alma isi nke 7 na-akuzi ihe nke ọma banyere ike nke ime ihe dị na Kraịst. Na mgbakwunye nye mgbapụta anyị site na mmehie, Onye Nzọpụta nwere ike gbaa anyi ume niime adịghị ike anyị niile, egwu anyị niile, na niihe aka mgba niile nke ndụ nke a.

Dị ka anyị na-elekwasị anya na Kraịst, anyị nwere ike mee ka egwu anyị belata, dị ka ndị nke Alma mere na Helam.16 Dị ka ndị agha na-eyi egwu gbakọrọ, ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi gosịpụtara ike ịdị njikere. Okenye Devid A. Bednar akuziwo: “Alma nyere ndị kwere ekwe ndụmọdụ icheta Onyenwe anyị na nnapụta ahụ naanị Ya pụrụ inye (lee 2 Nefi 2:8). Ma ọmụma ihe nke nlekọta anya na-enye nchekwa nke Onye Nzọpụta nyere ndị ahụ ike ibelata egwu nke ha onwe ha.”17 Nke a gosịpụtara ike ịdị njikere.

Nnukwu Nwoke Ahụ nọ N’oke ikuku mmiri

Noa kuziiri anyị ọtụtụ ihe gbasara ndidi niime oke ikuku mmiri, mana Onye Nzọpụta bụ onye nkuzi kachasị ihe niile banyere otu esi anya ndụ n’oke ikuku mmiri. Ọ bụ nnukwu nwoke ahụ nọ n’oke ikuku mmiri. Ka otu ogologo ụbọchị nkuzi ihe ya na Ndị ozi Ya gasịrị, Onye Nzọpụta nwere mkpa izu ike ma tụpụta uche ka ha kụfee ofe Oke Osimiri nke Galilee nke ọzọ site n’ụgbọ mmiri. Ka Onye Nzọpụta na-ezu ike, oke ikuku mmiri dị egwu malitere. Ka ikuku na ebili mmiri yiri egwu imikpu ụgbọ mmiri ahụ, Ndị ozi ahụ malitere ịtụ ụjọ maka ndụ ha. Ma chetakwa, ọtụtụ niime Ndị ozi ahụ bụụrụ ndị na-akụ azụ ndị maara nke ọma ihe banyere oke ikuku nke oke osimiri ahụ! Otu ọdị, na oke nchekasị,18 ha kpọtere Onyenwe anyị ma jụọ, “[Onyenwe anyị], ọ bụ na-ọdighị gị mkpa ma anyị laa n’iyi?” Mgbe ahụ, site na ọmụmaatụ nke ịdị njikere, Onye Nzọpụta biliri, wee baara ifufe ahụ mba, ma sị oke osimiri ahụ, Udo, dere duu. Ma ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile … wee daa jụụ nke ukwuu.”19

Ma emesịa otu nnukwu ihe ọmụmụ dị niime ike ịdị njikere maka Ndị ozi Ya. Ọ jụrụ, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Gịnị mere oji bụrụ na unu enweghị okwukwe?”20 Ọ naara echetara ha na Ọ bụ Onye Nzọpụta nke ụwa ma na Ọ bụ Nna zitere Ya iweta na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke ụmụ Chineke. N’ezie, Ọkpara Chineke agaghị ala n’iyi n’ụgbọ mmiri. O gosịrị ọmụmaatụ ịdị njikere si na chi niihi na Ọ maara banyere i si na chi Ya ma Ọ maara na enwere atụmatụ nke nzọpụta na mbuli elu na otu Aja mgbaghara mmehie Ya ga-eji adị oke mkpa na uru dị ebighị ebi nke atụmatụ ahụ.

Ọ bụ site na Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya ka ihe niile dị mma ga-esi abịa na ndụ anyị. Dị ka anyị na-echeta onye anyị bụ, na-amata na enwere atụmatụ nke ebere si na chi ma na-adọrọ mgbam ume n’ike nke Onyenwe anyị, anyị pụrụ ime ihe niile. Anyị ga-achọta ndajụ. Anyị ga-abụ ezi ndịinyom na ndịikom niime oke ikuku mmiri ọbụla.

Ka anyị nwee ike chọọ ngọzi niile nke ịdị njikere dị ka Kraịst, ọbụghị naanị iji nyere onwe anyị aka n’oge ihe aka mgba chere anyị niihu, mana iji gọzie ndị ọzọ ma nyere ha aka merie oke ikuku mmiri dị niime ndụ ha. Na ụbọchị nke a tupu Sọnde Igu nkwụ, ana m eji ọńụ agba aka ebe banyere Jizọs Kraịst. O biliwo. Ana m agba ama banyere udo, ịdị jụụ, na ike ịdị njikere nke eluigwe nke naanị Ya na-ewete na ndụ anyị ma na-eme otu ahụ n’aha Ya dị nsọ, Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Hugh B. Brown,” n’ime Repọọtụ Ọgbakọ, Oct. 1969, 105.

  2. Lee Sheri Dew, Nghọta ndị sitere na Ndụ Onye amụma: Russell M. Nelson (2019), 66–67.

  3. Ntụgharị asụsụ Josef Smit, Luke 22:44 (n’ime Luk 22:44, nkọwadab).

  4. Luk 22:42.

  5. Lee luk 22:50–51; Jọn 18:10–11.

  6. Lee Matiu 26: 34– 35, 69, 75.

  7. Lee Ọrụ 4:8–10; Neal A. Maxwell, “Ojuju afọ site Niihe ndị Enyere Anyị,” Ensign, Me 2000, 74; Liahona, Julaị 2000, 89: “Mgbe enwere nkwekọrịta niime mmụọ, ike ịdị njikere nwere ike ịbịa, ọbụna mgbe anyị na-amaghị ‘mpụtara nke ihe niile’ [1 Nephi 11:17].”

  8. Lee John R. Wooden, Wooden na-ekwu maka Odudu (2005), 50: “Ana m akọwa poise dị ka ịbụ onye eziokwu nye onwe gị, na-atụghị egwu, nkwapụ, ma ọ bụ akwụsighi ike na-agbanyeghị ọnọdụ dị iche iche ma ọ bụ ọnọdụ. Nke a nwere ike daa ka ihe dị mfe, mana Ike ịdị njikere nwere ike ịbụ omume kachasị na-erughị aka n’oge ihe iche aka mgba niile. Ndị ndu na-nweghị Ike ịdị njikere na-enwe obi nkorụpụ n’oge nsogbu.

    Ike ịdị njikere pụtara ijigidesi okwukwe gị ike ma na-eme ihe n’ụzọ ha kwesịrị, na-agbanyeghị otu ịdị njọ ma ọ bụ ịdị mma ọnọdụ ahụ nwere ike ịdị. Ike ịdị njikere pụtara ịgbanarị nkuko ma ọ bụ omume mmegheri anya, ịji ndị ọzọ tụnyere onwe gị, ma na-eme ihe dị ka onye ị na-abụghị. Ike ịdị njikere pụtara inwe obi ike niime ọnọdụ nille dị iche iche.”

  9. Teachings of Presidents of the Church: Joseph Smith (2007), 40.

  10. Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” (worldwide devotional for young adults, May 15, 2022), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.

  11. 1 Nifaị 3:7

  12. 1 Nifaị 4:6

  13. Jọn 4:35

  14. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 43:34; Leekwa Jemis E. Faust, “Ezigbo Ugwu nke Onwe,” Ensign, Me 1981, 10: “Ezigbo ugwu nke onwe ka a na-ehiwe n’ụzọ dị elu site na-ilekwasị anya n’eluigwe na ime ọchịchọ maka ịdị nsọ. Dị ka oke osisi niile, anyị kwesịrị ịgbago elu maka ihe. Isi ihe kachasị dị mkpa anyị nwere ike bịa mata bụ onyinye nke Mmụọ Nsọ. Ọ bụ isi ume na udo nke ime ahụ.

  15. Lee Russell M. Nelson kuziri: “Ọńụ na Ịnya ndụ nke Ime mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 82: “Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ọńụ anyị na-enweta nwere ntakịrị ihe ọ na-eme nye ọnọdụ niile nke ndụ anyị ma nwee ihe niile o nwere ime site na nlekwasị anya nke ndụ anyị.

  16. Lee Mosaia 23:27–28.

  17. Devid A. Bednar, “Ya mere Ha Bịajụrụ Ụjọ Ha,” Liahona, Me 2015, 46–47.

  18. Lee Jeffery R. Holland, Kpando Ụbọchị Anyị Na-ebili: Ime nnyocha Agba Ọhụrụ gị na Jeffery R. Holland (2022), 61–62: Ọzọkwa, ndị a bụụrụ ndịikom nwere nhụmiihe ha na Ya nọ n’ụgbọ mmiri ahụ—iri na otu niime nsinambụ Iri na abụọ ahụ bụụrụ ndị Galili (naanị Judas Iscariot bụ onye Juda). Ma isii niime iri na otu ndị ahụ bụụrụ ndị ọkụ azụ. Ha ebiwo na ọmị ahụ. Ha achọtawo ihe nyere ha ndụ site n’ịkọ azụ na ya. Ha anọworịị ebe ahụ ke mgbe ha bụ ụmụntakịrị. Ndị nna ha mere ka ha na-adụchi ojogoro niile ma na-emezi ihe nụgbọ mmiri ahụ mgbe ha dị nnọọ nta. Ha maara oke osimiri nke a; ha ma ikuku ndị ahụ na ebili mmiri ndị ahụ. Ha bụ ndịikom nwere nhụmiihe—mana oke egwu jidere ha. Ma ọ bụrụ na ụjọ tụrụ ha, nke a bụ oke ikuku mmiri ziri ezi.”

  19. Lee Mak 4:35–39

  20. Mak 4:40