Ọgbakọ Zuru ọha
Ọ Nwere ike Ị gwọ M!
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Ọ Nwere ike Ị gwọ M!

Ike ọgwụgwọ na nke mgbapụta nke Onye Nzọpụta dịrịkwara mberede niile a na-akpachaghị anya mee, nhọrọ n’ezighi ezi, ịma aka niile, ma mnwale n’ụdị ọbụla—gụnyekwara mmehie niile nke anyị.

Moronaị kwere nkwa na ọbụrụ n’anyị gụọ Akwụkwọ nke Mọmọn ma emesịa jiri ezigbo obi, jiri ezigbo ebum-nʼobi, jiri okwukwe na Kraịst, jụọ Chineke Onye Nna nke Ebighị ebi ma nke a ọ bụ eziokwu, Chineke ga-egosipụta eziokwu ya site n’ike nke Mmụọ Nsọ.1 Nde kuru nde mmadụ etinyewo nkwa nke a n’ọrụ ma ha anatawo akaebe n’akasị obi banyere Mweghachite nke oziọma Jizọs Kraịst n’uju ya.

Moronaị n’agba anyị ume, na dịka anyị n’agụ Akwụkwọ nke Mọmọn, k’anyị “cheta otu Onyenwe anyị siri nwe obi ebere nʼebe ụmụ nke mmadụ nọ, site nʼokike nke Adam gbada ruo nʼoge [nke a], … ma [ka] atụgharịa ya nʼuche nʼime obi [anyị] nile.”2 Akụkọ niile na nkụzi niile dị nime Akwụkwọ nke Mọmọn n’echetara anyị ma n’agba akaebe banyere ịhụnaanya, omiko na ebere nke Onye Nzọpụta.

Nna m wụrụ n’Eprel 2013. Dịka m n’akwado maka olili ya, amatara m otu m si bụrụ onye agọziri site n’imata ma ịhụ akwụkwọ nsọ ndị kacha masị ya naanya. Ọ kesaara anyị ha n’ọgbakọ niile nke ezinụlọ, ma ọ gụụrụ mụ ha mgbe m chọrọ ndụmọdụ, odudu, mọbụ ịgbaa okwukwe m ume. A nụrụ m ka ọ na ekesa ha n’okwuchukwu ma n’ọrụ ya niile Ọ bụghị nanị na m maara ha, kama a ka m n’echeta ụda olu ya ma mmetụta ime mmụọ mnwere dịka ọ n’ekesa ha. Site n’ịkesa akwụkwọ nsọ na mmetụta ya niile, nna m nyere m aka hiwe ntọala siri ike nime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Nna m tụmadị hụrụ akụkọ nke nzute Onye Nzọpụta zutere ndị nke Nefi naanya.3 Akụkọ nsọ ahụ bụ maka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst onye biliterewo n’ọnwụ na onye ebuliri elu. Ọ ṅụwo site n’iko ilu ahụ ma taa ahụhụ nye ihe niile k’anyị ghara ịta ahụhụ mọbụrụ m’anyị chegharịa.4 Ọ zutewo ụwa mmụọ ahụ ma ọ haziwo nkwusa ozi ọma n’ebe ahụ.5 O siwo n’ọnwụ bilie, ma Ọ nonyeworoịị Nna ma nata iwu nsọ niile ka ekesaa akwụkwọ nsọ nye ndị Nefi nke ga-agọzi ndudugandu n’abịa n’ihu.6 Ebuliwo Ya elu ma ọ nwetawo ike na ikike ebighị ebi Ya niile Anyị nwere ike ịmụta ihe site n’ihe niile dị nime nkuzi Ya.

Nime 3 Nefi 11, anyị n’agụ otu Onye Nzọpụta siri gbada site n’eluigwe ịkụziri ndị Nefi na Ọ bụ Jizọs Kraịst, onye ahụ ndị amụma gbara akaebe n’ọga abịa n’ụwa. O kwupụtara na Ọ bụ Ihè nke Ụwa na Ọ nyewo Nna otuto site n’iwekwasị onwe ya mmehie nile nke ụwa. Ọ kpokuwo igwè mmadụ ahụ ka ha bịarute ịrụnye aka ha nile n’akụkụ Ya, ma metụ aka n’apa nile nke ntu nile ahụ n’aka Ya abụọ na n’ụkwụ Ya abụọ. Ọ chọrọ ka ha mata na Ọ bụ Chineke nke Israel, onye egburu n’ihi mmehie nile nke ụwa. Ndị mmadụ ji obi ụtọ zaghachi, gawa n’ihu n’otu n’otu tutu ruo mgbe ha niile hụrụ ma mata n’ezie n’ọbụ Ya onye ahụ edere site n’aka ndị amụma nọ ga abia.7

Jizọs kụziri ndị Nefi maka mkpa nchegharị dị, maka ịdị ka nwata ntakịrị, ma mkpa ọ dị ịmee baptizim site n’aka onye ji ikikere Ya. Ọ mesịrị kụzie ọtụtụ ozizi ahụ nke anyị n’amụ n’afọ nke a nime Agba Ọhụrụ.

Nime 3 Nefi 17, anyị n’agụ na Jizọs gwara ndị mmadụ na oge eruwo maka Ya iji gakwuru Nna ma gosi onwe Ya nye ndị agbụrụ furu efu nke Isreal.8 Ọ lepụkwara anya ya gburu-gburu ọzọ n’igwe-mmadụ ahụ, ma Ọ hụrụ na ha nọ n’anya-mmiri, ma lekwasịgide Ya anya dịka ha ga-asị Ya nọnyere kwuo ha nwa ogologo oge.9

Aziza Onye Nzọpụta nye ndị Nefi bụ nke metụtara obi ma nke nwekwara nkụzi. Ma Ọ sịrị, “Lee, afọ m nile jupụtara n’ọmiko n’ebe unu nọ.”10

E kwenyere m na omiko Ya abụchaghị naanị maka anya mmiri ndị mmadụ ahụ. Ọ dịdị ka Ọ n’ahụ ha site na anya niile nke aja mmehie Ya. Ọ hụrụ mgbu nile na mkpagbu nile na ọnwụnwa nile nke ha n’ụdị ọbụla. Ọ hụrụ nrịa nrịa ha niile. Ọ hụrụ adịghị ike ha niile, ma Ọ mara site na ntaram ahụhụ Ya nke n’egbu mgbu n’ebe Getsemani na Golgotha ahụ, otu ọ ga-esi nyere ndị ya aka dịka adịghị ike ha nile siri dị.11

N’otu aka ahụ, mgbe Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst lekwasịrị anyị anya, Ọ n’ahụ ma n’aghọta mgbu ahụ na ibu arọ niile anyị nke mmehie. Ọ n’ahụ ihe ndị riri anyị ahụ ma aka mgba anyị niile. Ọ n’ahụ ndọlị anyị na mkpagbu anyị nille n’ụdị ọbụla—ma O jupụtara n’ọmiko n’ebe anyị nọ.

Mkpoku Ya nke dị amara nye ndị Nefi bu nke sochiri nke a: “Unu nwere ndị na-arịa ọrịa n’etiti unu? Kpọtanụ ha. Unu nwere ndị dara ngwọrọ, ma-ọbụ kpuru-isi, ma-ọbụ ndị na anaghị a ga ije, ma-ọbụ ndị na-enwezughị ụkwụ na aka, ma-ọbụ ndị ekpenta, ma-ọbụ ndị arụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ma-ọbụ ndị ntị chiri, ma-ọbụ ndị nwere nsogbu n’ụdị ọbụla? Kpọta nụ ha ma a ga m agwọ ha, n’ihi na enwere m obi ọmiko n’ebe unu nọ; afọ m nile jupụtara n’obi ebere.”12

Ma ndị mmadụ bịarutere “ha na ndị nile nwere mkpagbu n’ụdị ọbụla; ma ọ gwọro ha, onye ọbụla dịka e siri kpọta ya ha.”13

N’afọ 1990, anyị bi n’obodo ntakịrị nke Sale dị na Victoria, Australia. Anyị ji obiụtọ n’arụ ọrụ dịịrị anyị nke ezinụlọ, Nzukọ nsọ ma ọrụ nke obodo. N’otu ọmalịcha ụbọchị Satọde tupụ Ekeresimesi, anyị kpebiri ịje zute ụfọdụ ogwe egwuruegwu ya na ala dị n’akụkụ mmịrị n’amasị anyị. Mgbe anyị ṅụrịsịrị ọṅụ nke ụbọchị ọma ahụ, n’egwukọrịta egwu dịka ezinụlọ, anyị kpọbara onye ọbụla nime ụgbọala ma lawa ụlọ. Mgbe anyị na anya n’aga, adabara m n’ụra nwantịtị oge wee kpata mberede nke nsukọta isi n’isi ụgbọala. Mgbe nwantịtị oge mnwete onwe gafere, elegharịrị m anya n’ụgbọala ahụ. Nwunye m Maxine nwere otu mgbaji ụkwụ dị ọjọọ ma ọ n’adọlị iku ume. Ọ gbajiwo ọkpụkpụ nke dị ya n’obi. Ụmụ anyị ndị nwanyị atọ nọ n’oke ụjọọ mana ekeledịrị na ha dị mma. Enwere m ntakịrị mmerụ ahụ. Mana nwa anyị nwoke gbara ọnwa anọ anaghị emegharị ahụ.

N’ime etiti nsunobi na mgbagwoju anya ahụ nọ n’ebe mberede ahụ, nwa anyị nwanyị kacha mee okenye Kate, gbara afọ 11, jiri ọsịsọ kwuo, “Nna, ịkwesịrị ịnye Jarọm ngọzị.” Mgbe anyị nwachara ike anyị, mụ na ụmụ m ndị nwanyị esiri na ụgbọala ahụ pụta. Enweghi ike ịtụgharịnwụ Maxine. Ejiri m nwayọ kulie Jarọm elu; emesịa, dịka m ji azụ m dinara n’ala, ejiri m nwayọọ dobe ya n’obi m ma nye ya ngọzi nke ọkwa nchụaja. Tupu oge ahụ ambulans n’abịarụte mgbe nkeji 40 gafere, Jarọm amatawo onwe ya.

N’abalị ahụ, a hapụrụ m ndị otù ezinụlọ m atọ n’ụlọ ọgwụ ma kpọọ taxị ga-akpọlam mụ na ụmụ m ndị nwanyị abụọ ụlọ. N’ime ogologo abalị ahụ, a rịọrịọ m Nna nke Eluigwe ka ndị ezinụlọ m na ndị ọzọ ahụ merụrụ ahụ nime ụgbọala nke ọzọ ahụ gbakee. Nihi ebere, ekpere m ma ekpere anya mmiri nke ọtụtụ ndị ọzọ ka azara. Ha niile ka agwọrọ mgbe oge gasịrị, nke a bụ nnukwu ngọzị na ebere dị nro.

Nagbanyeghi, agara m n’ihu n’enwe ikpe ọmụma dị omimi ma obi nchegharị nihi ụdị ajọọ mberede nke a m kpatara A ga m eteta nime abalị ma bido n’isi n’atụlegharị ihe omume ahụ dị egwu. Adọlịrị m ọtụtụ afọ ahụ ịgbaghara onwe m ma ịchọta udo. Mgbe ahụ, dịka onye ndu ọkwa nchụaja, dịka m n’enyere ndị ọzọ aka ịchegharị ma nyere ha aka nweta mmetụta nke ọmịiko, ebere, ma ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta, a mataziri m na Ọ nwere ike ịgwọ m.

Ike ọgwụgwọ na mgbapụta nke Onye Nzọpụta dịrịkwara mberede a na-akpachaghị anya mee, nhọrọ n’ezighi ezi, ịma aka niile, ma mnwale n’ụdị ọbụla—gụnyekwara mmehie niile nke anyị. Dịka m chigharịrị n’ebe Ọ nọ, mmetụta ikpe ọmụma na nke obi nchegharị ka ejiri wayọ jiri udo na ezumike dochie.

Onyeisi Russell M. Nelson kụziri: “Mgbe Onye Nzọpụta chụrụ aja mgbaghara mmehie maka mmadụ niile, O meghere ụzọ ka ndị ahụ ga-eso Ya wee nwete ike nke ọgwụgwọ, ikwụdosi ike, na mgbapụta. Ohere niile nke ime mmụọ ndịa nọ maka mmadụ niile na-achọ ịnụ olu Ya ma soro Ya.”14

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, ma ibù ibu arọ nke mmehie a na-emezibeghi, mọbụ ị n’ata ahụhụ n’ihi mmejọ nke emere gị ọtụtụ oge gara aga, mọbụ ị na-agba mbọ ịgbaghara onwe gị nihi mberede a na-akpachaghị anya mee, ị nwere ohere ịnwete ike nke ọgwụgwọ na mgbapụta nke Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst.

A na m agba-ama na Ọ dị ndụ! Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị na Onye Mgbapụta anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ nwere omịko n’ebe anyị nọ, O jupụtara n’ebere, ma Ọ nwere ike ị gwọ anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta