Ọgbakọ Zuru ọha
Jizọs Kraịst bụ Ume nke Ndi nne na nna
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Jizọs Kraịst bụ Ume nke Ndi nne na nna

Nyere ụmụ unu aka wulite okwukwe na Jizọs Kraịst, hụ ozi ọma na Nzukọ nsọ Ya naanya, ma kwadobe maka ịme ezi nhọrọ ruo ogologo ndụ ha.

Otu ugboro n’oge, otu nna n’akwado ịpụ gawa nzukọ mgbede nke ndị otù bishọp. Nwa ya nwanyị gbara afọ anọ eguzoro n’ihu ya, yiri uwe nrahụ ụra ma jide otu kọpị nke Akụkọ niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

“Gịnị kpatara iji achọ ị ga nzukọ nke a?” ka ọ jụrụ.

“N’ihi na a bụ m onye ndụmọdụ nime ndị otù bishọp,” ka ọ zara.

Mana ị bụ nna m!” nwa ya nwanyị ekwechịrị.

O sekpuru ala n’ihu ya. “Odịmnobi,” ka okwuru, “A ma m na ịchọrọ ka m gụọra gị ihe ma nyere gị aka rahụ ụra, mana n’abalịa ekwesịrị m ịnyere bishọp aka.”

Nwa ya nwanyị azaghachi, “Ọpụtara na bishọp enweghi nna ọnye ga enyere ya aka rahụ ụra?”

Anyị nwere obi ekele ruo ebighị ebi maka ndị otù n’enweghi ọnụ ọgụgụ ndị n’eji obi ha niile jee ozi nime Nzukọ nke Jizọs Kraịst ụbọchị niile. Ichụ aja nke gị dị nsọ n’ezie.

Mana dịka nwata nwanyị nke a siri ghọta, enwere ihe dịkwa nsọ—ihe n’enweghi ihe eji edochi ya—banyere onye nne na nna izulite nwata. Ọ na-egosipụtakwa ụsoro nke eluigwe.1 Nna anyị nke Eluigwe, Onye Nna nke dị Nsọ, n’ezie n’aṅụrị ọṅụ mgbe a n’akụziri ma n’azulite ụmụ Ya site n’aka ndị nne na nna n’elu ụwa.2

Ndị nne na nna, unu emela maka ihe niile unu n’eme iji zulite ụmụ unu. Ma ụmụaka, unu emela maka ihe niile unu n’eme iji zulite ndị nne na nna unu, nihi dịka nne na nna ọbụla maara, mgbe na mgbe k’anyị n’amụta nnukwu ihe site n’aka ụmụ anyị maka okwukwe, olile anya, ma afọ ọma dịka ha n’amụta n’aka anyị!3

Ndị Nne na Nna Nwere Ọrụ Dị Nsọ

Enwewo mgbe ịchere maka nnukwu ihe ize ndụ nke Nna anyị nke Eluigwe na agabiga n’oge ọbụla O zidatara otu nwata bịa ụwa? Ndịa bụ ụmụ Ya ndị nwoke na nwanyị nke mmụọ. Ha nwere ikike n’enweghi njedebe. Ha kara aka ịbụ ndị mmadụ ebube nwere ịdịmma, amara, ma eziokwu. Nagbanyeghi ha na abịa n’ụwa n’enweghị inyeaka kpam kpam, n’enweghidị ike ịme ihe ọbụla mọbụghị ị bee akwa maka enyemaka. Ụbụrụ ncheta ha maka oge ahụ ha nọ n’ihu Chineke ka ekpuchiri, tinyekwara ọmụma ihe nke onye ha bụ n’ezie ma onye ha nwere ike ị bụ. Nghọta ha nwere maka ndụ nke a, maka ịhụnaanya, Chineke, ma maka atụmatụ ya dabere n’elu ihe ha hụrụ site n’aka ndị mmadụ nọ ha gburugburu—karịsịa ndị nne na nna ha, ndị, n’ezie, n’agba mbọ ịghọta maka onwe ha, otu ihe si aga.

Foto, oyiyi
Nwata amụrụ ọhụrụ

Chineke enyewo ndi nne na nna “ọrụ dị nsọ ịzụlite ụmụ ha n’ihun’anya na eziomume, ịnwetara ha ihe ndị dị mkpa nke anụ ahụ, na nke mmụọ, na ịkuziri ha ka ha… debe iwu-nsọ nile nke Chineke.”4

Nke ahụ zuru ezu i mee tụmadị ndị nne na nna ahụ kachasị ibe ha mma ị mụrụ anya abalị.

Ozi m nye ndị nne na nna niile bụ nke a:

Onyenwe anyị hụrụ unu n’anya.

Ọ nọnyeere unu.

O guzoro n’akụkụ unu.

Ọ bụ ume unu iji duo ụmụ unu ka ha mee ezi nhọrọ niile.

Jiri obisike na ọṅụ nabata ohere na oke n’ọrụ nke a. Anwakwala ihapụrụ onye ọzọ isi iyi nke a esi enweta ngọzị niile nke eluigwe. N’etiti atụmatụ uru na ukpụrụ nile nke ozi ọma, ọ bụ unu ka ọdịnaka idu nwa unu nime ihe niile nke mkpebi niile nke kwa ụbọchị. Nyere ụmụ unu aka wulite okwukwe na Jizọs Kraịst, hụ ozi ọma na Nzukọ nsọ Ya naanya, ma kwadobe maka ịme ezi nhọrọ ruo ogologo ndụ ha. N’ezie, nke ahụ bụ atụmatụ Chineke maka ndị nne na nna.

Setan g’emegide unu, ga emegharị unu anya, ga agba mbọ ịkụda obi unu.

Mana nwata ọbụla nwere Ihè nke Kraịst nke dịka ekwentị enwere ike iji kpọọ eluigwe. Ma Onye Nzọpụta ga enyere unu aka, duo unu, ma gbaa unu ume. Chọọ enyemaka Ya. Rio n’aka Onyenwe anyị!

Foto, oyiyi
Onyenwe anyị Jizọs Kraịst

Dịka otu ahụ Jizọs Kraịst bụ ume nke ndị ntorobịa, Jizọs Kraịst bụkwa ume nke ndị nne na nna.

Ọ N’amụbawanye Ịhụnaanya

Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike itụle ma onye ọzọ ọ kaa anyị tozuo oke idu ma kuziere ụmụ anyị ihe. Mana na-agbanyeghị otu ị sịrị chee na izughi oke, ị nwere otu ihe nke mere ijiri tozuo oke n’ụzọ pụrụiche: ịhụnaanya gị maka nwa gị.

Ịhụnaanya onye nne na nna nwere maka otu nwa bụ otu ikike kachasị sie ike nọ nime mbara eluigwe dum. Ọ bụ otu nime ihe ndị ahụ dị ntakịrị n’elu ụwa nke a g’adị ebighị ebi n’ezie.

Ugbua, eleghi anya ị n’enwe mmetụta na mmekọrịta gị na nwa gị adịghị ka nke ọma ahụ N’ebe a ka ike nke Onye Nzọpụta na-abata. Ọ n’agwọ ndị ọrịa ma Ọ n’agwọ mmekọrịta niile. Ọ mụbara achịcha na azụ, ma Ọ nwere ike ịmụbaa ịhụnaanya na ọńụ nime ebe obibi gị.

Ịhụnaanya ịnwere maka ụmụ unu g’arọpụta ọnọdụ bara ụba maka ịkụzi eziokwu na iwulite okwukwe. Mee ebe obibi gị ụlọ nke ekpere, mmụta, ma okwukwe; ụlọ nke nhụmịhe niile nke ọńụ; ebe nsonye; ụlọ nke Chineke.5 Ma “jiri nu ike nile nke obi unu kpere Nna, ka e wee mejupụta [unu] nʼihụnanya nke [Ya], nke o [nyekwasịworo] ndị … na-eso Ọkpara ya, Jizọs Kraịst.”6

Ọ N’amụbawanye Mbọ niile ndị dị Ntakịrị ma ndị dị Mfe

Ume ọzọ unu nwere, dịka onye nne na nna, bụ ohere maka mmetụta kwa ụbọchị, nke n’aga nihu. Ndị ọgbọ, ndị nkuzi, ma ndị mmetụta niile nke ihe nkiri niile ga abịa ma laa. Mana unu nwere ike ị bụ mmetụta ahụ na anọgide oge niile nime ndụ nke nwa unu.

Mbọ unu niile nwere ike dịrị ka ọ dị ntakịrị mgbe atụrụ ya na olu ndị ahụ dara ụda nke ụmụ unu n’anụ n’ụwa. Mgbe ụfọdụ o nwere ike dị gị ka ị naghị emepụta ihe ahụrụ anya. Mana chetakwa na “site na ihe ntakịrị ka Onyenwe anyị na-esị ewepụta nnukwu ihe nile.”7 Enwere ike otu nnọkọ mgbede nke ebe obibi, otu mkparịta ụka nke oziọma, mọbụ otu ọmụmatụ dị mma enweghi ike ịgbanwe ndụ nke nwa gị n’otu ntabi anya, dịkakwa otu ahụ otu ntasa nke mmiri ozuzo enweghi ike iji mee ka ahịhịa tolite n’otu ntabianya. Mana ịdịgide nke ihe ndị ahụ dị ntakịrị ma dịrị mfe, ụbọchị ruo ụbọchị, n’enye ụmụ unu ọzụzụ n’ụzọ kachasị mma karịa nke ide mmiri nke mgbe ụfọdụ.8

Nke a bụ ụzọ nke Onyenwe anyị. Ọ n’ekwuru gị na nwa gị n’olu dị jụụ, dị ntakịrị, n’abụghị n’olu nke egbe eluigwe.9 Ọ gwọrọ Naaman n’abụghị site “n’ụzọ dị nnukwu” mana site n’ụzọ ahụ dị mfe nke omume nsachagharị anụ ahụ.10 Ụmụ Izrel riri oriri nke nnụnnụ quail nime ọzara, mana ihe dobere ha ndụ bụ ihe ahụ dị ntakịrị ma dịkwa mfe nke akpọrọ manna—achịcha nke ụbọchị niile ha.11

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, achịcha nke ụbọchị niile ka a na-akacha akwado ma kesa n’ebe obibi. Okwukwe na ịgbaama ka a na-akacha arọpụta n’ụzọ dị mfe, otu ntabiri n’otu oge, n’oge ndị ahụ dị ntakịrị ma dịrị mfe, site n’ibi ndụ nke kwa ụbọchị.12

Oge ọbụla bụ oge nkuzi ihe. Okwu na omume ọbụla pụrụ ịbụ ihe odudu maka ime nhọrọ niile.13

Enwere ike ịnaghị ahụ mpụta ihè nke mbọ gị niile. Mana achịlịkwala aka gị elu. “Mana ihe nile garịrị emezu n’oge ha,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Ya mere, ike agwụla unu n’obi n’ime ihe ọma, n’ihi na [unu] na-atọ ntọ-ala nke oke ọrụ.”14 Kedụ ọrụ nke ka nnukwu karịa ịnyere ụmụ oke ọnụ ahịa nke Chineke aka mụta onye ha bụ n’ezie ma wulite okwukwe ha nime Jizọs Kraịst, ozi ọma Ya ma Nzukọ nsọ Ya? Jizọs Kraịst ga agọzi ma mụbaa mbọ gị niile nke n’adịgide.

Ọ N’enye Mkpughe

Ụzọ ọzọ dị ike Onyenwe anyị si akwado ndị nne na nna bụ site n’onyinye mkpughe nke onwe. Chineke nwere nnukwu mmasị ịwụpụta Mmụọ Ya iji duo ndị nne na nna.

Dịka iji obi ekpere ma n’enwe metụta nke Mmụọ, Ọ ga-adọ gị aka ntị maka ihe egwu ndị zoro ezo.15 Ọ ga ekpughere onyinye niile, ume ha niile ma nchegbu ha niile ndị zoro ezo nke ụmụ gị.16 Chineke ga enyere gị aka hụ ụmụ gị dịka O si ahụ ha—gafee otu oyiyi anụ ahụ ha dị ma baa nime obi ha niile.17

Jiri enyemaka nke Chineke, unu ga amụta ka esi amata ụmụ unu n’ụzọ n’enweghi ntupọ ma n’ụzọ nke eluigwe. A na m akpoku gị ka ịnabata enyemaka Chineke nyere n’aka idu ezinụlọ gị site na mkpughe nke onwe. Chọọ odudu Ya nime ekpere gị niile.18

Nnukwu Mgbanwe

Eleghi anya enyemaka kachasị mkpa nke Jizọs Kraịst n’enye ndị nne na nna bụ “nnukwu mgbanwe” nke obi.19 Ọ bụ ọrụ ebube nke ọnye ọbụla nime anyị chọsịrị ike.

Maka ntakịrị oge, chee maka ọnọdụ nke a: Ị nọ n’ebe Nzukọ nsọ, n’ege ntị nye okwuchukwu banyere ezinụlọ niile. Onye okwu okwu akọwa otu ebe obibi zuru oke nakwa otu ezinụlọ nke kadị zuo oke karịa. Dị na nwunye esebeghị okwu mbụ mọlị. Ụmụaka n’akwụsị ịgụ akwụkwọ nsọ ha naanị mgbe ọ bụ oge imee ọrụlọ ha. Ma egwu nke a “Hụ Onwe unu Naanya”20 n’akpọ n’azụ. Tupu onye okwu okwu eruo n’oge ahụ n’ekwu mgbe onye ọbụla jiiri obi ụtọ sonye n’ịhicha ọnụlọ nsacha ahụ, ibidoworị chewe na, “ezinụlọ nke m enweghi olileanya.”

Ezi ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị, zuo ike! Onye ọbụla nọ nime igwè mmadụ a n’eche otu ihe ahụ! Eziokwu bụ, ndị nne na nna niile n’echegbu onwe ha na ha adịghị mma zuru oke.

Ekeledịrị, enwere isi iyi dị nsọ nke enyemaka maka ndị nne na nna: Ọ bụ Jizọs Kraịst. Ọ bụ isi iyi nke nnukwu mgbanwe obi anyị.

Dịka ị na-emeghe obi gị nye Onye Nzọpụta na nkụzi Ya niile, Ọ ga egosi gị adịghị ike gị. Ọ bụrụ na ijiri obi umela tụkwasị obi n’ebe Kraịst nọ, Ọ ga eme ka adịghịike ndị ahụ sie ike.21 Ọ bụ Chineke ọrụ ebube niile.

Ọ pụtara na gị na ezi na ụlọ gị ga-etozuoke kpam kpam? Mba. Mana unu g’adị mma karịa. Site n’amara Onye Nzọpụta, ntakịrị n’elụ ntakịrị, unu ga ewulite ọfụma agwa ndịa ndị nne na nna chọsịrị ike: ịhụ Chineke na ụmụ Ya naanya, ndidi, echelanaanị onwe, okwukwe nime Kraịst, ma ume eji eme nhọrọ nwere ezi omume.

Jizọs Kraịst N’enye Nkwado site na Nzukọ nsọ Ya

Mgbalị anyị ọbụla iji wulite okwukwe nime Jizọs Kraịst bụ nke a n’eme n’ebe obibi, nke lekwasịrị anya na mmadụ ahụ. Ma ọ bụ nke Nzukọ nsọ na-akwado. Tinyekwara irọpụta akwụkwọ nsọ niile ma okwu niile nke ndị amụma, Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta n’enye ọtụtụ akụrụngwa maka ịnyere ndị nne na nna na ụmụaka aka mee ezi nhọrọ:

Foto, oyiyi
Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Ihe odudu maka Ime Nhọrọ niile
  • Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Ihe odudu maka Ime Nhọrọ niile anaghị enye unu ndekọihe nke meenụ ndịa mọbụ emela ndịa. Ọ na-akuzi eziokwu ebighị ebi maka ịnye aka mee nhọrọ niile edobere n’elu ndụ na nkụzi niile nke Jizọs Kraịst. Gụọ ya gị na ụmụaka gị. Ka ha kwuo okwu maka ya. Nyere ha aka ka eziokwu ndịa dị ebube ma dịrịkwa nsọ duo nhọrọ ha.22

  • Ọgbakọ FSY bụ akụrụngwa ọma ọzọ. Enwere m olile anya na onye ntorobịa ọbụla ga aga. A na m akpoku ndị okenye nta niile na anọghi n’ọlụlụ ka ha sonye ọgbakọ ndịa dịka ndị nkuzi ma ndị ndụmọdụ. A na m akpọku ndị nne na nna ka ha wulite ike n’abịa abịa nke ndị ntorobịa ha ga eweta site n’ọgbakọ niile nke FSY.

  • Ụmụaka na ntorobịa nime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu nwere ndị nkụzi na ndị ndụmọdụ na ndị nlereanya. Mgbe na mgbe ị na abata nime ndụ nke otu onye nta n’oge pụrụiche maka iwulite na ikwado okwukwe na ama. Ụfọdụ nime unu bụ ndị okenye na anọghi n’ọlụlụ. Ụfọdụ amụbeghi ụmụ nke onwe ha mọlị. Ije ozi unu eji obi ụtọ jee maka ụmụ nke Chineke dị nsọ n’anya Chineke.23

Achilikwala aka elu maka Ọrụ ebube

Ezi ndị enyi m, ezi ndị ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, iwulite okwukwe nime otu nwata dị nnọ ka ịnyere otu okokosisi tolite. Ị gaghị adọ ya adọ ka o too ogologo. Ị gaghị agbawa mkpụrụ ya ka ifiri ya pụta n’oge. Ma ị gaghị ewepu obi na okokosisi ahụ ma chọọ ka ọ tolite ma pụpụta mma ya n’otu aka ahụ.

Ihe unu nwere ike ma kwesịkwa ịmee n’isi ndudugandu ahụ na-etolite etolite bụ irọpụtara ha ala n’eme nri, nke mmiri eluigwe n’asọbata nime ya. Fopụ ahịahịa na ihe ndị ọzọ ga-egbochi ihè anyanwụ nke eluigwe. Rọpụta ọnọdụ kachasị mma maka otuto. Jiri ndidi hapụ ndị ndudugandu ahụ na-etolite etolite ka ha mee nhọrọ mmụọ kwalitere, ma ka Chineke rụọ ọrụ ebube Ya. Ihe ga-apụta na ya ga ama mma karịa ma chapụ achapụ karịa ma nwee ọńụ karịa ihe ọbụla ịnwere ike rụpụtanwu n’aka gị.

Nime atụmatụ nke Nna nke Eluigwe, njikọrịta niile nke ezinụlọ kwesịrị ịdị ebighị ebi. Ọ bụ nke a kpatara, dịke onye nne na nna, ịkwesịghị ịchila aka gị elu, ọbụnagọdị na ịnweghi mmasị maka otu ihe si mee n’oge gara aga.

Nihi Jizọs Kraịst, Onye Nnaukwu Ọgwọ ọrịa na Onye Nzọpụta, aga enwerịrị mbido ọhụrụ mgbe niile; Ọ n’enye olile anya mgbe niile.

Jizọs Kraịst bụ ume nke ndi ezinụlọ.

Jizọs Kraịst bụ ume nke di ntorobịa.

Jizọs Kraịst bụ ume nke ndi nne na nna.

Nke a ka m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. “Ihe dị n’obi onye nne na nna ọbụla bụ ọchịchọ ha ịkụziri ụmụaka ha agwa eziomume niile. Nke a bụ otu akụkụ nke ọrụ ebube dị nime atụmatụ nke Nna nke Eluigwe. Ọ chọrọ ka ụmụ Ya bịa n’ụwa, isoro ụdị usoro ebighị ebi ahụ nke ezinụlọ ndị ahụ dị adị n’eluigwe. Ezinụlọ bụ isi ntoala nke ebe niile nke ebighị ebi, ma otu ahụ ka Ọ chọrọ maka ha ịbụkwa isi ntọala n’elu ụwa. Nagbanyeghi na ezinụlọ nke ụwa ezughi oke sam sam, ha n’enye ụmụ Chineke ọnọdụ kachasị mma iji nabata ha n’ụwa jiri ịhụnaanya ahụ dị n’ụwa naanị ya yiri nke a n’enweta n’eluigwe—ịhụnaanya nke nne na nna. Ezinụlọ bụ ụzọ kachasị mma eji echekwa ma nyefee agwa eziomume na ezi ụkpụrụ nke kachasị nwee ike idughachi anyị azụ nihu Chineke” (Henry B. Eyring, “Mkpọkọta Ezinụlọ Chineke,” LiahonaMay 2017, 20).

  2. Ma n’ezie, anyị maara na uche Chineke abụghị nke a na-emezukarị “n’ụwa, dịka esi eme ya n’eluigwe” (Matiu 6:10). Agaghị eji ịbụ nne na nna nke ndụ anụ ahụ atụnyere nke Chineke. Ọ na-ahụ nke ahụ n’ezia . Ọ ga na-akwakarị arịrị maka mwute niile na obi mgbawa nille dị nime njikọta niile nke ezinụlọ. Kọsiladị, Ọ chilibeli aka ya elu n’ebe ezinụlọ nọ. Ma Ọ gaghị eme otu a, nihi Chineke nwere atụmatụ dị ebube maka ebe nketa ebighị ebi nke ụmụ Ya. Ezinụlọ nọ n’etiti atụmatụ ahụ.

  3. Lee Matiu 18:1–5; Mosaia 3:19.

  4. Ezi na Ụlọ: Nkwupụta Nye Ụwa,” ChurchofJesusChrist.org: lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25–28.

  5. Lee “Mmụta ihe N’ebe obibi Dabere n’elu Njikọta niile,” Ikụzi N’ụzọ nke Onye Nzọpụta: Maka Ndị niile N’akụzi ihe N’ebe obibi ma nime Nzukọ nsọ (2022), 30–31; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:8.

  6. Moronaị 7:48.

  7. 1 Nefi 16:29; lee kwa Alma 37:6–7.

  8. Lee “Mmụta ihe N’ebe obibi Gụnyere Mgbalị niile dị Ntakịrị, Mfe, Nadịgide,” Ikụzi N’ụzọ nke Onye Nzọpụta, 31. Onyeisi David O. McKay kụziri: “K’anyị ghara ịche na, nihi ụfọdị [ihe] … dị ha ka ha dị ntakịrị ma dịrị ka ha enweghi isi, [na] ha adịghịzi mkpa. Mgbe emesiri ihe niile, ọ bụ ihe ntakịrị mejupụtara ndụ nke a. Ndụ anyị, ịdị adị anyị nke anụ arụ ka obi n’akụ ntakịrị ntakịrị mejupụtara. Ka obi ahụ n’akụ ntakịrị ntakịrị kwụsigodi, ma ndụ nime ụwa nke a akwụsị. Anyanwụ bụ nnukwu ikike dị nime mbara eluigwe niile, mana anyị na anata ngọzị niile nke ụzarị [ya] nihi ha na abịarute anyị dịka ntakịrị ụzarị, nke, mgbe ha bịakọtara ọnụ n’eji ihè nke anyanwụ jupụta ụwa niile. Ọchịchịrị nke abalị na ama mma nihi mgbuke nke ihe dịka ntakịrị ntakịrị kpakpando niile; ma nihi nke a ezi ndụ nke N’esoKraịst bụ nke jupụtara na ntakịrị agwa ndị yiri-Kraịst nke emere na awa nke a, na nkeji nke a—n’ebe obibi” (Nkụzi niile nke Onyeisi nke Nzukọ nsọ: David O. McKay [2003], 219).

  9. Lee Helaman 5:30.

  10. Lee 2 Ndị Eze 5:9–14.

  11. Lee Ọpụpụ 16.

  12. Lee “Ịkwadobe Ụmụ Unu Maka ibi Ogologo ndụ N’ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke,” Bịa, Soro M—Maka ndị Mmadụ na Ezinụlọ niile: Agba Ọhụrụ 2023, mgbakwụnye (naanị nke digitalụ).

  13. Lee “Mmụta ihe N’ebe obibi Nwere ike bụrụ nke Ahaziri ahazị mọbụkwanụ bịa na Mmanye,” Ikụzi N’ụzọ nke Onye Nzọpụta31; 1 Pita 3:15.

  14. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:32–33.

  15. Lee Matiu 2:13.

  16. Lee Alma 40:1; 41:1; 42:1.

  17. Lee 1 Samuel 16:7.

  18. Lee 1 Nefi 15:8.

  19. Alma 5:13.

  20. Lee “Hụkọrịta Onwe unu Naanya,” Abụ,, no. 308.

  21. Lee Ita 12:27.

  22. “N’okwu ahụ metụtara ụmụaka, ọ bụ oke n’ọrụ ndị nne na nna inye ha odudu agwa eziomume. Ha maara echiche, nghọta na akọnuche nwa ọbụla. Ndị nne na nna n’eji ogologo ndụ ha niile n’achọ otu ha si ehiwe ma chekwa ezi mkparịta ụka n’etiti ha na ụmụ ha ọbụla. Ha nọ ọnọdụ kachasị mma maka ịhọrọ ezi agwa ahụ kachasị mkpa banyere ọdịmma na ahụịke nke ụmụ ha” (James E. Faust, “The Weightier Matters of the Law: Judgment, Mercy, and Faith,” EnsignNov. 1997, 54).

  23. Akụrụngwa abụọ ndị ọzọ ekwesịrị ịkpọ aha bụ: Mmepụta nke dijitaịlụ Bịa, Soro M nke afọ a bụ akụrụngwa gụnyere otu nkeji ọhụrụ akpọrọ “Ịkwadobe Ụmụ Unu Maka ibi Ogologo ndụ N’ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke.” Ọ na-atụpụta echiche ndị dị mfe, nke n’eme n’ebe obibi maka ịnyere ụmụaka aka kwadobe maka baptizim na ọgbụgba ndụ na emume nsọ ndị ọzọ. Ma Ịkụzi N’ụzọ nke Onye Nzọpụta nke a atulegharịrị ọhụrụ nwere otu nkeji akpọrọ “Ebe Obibi na Ezinụlọ” nke n’akọwa otu esi etinye ụkpụrụ niile nke nkụzi yiri-Kraịst n’ebe obibi (lee ihu akwụkwọ ndịa 30–31).

Bipụta