Ọgbakọ Zuru ọha
Onyenwe anyị Jizọs Kraịst N’akụziri Anyị otu esi Eje Ozi nlekọta
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Onyenwe anyị Jizọs Kraịst N’akụziri Anyị otu esi Eje Ozi nlekọta

Jiri enyemaka nke Onye Nzọpụta, anyị nwere ike ịhụ atụrụ ya ndị dị oke ọnụ ahịa naanya ma jeere ha ozi nlekọta dịka Ọ naara ị mee.

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst kwuru:

“Abụ m ezigbo onye ọzụzụ aturu ahụ: ma ezigbo onye ọzụzụ aturu ahụ n’enyefe ndụ ya maka aturu ahụ. …

“Dịka otu Nna maara m, ọbụna otu ahụ ka m si makwara Nna: ma atọgbọrọ m ndụ m maka atụrụ ahụ.”1

N’ime ntụgharị asụsụ Grik nke akwụkwọ nsọ nke a, mkpụrụokwu maka ezigbo pụtakwara “ịma mma, ịmagbu onwe ya na mma.” N’ihi nke a taa, Ọ ga-amasị m ikwu okwu banyere Ezigbo Onye ọzụzụ atụrụ, Onye ọzụzụ atụrụ Ọma, Onye ọzụzụ atụrụ Magburu onwe ya na mma, ọbụna Jizọs Kraịst.

N’ime Agba Ọhụrụ, akpọrọ Ya “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ,”2 Onyeisi ọzụzụ atụrụ”3 ma “Onye ọzụzụ atụrụ na Bishọp nke mkpụrụ obi [anyị].”4

N’ime Agba Ochie, Aịzaya dere na “ọ ga-azụ igwè atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.”5

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, akpọrọ Ya “ezigbo onye ọzụzụ atụrụ”6 ma “nnukwu na ezi onye ọzụzụ atụrụ,”7

N’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, O kwupụtara, “Ya mere, a nọ m n’etiti unu, ma a bụ m ezigbo onye ozuzu atụrụ ahụ.”8

N’oge ụbọchị anyị, Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo: “Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ ahụ jiri ịhụnaanya n’elekọta atụrụ niile nke nọ nime igwè Ya, ma anyị bụ ezi ndị enyemaka ọzụzụ atụrụ Ya. Ohere anyị nwere bụ i bu ịhụnaanya Ya ma gbakwụnye ịhụnaanya nke anyị nye ndị enyi ma ndị agbatobi—ịnye ihe oriri, ilekọta, ma inye ha ọzụzụ—dịka otu onye Nzọpụta ga-achọ k’anyị mee.”9

Na nso nso a, Onyeisi Nelson ekwuwo: “Akara ngosi nke ezi Nzukọ nsọ dị ndụ nke Onyenwe anyị mgbe niile ga-abụ mgbalị ahaziri ahazi, eduziri iji jeere ụmụ Chineke na ndị ezi na ụlọ ha ozi n’otu n’otu. N’ihi na ọ bụ Nzukọ nsọ Ya, anyị onwe anyị dịka ndị odibo Ya ga-ejere onye ahụ ozi, dị nnọọ ka O si mee. Anyị g’eje ozi nlekọta n’aha Ya, jiri ike na ikikere Ya, ma jiri ịhụnaanya di ebere nke Ya.”10

Mgbe ndị Farisiis na ndị ode akwụkwọ tamụrụ megide Onyenwe anyị, “n’asị, nwoke nke a na anabata ndị mmehie, ma na-erikọta nri ya na ha,”11 Ọ zaghachiri site n’ịtụpụta akụkọ ọma atọ nke anyị mara dịka ụkụbụilu nke atụrụ ahụ furu efu, ụkabụilu nke mkpụrụ ego ahụ furu efu, ma ụkabụilu nke nwa mmefụ ahụ.

Ọ bụ ihe mmasị ịhụta na mgbe Luk, Onye odee Ozi ọma, na-edubata akụkụ atọ ndịa, o jiri okwu nke a ụkabụilu dịka esi ekwu ya n’otu, n’abụghị n’ọtụtụ.12 Ọ dị nnọọ ka Onyenwe anyị ọ na-akụzi otu nkuzi pụrụiche jiri akụkọ atọ—akụkọ ndị gopụtara nọmba dị iche iche: atụrụ 100, mkpụrụ ego 10 na ụmụ ndị nwoke dị 2.

Nọmba nke dị oke mkpa nime akụkọ ọbụla na ndịa, otuosiladị, bụ nọmba nke mbụ. Ma nkuzi nke anyị nwere ike i were site na nọmba ahụ bụ na ịnwere ike ị bụ onye enyemaka ọzụzụ atụrụ maka ndị okenye ma ndị ekwesịrị ichi okenye nime kworum ndị okenye gị ruru 100, mọbụ onye ndụmọdụ nye ndịiyom nta dị 10, mọbụ otu onye nkuzi nye ụmụaka Praịmarị dị 2, mana gị mgbe niile, mgbe niile ga-ejere ha ozi nlekọta, lekọta ha, ma hụ ha naanya, n’otu n’otu. Ị g’aghị ekwu mọlị, “Kedụ ụdị atụrụ nzuzu ọ bụ” mọbụ “Mgbe emesiworo ihe nille, mkpụrụ ego ahụ abaghịrị mụ uru” mọbụ “Kedụ ụdị nwa nwoke nnụpụisi nke a bụ.” Ọ bụrụ na mụ na gị nwee n’onwe anyị “ịhụnaanya nke Kraịst n’enweghi ntụpọ,”13 anyị, dịka nwoke ahụ nọ nime akụkọ nke atụrụ ahụ furu efu, ga “ahapụ iri itolu na itolu ahụ … ma chọọ nke ahụ furu efu, tutu ruo [… tutu ruo … tutu ruo mgbe anyị] chọtara ya.”14 Mọbụ dịka nwanyị ahụ nọ nime akụkọ nke mkpụrụ ego ahụ furu efu, anyị ga amụnye ọkụ anyị, zaa ụlọ, ma jiri ịdị uchu chọọ ya [… ịdị uchu] tutu, […tutu … tutu anyị] achọta ya.”16 Ọ bụrụ n’anyị n’onwe anyị nwee “ịhụnaanya nke Kraịst n’enweghi ntụpọ,” anyị ga-esoro ọmụmatụ nke nna ahụ dị nime akụkọ nke nwa mmefu ahụ, onye mgbe nwa nwoke ahụ “ka nọ n’ebe tere anya, … hụrụ ya, ma nwee ọmịiko, ma gbaa ọsọ, ma daa n’elu olu ya, ma susuo ya ọnụ.”16

Anyị nwere ike ị hụta otu osi n’enu ọkụ ọkụ n’obi nwoke ahụ onye otu atụrụ ya fụnagharịrị ya? Mọbụ otu osi n’enu ọkụ ọkụ n’obi nwanyị ahụ onye otu mkpụrụ ego ya fụnarịrị ya? Mọbụ ụdị ịhụnanya nke n’enweghi atụ na ọmịkọ dị nime obi nke nna nwa mmefu ahụ?

Nwunye m, Maria Isabel, na mụ jere ozi Na Central America, ebe anyị bi bụ Obodo ukwu Guatemala. N’ebe ahụ, e nwere m ohere izute Julia, bụ onye otù nke Nzukọ nsọ kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ metụrụ m n’obi ị jụ ya banyere ezinụlọ ya. Nne ya nwụrụ nihi kancer n’afọ 2011. Nna ya bubụrụ onye ndu kwesịrị ntụkwasị obi na stek ya, n’eje ozi dịka onye bishọp ma dịka onye ndụmọdụ nye onyeisi stek ya ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụ ezigbote onye enyemaka ọzụzụ atụrụ nke Onyenwe anyị. Julia gwara m maka mbọ ike agwụ agwụ ọ mere iji zute, iji lekọta, ma iji jee ozi. N’ezie ọ na-aṅụrị ọṅụ n’ozi ịnye ihe oriri ma ịlekọta atụrụ dị oké ọnụ ahịa nke Onyenwe anyị. Ọ lụgharịrị nwunye ma kwụdesie ike nime Nzukọ nsọ.

Mgbe afọ ole n’ole gara, ọ gbara alụkwaghịm ma nke emezie ọ na aga Nzụkọ nsọ ọzọ naanị ya. Ọ dapụrụ n’ụzọ ma chewe n’obi ya na ụfọdụ ndị mmadụ na ekwutọ ya nihi ịgba alụkwaghịm ya ahụ. Ọ kwụsịrị ịbịa nzukọ nsọ dịka mmụọ nke adịghị mma jupụtara ya n’obi.

Julia kwuru okwu dị mma maka onye enyemaka ọzụzụ atụrụ nke a dị ịtụnaanya, onye n’arụsi ọrụ ike, dị ịhụnanya, ma bụrụ nwoke nwere ọmịko. A na m echeta ọfụma ọfụma otu mmetụta obi ịnụ ọkụ jiri bịakwute m dịka ọ na-akọwa ya. Naanị ịhe m chọrọ bụ ị meere nwoke ahụ otu ihe, nwoke onye meere ọtụtụ ihe maka ọtụtụ mmadụ kemgbe afọ niile ndị ahụ.

Ọ nyere m akara ekwentị ya ma e bidoro m kpọwa ya, n’enwe olileanya na m ga enwete ohere izute ya n’onwe m. Mgbe ọtụtụ izu ụka gafere ma ọtụtụ okpụkpọ n’ekwentị nke isi n’apụtaghị na ya, otu ụbọchị ọ mechara zaa ekwentị ahụ.

A gwara m ya na ahụwo m Julia, nwa ya nwanyị, ma akụkọ ya dọọrọ mmasị m nihi ije ozi ya, ije ozi nlekọta ya, ma ọtụ o si hụ atụrụ ndị dị oke ọnụ ahịa nke Onyenwe anyị naanya ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụghị ụdị okwu ọ chere na ọ ga-anụ. A gwara m ya na ọ masịrị m nnọ ị bịa zute ya anya na anya, ihu na ihu. Ọ jụrụ m gịnị bụ ebumnuche m mụ ji na-atụpụta ụdị nzukọ ahụ. A zara m, “Ọ masịrị m nnọọ izute nna nke mụrụ ọmalịcha nwanyị ahụ.” Ọ gbara nkịtị n’ekwentị ahụ ruo tịkọm ole n’ole—tikọm ole n’ole ahụ dịịrị m ka o ruru ebighi ebi. Naanị ihe o kwuru bụ, “Mgbe ole na ebe ole?”

N’ụbọchị m zutere ya, a akpokuru m ya ka ọ kọsatụrụ m ụfọdụ nhụmịhe ya nke izute, ije ozi nlekọta, ma ijeere atụrụ dị oke ọnụ ahịa nke Onyenwe anyị ozi. Dịka ọ n’akọgharị ụfọdụ akụkọ ndị n’emetụ obi, A hụtara m na ụda olu ya gbanworo ma udị mmụọ ahụ nke ọ nwere mmetụta ya ọtụtụ mgbe dịka onye enyemaka ọzụzụ atụrụ abịaghachi. Ugbua anya ya ejupụta n’anya mmiri. A matara m na ugbua bụ oge ziri ezi maka mụ, mana achọpụtara m na amaghị m ihe m ga-ekwu. Ekpere m ekpere nime obi m, “Nna, biko nyere m aka.”

N’otu ntabi anya, A nụrụ m onwe ka m n’ekwu, “Nwanne nwoke Florian, dịka onye odibo nke Onyenwe anyị, A na m arịọ mgbaghara maka na anyị anọnyeghiri gị oge ahụ. Biko, gbaghara anyị. Nye anyị ohere ọzọ k’anyị gosi gị n’anyị hụrụ gị naanya. N’anyị chọsiri gị ike. Ịdịrị anyị mkpa.”

N’ụbọchị Sọnde n’esochi, ọ bịaghachiri. Ọ kparịtara ogologo ụka ya na bishọp ya ma ọ bidoro kwudesie ike. Mgbe ọnwa ole ma ole gasịrị, ọ nwụrụ—mana ọ bịaghachiri. Ọ bịaghachiri. Ana m agba ama na site na enyemaka nke Onye Nzọpụta anyị, anyị nwere ike ịhụ atụrụ ya ndị dị oke ọnụ ahịa naanya ma jeere ha ozi nlekọta dịka Ọ naara ị mee. Na nihi nke a, n’ebe Obodo ukwu Guatemala Onyenwe anyị Jizọs Kraịst kpọghachiri otu nwa atụrụ dị oke ọnụ ahịa nime igwè Ya. Ma Ọ kụziiri m otu ihe banyere ije ozi nlekọta nke m n’enweghi ike ichefu. N’aha nke Ezigbo Onye ọzụzụ atụrụ, Onye ọzụzụ atụrụ Ọma, Onye ọzụzụ atụrụ Magburu onwe ya na mma, ọbụna Onyenwe anyị Jizọs Kraịst amen.

Bipụta