Ọgbakọ Zuru ọha
Ọrụ nke Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ—Otu Ụdị Ọrụ ahụ
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Ọrụ nke Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ—Otu Ụdị Ọrụ ahụ

Isi nlekwasị anya nke atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe bụ ijikọ ezi na ụlọ maka ndụ nke a na maka ebighị ebi.

Obi juputara mụ nnọọ n’ekele maka owuwu tempụl niile na-aga niihu na “ọgbọ nke ozuzu oge” nke a (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:18). Kemgbe ụbọchi isimbụ niile nke Mweghachite, Ndị nsọ kwesịrị ntụkwasị obi achụwo ọtụtụ aja iji nata emume nsọ na ọgbụgba ndụ tempụl niile. N’isote nnukwu ọmụmaatụ ha, n’afọ 1975, mgbe ọtụtụ àjà akụ na ụba iji mee njem site na Obodo ukwu Mexico gasịrị, ezi nwunye m, Evelia, na M, ebe ndị nne na nna anyị ha sonyere anyị, ka arachiri dị ka di na nwunye ebighị ebi n’ime Tempụl Mesa Arizona. Ụbọchi ahụ, dị ka ejikọrọ anyị site n’ikike nke ọkwa nchụaja n’ime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị n’ezie nwetere nhumiihe nlekiri nke eluigwe.

Ọrụ na Ebumnuche nke Tempụl niile

Nhumiihe ahụ enyewo m ohere isoro mee ihe nke ọma ugbu a otu, mgbe afọ atọ nke ọrụ ike na nnukwu àjà gasịrị, Ndị nsọ dị na Kirtlaand, Ohio, n’ikpeazụ ruzuru ọmarịcha tempụl ha n’oge udu mmiri nke 1836—nke mbụ n’ọgbọ nke a. N’ọnwa Maachị nke afọ ahụ kwa, ihe karịrị otu puku mmadụ gbakọtara n’ime tempụl na n’ụzọ mbata ya niile maka nzukọ nraranye. Onye amụma Josef Smith biliri ikpe ekpere nraranye ahụ, nke ọ nataworo site na mkpughe (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109). N’ime ya ọ kọwara ọtụtụ n’ime ngọzi niile pụrụ iche nke enyekwasịrị n’isi ndị ahụ banyere n’ime tempụl nke Onyenwe anyị na ntozu oke. Emesịa kwaya a bụọ abụ “Mmụọ nke Chineke” ma ndị otu ọgbakọ eguzoro ma tie Mkpu Hosana “jiri otu ụdị [ike ahụ na ọ] yiri … ibuli eluụlọ site na ụlọ ahụ” (Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smith [2007], 307).

Otu izu gasịrị Onye Amụma akọwaa mpụta ihé nke Onyenwe anyị n’ime tempụl, onye kwuru sị:

“N’ihi lee, a nabatawo m ụlọ nke a, ma aha nke m ga-anọ ebe a; ma aga m egosi onwe m nye ndị nke m n’ebere n’ụlọ nke a. …

“Ma ezi aha nke ụlọ nke a ga-agbasa ruo ala ndị ọzọ; ma nke a bụ mmalite nke ngọzi nke a ga-awụkwasị n’elu isi ndị nke m” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:7, 10).

Mgbe ọhụ nke a na ndị ọzọ gasịrị, Elijah onye amụma, onye akpọgara eluigwe n’edetụghị ọnwụ ire, pụtakwutere n’ihu Onye amụma Josef Smith na Oliver Cowdery ma kwuo sị:

“Lee, oge ahụ abịawo n’uju ya, nke e kwuru maka ya site n’ọnụ nke Malakaị—n’agba-ama na ya [Elaịja] [onye amụma ahụ] ka a ga-ezipụta, tutu nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu nke Onyenwe anyị abịa—

“Ịtụgharị obi niile nke ndị bụ nna nye ụmụ ha, na ndị ụmụ nye nna ha, ka ụwa niile ghara ibu ihe e jiri ọbụbụ ọnụ gburie—

“Ya mere, ọtụghe niile nke ọgbọ nke a ka e nyefere n’aka unu; na site na nke a unu ga-ama na nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu nke Onyenwe anyị dịkwa nso, ọbuna n’ọnụ ụzọ niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:14–16).

Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ

Mgbe Onyenwe anyị weghachitesịrị ọtụghe nrachi niile nye Josef Smith, ọrụ nke nzọpụta n’akụkụ abụọ nke akwa mgbochi malitere n’ọgbọ nke anyị (lee 1 Ndị Kọrịnt 15:22, 29; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:8–18).

Onyeisi Boyd K. Packer kuziri na “ihe omume ngosi nke a bụụrụ nke ụwa egeghị ntị, mana ọ ga-emetụta akaraka nke mkpụrụ obi niile onye biwooro ma ọ bụ ga-ebi n’ụwa. Ihe niile malitere ime nwayọ nwayọ. Nzukọ nsọ bịara bụrụ nzukọ nsọ na-ewu tempụl.

“N’ime ụwa ụmụ ihe pụtara ebe ọbụla, n’ụzọ echere ịbụ na mberede, ndị mmadụ na otu niile na obodo niile nwere mmasị ịchọpụta agbụrụ niile. Nke a niile emeworịị kemgbe mpụtakwute nke Elijah n’ime Tempụl Kirtland” (Temple Nsọ [1980], 141).

“Site n’ụbọchi ahụ kpọmkwem, Eprel 3, 1836, obi nke ụmụ mmadụ malitere ịtụgharị nye ndị nna ha niile. Emesịa emume nsọ niile abụghị nke a na-ekweteghị, kama nke na-adịgide adịgide. Ike nrachi nọnyeere anyị. Ọ dịghị ikike gafere ya n’ogo. Ike ahụ na-enye ndịgide gbara ọkpụrụkpụ ma dị ebighị ebi nye emume nsọ niile eji ikike ziri ezi mee ma maka ndị dị ndụ ma maka ndị nwụrụ anwụ” (Ime Nkwadobe Ịbanye Tempụl Dị nsọ [2002], 28).

Ezi ụmụnne ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị, owuwu na ezi ojiji nke tempụl niile abụrụworịị n’ọgbọ ọbụla ihe iriba ama nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Mgbe nraranye nke Tempụl Salt Lake gasịrị n’afọ 1893, Onyeisi Wilford Woodruff gbara ndị otu Nzukọ nsọ ume ịchọpụta ndekọihe nke ndị nna nna ha ma dekọọ akụkọ agbụrụ ha ihe ga-eru ebe kwere ha omume iji nwee ike wete aha niile n’ime tempụl ma mee emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu (lee Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Wilford Woodruff [2004], 174).

Agụgụala Ezi na ụlọ na Ọrụ Tempụl—Otu Ọrụ

Otu afọ gasịrị (1894), otu Onyeisi Woodruff lekọtara okike nke Ọha Mmadụ nke Agụgụala nke Utah. Otu Narị afọ gasịrị, n’afọ 1994 Okenye Russell M. Nelson, mgbe ahụ onye otu nke Kworum Ndị Ozi Iri na Abụọ kwuru, “Ihe omume niile nke afọ ahụ pụrụ iche hiwere nchọpụta agụgụala ezi na ụlọ na ije ozi tempụl dị ka otu ọrụ n’ime Nzukọ nsọ” (“Mmụọ nke Elijah,” Ensign, Nov. 1994, 85).

Ọrụ Agụgụala Ezi na ụlọ

Ezi ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, Onyenwe anyị na-agba anyị ume dị ka ndị otu nke Nzukọ nsọ Ya iji chekwaa agụgụala ezi na ụlọ nke onwe anyị, iji mụta ihe site n’aka ndị nna nna anyị ha, na iji mee ndokwa niile dị mkpa maka ịnata emume nsọ niile nke ozi ọma nime tempụl niile iji nyere ha aka gaaniihu n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ, nke ga-eji ezi na ụlọ ebighị ebi gọzie ha. Nke ahụ bụ isi nlekwaasị anya nke atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe: na-ejikọ ezi na ụlọ maka ndụ nke a na maka ebighị ebi.

Nye ndị ahụ nime unu ndị na-echeghị na ha nwere ike ime ọrụ nke a, unu kwesịrị ịmara na ị nọghị naanị gị. Anyị niile nwere ike tụgharịa na ngwa ọrụ niile nke Nzukọ nsọ kwadobeworo na nke dị na ogige FamilySearch niile, nke anyị mabuuru dị ka ogige agụgụala ezi na ụlọ niile. Ogige FamilySearch niile ndị a ka emebeworo ka ihe ga-eru ọnye ọbụla, site na nwa obere enyem aka, nwere ike chọta ozi nke ndị nna nna ha ma hazie ya nke ọma ka ha wee nwee ike wega ya n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Biko kpọtụrụ ndị ndụmọdụ agụgụala ezi na ụlọ dị n’ime ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta, unu ndị ga-edu unu na nzọụkwụ ọbụla n’ụzọ ahụ.

Dị ka anyị na-esoro odudu nke ndị amụma ma mụọ otu esi eme agụgụala ezi na ụlọ anyị ma mee emume nsọ niile nke tempụl maka ndị nna nna anyị ha, anyị ga-enwete nhụmiihe oke ọńụ ruo na anyị agaghị achọ ịkwụsị ime ya. Mmụọ ahụ ga-ejuputa n’obi anyị, kpọtee akọ n’uche anyị ime ya, ma duo anyị dị ka anyị na-achọgharị aha niile nke ndị nna nna anyị ha. Mana ka anyị cheta na agụgụala ezi na ụlọ karịrị naanị inyocha maka aha niile, ụbọchi niile, na ebe niile. Ọ bụ ijikọta ezi na ụlọ niile na inwete mmetụta ọńụ nke na-abịa site n’isetipụrụ ha emume nsọ niile nke ozi ọma.

E nwere m ịhụnaanya n’ebe nkuzi na akpali mmụọ nke onye amụma anyị hụrụ naanya, Onyeisi Russell M. Nelson, onye sịrị na: “Tempụl dị n’etiti nke ịgba okwukwe na obisike ime mmụọ anyị ume n’ihi na Onye Nzọpụta na ozizi Ya bụ kpọmkwem obi nke tempụl. Ihe niile a n’akụzi nime tempụl, site na nkuzi ma site na mmụọ, n’eme ka nghọta anyị na Jịzọs Kraịst bawaanye. Emume nsọ Ya niile nke dị mkpa n’ekekọta anyị na ya site na ọgbụgba ndụ niile nke ọkwa nchụ aja dị nsọ. Mgbe ahụ, dị ka anyị n’edebe ọgbụgba ndụ anyị, Ọ na-enye anyị ike ọgwụgwọ, na mgbam ume Ya” (“Tempụl na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị,” Liahona, Nov. 2021, 93–94).

N’ezie n’ezie, ọrụ nke tempụl na agụgụala ezi na ụlọ bụ otu ụdị ọrụ ahụ n’ime Nzukọ nsọ.

Ana m agba ama ezi okwa ndị a. Ama m na ebe a bụ Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, onye anyị ga-echeta ma sọpụrụ n’oge Ista nke a. Ama m na Ọ hụrụ anyị naanya, ma mgbe anyị debere ọgbụgba ndụ anyị ma tinye ntụkwasị obi anyị n’ime Ya, Ọ na-enye anyị ike ọgwụgwọ na mgbam ume Ya. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta